Prof Nnenna Oti: Ihe i kwesiri ịma maka nwaanyị mbụ e mere onyeisi Mahadum 'Federal University of Technology Owerri'

Ebe foto si, Nnenna Oti-Facebook
Kemgbe ọ kpọpụchara Alex Otti nke Labour Party dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ, Abia steeti,nke afọ 2023 aha agbara nwaanyị na-akpọtụ na soshal midia dịka ọtụtụ na-eto ya maka 'ịka obi' mee ihe kwesịrị na-agbanyeghị ọkụ a chara ya.
Ọkammụta Nnenna Oti bụ onyeisi mahadum, 'Federal University of Technology Owerri'(Futo) ma bụrụkwa onye rụrụ Inec ọrụ dịka onyeisi nhazi na mkpọpụta mpụtara ntuliaka nke Abia steeti(returning officer).
Ndi ọnụ na-eru n´okwu na ọchịchị mahadum(governing council) 'Federal University of Technology'(FUTO) Owere, emeela ntuliaka tụpụtara Ọkammụta Nnenna Oti maka ọkwa onyeiei mahadum ahụ.
Oti, onye meriri na ntuliaka ahụ e mere na nsonso a ji akara 75.5 merie onye na-esote ya bụ ọkammutụta Ikechukwu, onye nwetara akara 69.7 na ntuliaka ahụ nke a dị mmadụ asaa were zọọ.
Pro-chancelor Mahadum ahụ Ọkammụta John Offem kwuru na mmadụ iri abụọ na ịdọlu debara aha ha maka ịzọ ọkwa ahụ, mana mmadụ asaa bụ ndị a họpụtara maka ịzọ ọkwa ahụ.
Oti ga-anọchie anya onye nke na apụapụ bụ ọkammụta Francis Eze.
Ihe i kwesiri ịma maka nwaanyị mbụ na-abụ onyeisi Mahadum 'Federal University of Technology'

Ebe foto si, Nnenna Oti
Odoziakụ Oti bụ nwaanyi mbụ ruru ogogo onyeisi mahadum FUTO nwere ọtụtụ nzere nakwa nturu ugo, bụ ọkammụta na ngalaba agụmakwụkwọ na-ahụ maka aja na nchekwa ogbe ọnatarachi(Soil and Environmental Science).
O nwetara nzere agụmakwụkwọ nke mbụ ya dika ọkaibe na ngalaba agụmakwụkwọ 'Soil Science' na Mahadum 'University of Nigeria Nsukka(UNN).
O nwekwara nzere nke abụọ ya na mahadum UNN.
Dika azụ eru ala na mmụta , ọ zọpụrụ njem agụmakwụkwọ n´ụlọakwụkwọ 'Catholic University Leuven', nke mba Belgium, ebe ọ nọrọ gụọ maka" irrigation engineering".Ọkammụta Oti amarala nke ekwe na-akụ na ngalaba agụmakwụkwọ,mmụta na ụkpụrụ ọchịchị ụlọakwụkwọ tinyekwara nke mba ofesi kemgbe afọ iri atọ na anọ.
O deela ihe karịrị akwụkwọ iri isi na ise, kuzie n' ọgbakọ pụrụ iche iri anọ na ọtụtụ ndị ọzọ.
A na-eto nwaanyi akịdị na nke ọ gwọrọ , ya agwọta ọzọ, ngwa lee nturugo dị iche iche e tuwere ya:
- Ọ bụrụ ọkaibe(First Class) na ụmụakwụkwọ gụchapụrụ na ngalaba agụmakwụkọ 'Soil Science' nke mahadum UNN na afọ 1982.
- Ntuweugo agụmakwụkwọ n'efu site n' aka gọmenti Imo n' afọ 1977.
- N' afọ 1986 na 1987, otu 'European Economic Community scholarship (ECC) tuwekwara ya ugo maka ịkwalite mba dị iche iche na mahadum 'Catholic University, Leuven' nke mba Belgium.
- Ọ nọchitere anya mpagara Ọwụwa-Anyanwụ n' aha Ebonyi Steeti n' ọgbakọ ukwu ọchịchị etiti e nwere na afọ 2014.
Dr Nnannaya Oti bụ di ya ebe chineke ji ụmụ atọ gozie ha.














