Senegal First Ladies: Lee ndị nọrọla dịka isinwaanyị mba Senegal kemgbe afọ1960

Ndịisi nwaanyị mba Afrịka

Nwunye onyeisi ala Senegal ka mgbe ha nwere onwe ha na mba 1960, bụ ndị ọtụtụ ndị mmadụ naekwu maka ha ru ta. Mana gịnị bụ ọrụ nwunye onyeisi ala?

Dịka esi ekwu, 'nwoke ike ọ bụla nwere nnukwu nwaanyị na-akwado ya na azụ. Okwu a Fabien Sullivan Grandfils kwuru, bụ nke gosi pụtara uru nwanyị bara na ndụ dị ha.

Kedụ ndị nwunye bụrụla ndịisiala Senegal?

Colette Senghor

Collette Senghor

Tupu ọ nwụ ọ na ụbọchị iri na asatọ n'onwa Novemba afọ 2019, Collette Senghor bụ nwunye nke abụọ Onyeisiala bụ Leopold Sédar Senghor ihe rụrụ afọ iri abụọ.

Ná emume akwa m ozu Collette Senghor, Onyeisiala Diouf bu onye ya na ya ruo kọrọ ọrụ, kọwara ya dịka nwaanyị pụrụ iche ụkwụ.

Ọ kwuru na ọ bụ nwunye onyeisiala nke na-enweghị atụ na mba Senegal.

Onyeisiala Macky Sall bụkwa onye kọwara Collette Sengho dịka nwaanyi na-enweghi oyiyo.

A mụrụ Collette Senghor na ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Novemba 1925 n'obodo Mouzay.

Onyeisiala Senghor lụrụ Ginette Eboué nwa gọvanọ obodo Chad Felix Eboué.

Ha mụtara ụmụ abụọ Francis-Arfang na Guy Senghor tupu ha alụmdi ha kee wa n'afọ 1955.

Collette Sengho lụrụ di ya onye bụ onye nnọchiteanya na Senegal na ụbọchị iri na asatọ na ọnwa octoba 1957.

N'afọ 1958, ha mụrụ ofu nwa ha Philippe Maguilen bụ onye nwụrụ na ihe mberede okporo ụzọ na ụbọchị isii nke ọnwa jun 1981.

Onyeisi ala Senghor bụ onye kwupụtara ma deekwa Akwụkwọ poem ma kọwa nwunye ya dịka ezigbo onye nkwado.

Mgbe onyeisiala Senghor nwụrụ n'afọ 2001, Collette Sengho gbara mbọ ihu na ihe eji mara dị ya dị na Salle Djilor nke dị na espace Senghor n'verson.

Elisabeth Diouf

Elisabeth Diouf

Ọ lụrụ Onyeisi ala Abdou Diouf n'afọ 1963.

Ọ mụrụ ya ụmụ anọ; Pedro, Habib, Fabien e na Yacine.

Elizabeth Diouf si na mba Lebanọn.

Ọ bụ ezigbo onye okwukwe na catoli ma bụrụkwa onye nwetara ezigbo mmekọ n'etiti ndị ụka na ndị Muslim mgbe dị ya bụ onyeisi ala.

Dịka nwunye onyeisiala nke abụọ na Senegal, Elizabeth mepụtara ọtụtụ ihe, nyere ndị obodo Senegal aka site n' ọrụ ebere.

Ihe ndị a gụnyere ime ka ezigbo mmiri ọṅụṅụ dịrị ndị obodo Senegal na kwa inyere ndị ụlọ ụgbọ aka.

Ọtụtụ ndị ụlọ ụgbọ nwetere ọtụtụ mkpụrụ grain sitere n'aka 'Solidarité-Partage Foundation' Elisabeth bidoro.

Elisabeth na Onyeisiala Diouf bụ ndị a na-akpo 'Mazi Drill na Oriaku Mill'.

Viviane Wade

Viviane Wade

A mụrụ ya na ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Septemba afọ1932 na mba Besancon dị n'obodo Fransi.

Ọ bụrụ nwunye onyeisiala nke atọ na Senegal n'afọ 2000.

Viviane na Onyeisiala Wade matara n'afọ 1952 na mahadum.

Ha lụrụ n'afọ 1963. Ha mụrụ ụmụ abụọ: Karim n'afọ 1968 na Sindiély n'afọ 1972.

Dika ndị bụ ya ụzọ, Viviane kwadoro di ya site na mgbakọ ya a kpọrọ, 'Education-Santé Association'.

Ọ bụ ya kwadoro ụlọọgwụ dị na Nénéficha dị n'obodo Kédougou.

E mepere Ụlọọgwụ a nke ọnụ ego ya bụ nde narị abụọ CFA n'abalị isii nke ọnwa Novemba 2002.

Ọtụtụ ihe dị na ya gụnyere theater, ebe ana mu nwa, ebe obibi ndị ọrụ ike.

Ụlọ ọgwụ bụ nke mee chere mechie na abalị iri atọ n'ọnwa June 2013.

Otu ụlọọrụ ya abụghị nke gọọmentị nyere aka emepe ya ozo n'afọ 2014.

Viviane Wade bụ onye nwe pụtara obi ya ime ka enwe ezigbo mmepe n'ogige ọwụwa anyanwụ obodo Senegal.

Marieme Faye Sall

Marieme Faye Sall
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Marieme Faye Sall bụ onye a mụrụ na Saint-louis n'abalị abụọ ọnwa Eprelụ afọ 2012.

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'Cheik Anta Diop' dị na isiobodo Senegal bụ Dakar ebe ọ guru maka Akụrụngwa electric mana o nweteghi asambodo.

Marieme lụrụ Macky Sall n'afọ 1992 na Lycée.

Ọmụmụ nwa ha kwụsịrị Marieme ije akwụkwọ.

Ọ rụrụ ọrụ dịka ezigbo onye ndụmọdụ nye dị ya na ntụli aka nke n'afọ 2012.

O mepere ụlọọrụ ebere 'Servir Le Sénégal Foundation' iji wee kwado di ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ enwetala enyemaka dị iche iche site n'ọrụ ụlọrụ ahụ.

Ọrụ ya bụ nke na ada ụda karị nwunye ndị ọzọ na mba Senegal.

O nyere aka tinye nwanne ya nwoke n'ọrụ gọọmenti.

Marieme mechiri 'Servir Le Sénégal Foundation' dịka di ya n'akwado ịhapụ ọkwa onye isi ala, mana ọtụtụ ndị mmadụ anabataghị ya.

Nke bụ eziokwu bụ na nwunye onyeisi ala obodo Senegal ọbụla, bụ ndị mepụtara ọtụtụ ihe ma mmetụta ndụ ndị obodo Senegal n'uzo dị iche iche.

Ugbua, obodo Senegal n'akwado ịnabata Bassirou Diomaye Faye dị ka onyeisi ala mbụ lụrụ nwaanyị abụọ.

Faye tụrụ ugo na ntụli aka emere na ụbọchị iri abụọ na anọ n'ọnwa Maach 2014.