Israel-Gaza war: Agha a o metụtara ndị ụka Alakụba na Jerusalem?

Al-Aqsa Mosque – otu n’ime ogbe ndị kachasị nsọ n’okpukperechi Islam
Nkọwa foto, Al-Aqsa Mosque – otu n’ime ogbe ndị kachasị nsọ n’okpukperechi Islam
    • Onye dere ya, Reha Kansara
    • Ndị mere akụkọ a, WS Global religion reporter

Ndị mmadụ nọ n’ekpere n’ogbe ọwụwa anyanwụ Jerusalem ochie ndịagha weghaara, dịka a na-agafe n’ogige nnyocha ndịagha tupu o ruo n’ọnụụzọ ụlọ Ilham gbara afọ 35.

“Ị na-anụ ihe ahụ?” ka ọ jụrụ n’obiụtọ “o sitere na al-Aqsa.”

Al-Aqsa Mosque – otu n’ime ogbe ndị kachasị nsọ n’okpukperechi Islam – nọ n’ọnụụzọ ya. Ọ bụ ala nọ na nsogbu ma bụrụkwa nke a maara dịka ‘Temple Mount, ogbe kachasị nsọ n’okpukperechi ‘Judaism’.

Ọ maara uru ọ bara ibi ebe ahụ.

“Ọ bụ onyinye ime mmụọ,” ka o kwuru. “N’ihi ya, ndị ọzọ na-achọ ka ha bụrụ m. Ha na-asị m, ‘i nwere chi ọma!’”

Onye ọrụ ebere bụ otu n’ime ndị ‘Afro-Palestine’ 450 sitere n’agbụrụ Chad, Naịjirịa, Senegal nakwa Sudan, ndị bi na mpaghara obodo ochie a bụ Muslim Quarter.

Ụlọ ha bụụrụ ebe ndị Ottoman jiri mere ụlọmkpọrọ tupu mba Britain eweghara Jerusalem n’afọ 1917. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, dịka ndị ọchịchị Britain kụchara afọ n’ala na mbọ ha imemila ‘Grand Mufti of Jerusalem’ bụ Sheikh Haj Amin al-Husseini, o weere ala ahụ nye obodo ‘Afro-Palestine’ dịka ihe onyinye. Ọ bụ nwaafọ ‘Afro-Palestine’ zọrọ ndụ ‘Grand Mifti’ ma were ndụ nke ya chụọ aja.

Obodo ahụ bụ ndị biri n’ogbe ahụ ruo ihe dịka ọgbọ anọ bụ ndị a na-akpọ ndị nchekwa al-Aqsa.

N’afọ a, Ilham sịrị na enweghị ụdị ọṅụ ọ bụla ga-anọchi ịta ụta na ọnọdụ enweghị enyemaka ndị ụka Alakụba Palestine bị n’ọwụwa anyanwụ Jerusalem na-agabiga.

Ọtụtụ mmadụ gbakọtara ikpe ekpere n’ogige ha kwenyere onye amụma Mohammad siri gbagoo n’eluigwe.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ gbakọtara ikpe ekpere n’ogige ha kwenyere onye amụma Mohammad siri gbagoo n’eluigwe.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

“I nwere ike kwuo ‘emume Eid ọma, kpọkọta ezinaụlọ gị ka gị na ha nọrịa, mana gịnị bụ Eid?” ya ka ọ jụrụ dịka ọ na-achị ọchị eze. “E nweghị Ramadan ọbụla, e nweghị Eid. E nweghị ihe dị n’ọnọdụ ọ kwesịrị ị dị n’obibi ndụ anyị kwa ụbọchị. Anyị nọdụrụ ala na-eche naanị maka Gaza.”

Al-Aqsa mosque bụ nke mmadụ na-ejupụta maka ekpere Fraịde mana ndị ọchịchị mba Izrel na-enwezi obere ịbanye n’ogbe ahụ n’oge emume Ramadan n’ime afọ ndị a n’ụdị na ọ bụ maka nchekwa.

N’ime afọ a, n’ihi ọgbaaghara e nwere na Gaza, a na-atụ egwu na oke ụjọ ga-adị, ebe amakwara ọkwa na ọ bụ naanị ndị nwoke karịrị afọ 55 na ndị nwaanyị karịrị afọ 50 ka a ga-enye ohere ịbanye.

N’agbanyeghị nke a, ndị nchekwa ezipụrụ n’ama nyere ohere ka ọgbọ ndị ọbịa dị iche iche tinyere ọtụtụ mmadụ gbakọta ikpe ekpere n’ogige ha kwenyere onye amụma Mohammad siri gbagoo n’eluigwe.

Ilham n’onwe ya na-abanye na-enweghị ihe nramaahụ.

“Enweghị ihe dịka obiụtọ,” ya ka Ilham kwuru. “Anyị achọbeghị ụlọ anyị mma, anyị enweghị ndị ọbịa. Ihe fọdụrụ bụ naanị ihe mmụọ na ụmụ ngwa eji eme emume Ramadan.”