Ị makwa ihe kọfị na-eme n'ahụ gị?

Iko kọfị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kọfị anọọla n'omenala mmadụ kamgbe puku puru puku afọ
    • Onye dere ya, André Biernath & João da Mata
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Brasil

Site n'okporo ama New York City ruo n'akụkụ ugwu ndị Etiopia, kọfị sọ n'ihe ndị mmadu ọnụọgụgụ ha ruru nde na-aṅụ kwa ụbọchị.

Ọ gbaala mgbọrọgwụ na ndụ na omenala mmadụ ruo ọtụtụ narị afọ dịka ọtụtụ na-ekwu na ikike o nwere sitere na owuwe anya o wetara n'ọgbọ senchuri 17 na 18 bụ oge mmepeanya ọtụtụ obodo malitere.

Otu akụrụngwa dị mkpa dị n'ime kọfị bụ ihe a kpọrọ 'caffeine' bụ ihe ndị mmadu kkachasị eri n'ọgbọ oge a e kwuruna emetuta echịche.

Ebee ka kọfị si pụta?

Kọfị si na mkpụrụosisi a kpọrọ arabika nke a chọpụtara mbụ n'Etiopịa.

A na-arụpụta 90% Kọfị na mba na emepeemepe, ọkacha na Saụt Amerịka, nakwa Vietnam na Indonesia, ebe a ka eri ya na mba mepere emepe.

Akụkọ mgbe ochie na-ekwu, na narị afọ nke 9, otu onye na-azụ ewu aha ya bụ Kaldi hụrụ na ewu ya na-adị ịke ma ha tachaa mkpụrụosisi kọfị, nke a mere o ji taa ya ka ọ mara e tu ọ dị.

Kemgbe ahụ ka ọtụtụ ndị mmadụ jiri bido were mkpụrụosisi kọfị eme nri, maọbụ jiri ya mee ihe a na-aṅụaṅụ nke taa.

Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Sufis na Yemen bụ ndị mbụ na-amị mkpụrụ kọfị kemgbe narị afọ nke 14, ha ji ya na-emepụta ihe ọṅụṅụ anyị maara taa.

Ka ọ na-erule narị afọ nke15, ụlọ kọfị pụtara n'Alaeze Ukwu Ottoman, mechaa gbasaa na Yurope ebe ha ghọrọ ebe azụmahịa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na echiche ọhụrụ.

Coffee beans

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kọfị si na mkpụrụ osisi a kpọrọ 'Coffea arabica' nke a chọtara na Etiopia

Ụfọdụ ndị ọkammụta, dịka Jürgen Habermas, onye Jamini a ma ama bụ ọkammụta na mmekọrịta ọha na eze nke narị afọ nke 20, o kwuru na nkụzị nwereike ọ gaghị adị ma e wepu metụta kọfị.

Dị ka Habermas si kwuo, ụlọ kọfị ghọrọ "ebe a na-akatọ" n'ime narị afọ nke 17 na 18 ọ bụ ebe a na-anọ enweta echiche ọha na eze ma bụrụ ebe e si enweta amamihe.

Ndị mmadụ kwetere na ndị nkuzi mara ihe ekwe na-akụ na-akwadọ ịṅụ kọfị.

Dị ka onye edemede Amerika bụ Michael Pollan si kwuo, onye ọka ihe ọmụma nke mba Frans, bụ́ Voltaire, na-aṅụ ihe dị ka iko kọfị 72 kwa ụbọchị ebe ndị ibe ya Diderot tụkwasara ya obi ka ọ chikọta "Encyclopédie" ya dị ngalaba 28, nke a na-elekarị anya dị ka ụkpụrụ ọrụ nke ndị nkụzị.

Voltaire

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-ekwu na onye ọkà ihe ọmụma onye France bụ́ Voltaire, bụ́ onye bụ́ isi n’ nkụzị, na anụ ihe dị ka iko kọfị 72 kwa ụbọchị.

Ọkammụta banyere ọmụmụ gbasara mmadụ, Ted Fischer, na-eduzi agụmagụ banyere kọfị na 'Institute for Coffee Studies' na Mahadum Vanderbilt dị na mba Amerịka, kwuru na kọfị sokwa n'ihe mere atụmatụ ikekete o rie 'capitalism' si guzoro.

Ọ gwara BBC, sị: "Kọfị gbanwere agụmagụ ọdịnala ma kwalite echiche ndị butere nkụzị na akụnụba ikekete o rie.

'O yighị m ka ọ bụ ihe mberede nkịtị na echiche banyere ọchịchị onye kwuo uche ya, ezi uche, sayensị na ikekete ego bịara n'oge ọha matara ma malite ịṅụ Kọfị nke ọma. Ihe a, nke na-agbasawanye nghọta na itinye uche, bụ n'ezie akụkụ nke ihe ndị gbara ya gburugburu".

N'oge ahụ, ndị ọchụnta ego ghọtara na e nwereike iji kọfị mee ihe iji kwalite mmepụta ihe, Fischer kwukwara, n'ihi ya, ha malitere inye ndị ọrụ ha kọfị ma nwere ya na ezụịke.

Ihe ọjọọ gbasara kọfị

Akụkọ gbasara etu kọfị siri malite nweree akụkụ ọjọọ sokwa ya maka na o soro n'ihe kwalitere mkpagbu a kpagburu ndị ohu.

Ndị Frans jiri ndị ohu si Africa na-arụ ọrụ n'ugbo ha dị na Haiti ma n'afọ1800, Brazil ejirila ndị ohu si Afrịka na-emepụta oke atọ kọfị a na-aṅụ n'ụwa niile.

Taa, kọfị bụ isi ngụgụu nke ọdịbendị zuru ụwa ọnụ, ebe a na-aṅụ ihe karịrị ijeri iko abụọ n'ụwa niile kwa ụbọchị, na enweta ịhe dịka $ 90bn kwa afọ.

Agbanyeghị nke a, "ihe agbanwebeghi" n'ime afọ 600 garaaga, dịka ụlọ ọrụ 'Heifer International' bụ ndị na-arụ ọrụ ikpochapụ ụbịam na agụụ n'ụwa si kwuo.

Ọ na-ekwu na ndị isi ojii ka bụkwa ịsị sekpụntị na'ọrụ imepụta kọfị, na-arụ ọrụ a na akwụ ha obere ego. N'ime mba 50, nde mmadụ 125 na-adabere n'ọrụ kọfị maka ibi ndụ, ebe ihe karịrị ọkara n'ime ha nọ n'ụbịam.

Kedu ka kọfị si emetụta ahụ mmadu?

Caffeine banye 'ahụ mmadụ site n'ọnụ, ọ ga-eme njem banye site n'ụzọ ngweri nri mmadụ, banyezie n'ịme ọbara site n'eriri afọ.

Mana ọ na-amalite imetụta mmadụ oge o ruru n'akwara.

Nke a bụ n'ihi myiri ya na kemịkalụ a na-akpọ 'adenosine', bụ kemikaalụ ahụ mmadu na-emepụta. 'Adenosine' na-eme ka ahụ jụọ mmadụ oyii ma na-ebelata etu obi mmadụ si akụ ma na-akpalite ụra na ezumike.

Caffeine na-ejikọta ndị na-anabata adenosine nke dị n'elu sel irighiri akwara, dị ka igodo dabara na mkpọchi. Mana site n'igbochi ndị nnabata ndị a, ọ na-emezi ihe dị iche.

O nwere ike ime ka ọbara gbalie elu, kpalie ọrụ ụbụrụ, belata agụụ ma kwalite omumuanya, na itinye uche ogologo oge.

Cup of coffee

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E kwuru na naanị milimita 400 bụ caffeine onye toro eto kwesiri iri kwa ụbọchị nke bụ iko kọfị anọ maọbụ ise
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mmetụta Caffeine na-agbatịkwa na nkwalite ọnọdụ uche, mbelata ike ọgwụgwụ, yana ịrụ ọrụ anụ ahụ ka mma na mgbe ụfọdụ ndị na-eme egwuregwu na-eji ya dị ka mgbakwunye.

Mmetụta ndị a nwere ike ịdị n'etiti nkeji iri na ise na awa abụọ. Ahụ na-ewepụ caffeine ise ruo 10 awa mgbe erichara ya mana mmetụta ya nwere ike ịdịru ogologo oge.

Iji bulie uru caffeine, ndị ọkachamara na-adụ ọdụ ka ị na-eri ya nke ọma ma zere inụ ya n'ehihie iji chekwaa mmetụta ya mgbe ị nwere iko kọfị mbụ gị n'ụtụtụ echi.

Ntuziaka gọsịrị na ọdị mma mmadu ịrị caffeine kwa ụbọchị nke rụrụ 400m maka ndị okenye. Ha ga enwe ahụ ike, ihe dịka iko kọfị anọ ma ọ bụ ise ga adị mma.

Ọ bụ ezie na etu ahụ ụfọdụ sịri anabata ya adịgasị iche-iche, ịrịfe ya oke a nwere ike ibute nsonaazụ dịka ịra ụra na ehịhe, nchekasị, tachycardia, ahụ erughị ala afọ, ọgbụgbọ na isi ọwụwa.

Ndị ọkachamara sitere na nchịkwa nri na ọgwụ ọjọọ nke America na-adọ aka ná ntị na mmetụta ndị na-egbu egbu, dị ka ọdịdọ, nwere ike ime site na iji ngwa ngwa nke 1,200 milligrams nke caffeine - ihe dị ka iko kọfị 12.

N'agbanyeghị nke ahụ, ịṅụbiga mmanya ókè, a na-eche na kọfị na-enye uru ahụike nwere ike ime ma jikọta ya na mbelata ihe ize ndụ nke ọnwụ na ọtụtụ ọrịa, dị ka Dr Mattias Henn si Harvard TH. Ụlọ akwụkwọ Chan nke Ahụike Ọha.

Ọ gwara BBC: "Ịṅụ ihe dị n'agbata iko abụọ na ise kwa ụbọchị metụtara mbelata ihe ize ndụ nke ịnwụ anwụ, kamakwa nke ọrịa shuga, ọrịa obi na akwara, na ụfọdụ ụdị ọrịa kansa."

Ya mere, oge ọzọ ị na-eburu kọfị, ị nwere ike iche echiche banyere akụkọ ihe mere eme niile kengbe o bidoro.

Ozi ndị ọzọ Luis Barrucho