Ndị uweojii achụọla onye uweojii a sị gbagburu Emmanuel Okocha

Emmanuel Noko na onye uweojii a sị gbara ya egbe

Ebe foto si, Noko Family/Abia state Police

Ndịuweojii Abia steeti ekwuola na ha achụọla onye otu ha enyere aha ya dịka Obagi Njok maka ebubo ịgbagbu ojiegoachụego bụ Emmanuel Okocha.

N'ozi nke ọnụị na-ekwuru ha bụ Maureen Chinaka weputara ọ sị na nke a na-abịa dịka emechara nyocha imeụlọ banyere ihe mere.

Ozi ahụ kwukwara na enyefeela Njok n'aka ọkaiwu kachasị n'Abia steeti ka o kpee ya ikpe maka iwu ọ dara.

Ha sịkwa na ezinaụlọ Okocha nwụrụ nakwa ndị okwu a metụtara ma maka ihe mere.

Emmanuel Okocha: 'Nwunye ya nọ n'obi mgbawa ugbua' - Nwanne Emmanuel

Aha onyonyo, Emmanuel Okocha: 'Nwunye ya nọ n'obi mgbawa ugbua' - Nwanne Emmanuel
Emmanuel Okocha na ụmụ ya abụọ

Ebe foto si, Supplied

Nwanne nwoke a sị onye uweojii gbara egbe akọọla arịrị ezinaụlọ ha n'ọnwụ nwanne ha nwoke bụ Emmanuel Okocha.

Jacob Okocha gwara BBC n'ekwentị na o si mba Briten gbalatawa mgbe ọ nụrụ ozi na agbara nwanne ya egbe mana ọ hụghịzi ya ndụ mgbe o rutere Naịjirịa.

Ọ sị na ajụjụ ezinaụlọ ha na-ajụ bụ "gịnị mere eji gbaa nwoke mmadụ ejighi egbe maọbụ ihe ọbụla n'aka egbe?"

Ọ sịkwa na nwunye Emmanuel nọ n'obi mgbawa maka ọnwụ di ya.

"Ọ lụrụ nwaanyị nwee ụmụ abụọ, obi agbawaala nwunye ya mana anyị na-akasi ya obi si ya nosie ike maka ụmụ ya" ka o kwuru.

Ndị uweojii sị na ha amalitela nyocha banyere ihe ahụ mere.

Ha sị na na ha anwụchiela onye otu aha ya bụ Obagi Njok maka ebubo ịgbagbu otu nwoke.

Akụkọ kwuru na onye uweojii gbagburu Emmanuel Okocha onye ojiegoachụego n'Aba ,Abia steeti mgbe ọ jụrụ inye ya ego aka azụ n'ụbọchị Wenezde.

Emmanuel Okocha NNoko

Ebe foto si, Noko Family

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ ASP Maureen Chinaka gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ezie.

O kwuru na ya bụ ọdachi mere ụbọchị wenezde 17 Eprelụ n'okporo ụzọ MCC dị n'Aba, Abia steeti.

" Nnyocha e merela gosiri na ọ bụ Corporal Obagi Njok, nke ogige ndị uweojii

Abayi Police Division dị n'Abia Steeti gbagburu Maazị Emmanuel Okocha n'okporoụzọ si Aba gawa Owere."

" A nwuchiela onye uweojii ahụ ma malite usoro ịhụ na-atara ya ahụhụ n'oge na-adịghị anya. "

N'okwu ya, onye uweojii ahụ ka a na enyocha ị maara ihe kpatara agwa ahụ.

N'ozi ya, Maureen Chinaka kwuru na ndị uweojii Abia steeti kwụrụ chịm chịm ị ji chekwaa ndụ ndị steeti.

Akụkọ anyị nwetara kwuru na Emmanuel Okocha bụ diọkpara onye a ma ama n'steeti ahụ dịka onye na-enyre ndị ogbnye aka bụ Chief Michael Noko Okocha.

Ka ọ dị ugbua, onye na-achọchite mpaghara Aba North n' Ụlọnnọchiteanya Naijria ọmeiwu bụ Alex Ikwechegh, akatọọla ogbugbu a sị e gburu Emmanuel Okocha, ma kpoo oku ka enye ezunaụlọ ya ikpenkwụmọtọ.

Ikwechegh gara n'ihu rịọ ndị bi n'Aba ka deere jụụ ghara ime ihe ọbụla nwere ikpe ibute ọgbaghara n'ihi ihe nke ahụ mere.