Ihe ga-ebelata oke agụụ na Naịjirịa - Ọkammụta

Ndị nọ n'ahịa dị n'Enugwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọkammụta Desmond Okechukwu Echeta ekwuola na e nwere ihe ga-eme ka agụụ belata ma budata oke ọnụ ahịa ihe oriri na Naịjirịa.

Desmond Echeta bụ onye nkuzi na Mahadum na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Ohaji, Egbema, Imo steeti ma bụrụkwa ọkammụta n'ihe gbasara akụnụụba, kwuru na naanị ihe ga-eme ka akụnaụba Naịjirịa dị mma ugbua bụ ọ bụrụ na gọọmenti beleta oke agụụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa etu gọọmenti ga-esi belata oke agụụ site n'ime ka nrị dị.

N'okwu ya “Gọọmentị etiti kwesiri imepe okeala Naịjirịa mee ka nrị na-abata, ma mee ka ndị na-azụahia na-ebubata nrị na akwụghị ụgwọ ụtụịsị”.

“Ọ bụrụ na gọọmentị adịghị ana ụtụịsị n’ihe si mba ofesi bata Naịjirịa, nke a ga-eme ka ọnụ ahịa ya dị ọnụ ala”, ka ọ gbakwụnyere.

Gịnị ka ụmụ Naịjirịa chọrọ oge ha na-aga ahịa?

Ngwa nri ka na-arị elu n'ọnụahịa

Ebe foto si, Getty Images

Echeta kwuru na ihe ndị mmadụ chọrọ oge ha na-aga ahịa bụ ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị ọnụala maka na dọla na-ada ebe naịra nọ mana nke ahụ agaghị eme maka na Naịjirịa enweghị ihe ha na-emeputa a na-ere n'ahịa.

“Naanị ihe anyị na-emeputa bụ mmanụ agbịdị. Ọzọ bụ na mmanụ agbịdị ahụ abụghị Naịjirịa na-ekwu ego ole a ga-ere ya”.

“Lee anya, ndị Naịjirịa nọ n'ugwu dị ka Zamfara steetị na ndị ọzọ anaghị aga ugbo maka na nchekwa adịghị. Ị mara na ọtụtụ ihe oriri a na-eri na ndịda Naịjirịa bụ n'ugwu ka a na-akọpụta ha?"

“Jịrị uche gị tule na ọ bụrụ na gọọmentị e mee ka ọsịkapa, garị, ọka na nrị dị icheiche dị n'ime ahịa, nke a ga-eme ka ọnụahịa ihe oriri daa ozugbo-ozugbo. Anyị enweghị ihe oriri ndị a n'ahịa, nke a mere na ọnụahịa ha agaghị ada, mana ọ bụrụ na nri ndị a dịrị n'ahịa, ọnụahịa ha ga-ada."

Lee ihe mere ọnụahịa ji arị elu ebe dọla na-ada

Desmond Okechukwu Echeta kwuru na ọnụahịa ihe nri agaghị ada maka na dọla na-ada ebe naịra nọ.

Ọ kọwara ihe mere ọnụahịa ka ji arị elu na-agbanyeghị na dọla na-ada mba ma nyekwa ndị nọ n'ọchịchị ndụmọdụ banyere ihe ha kwesịrị ime ka ihe dị mma.

Ihe ụlọakụ etiti mere dọla ji daa mba n'ebe naịra nọ

Dọla na-ada kemgbe izuụka ole na ole gara aga

Ebe foto si, Getty Images

Okechukwu Echeta kwuru na ihe dọla jiri daa mba ebe naịra nọ bụ maka na ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria (CBN) nyere ndị na-agbanwe ego dọla iwu ma gwa ha ego ole ha ga na-eresi ndị mmadụ dọla.

“Ha resiri ndị na-agbanwe ego dọla. E resiri onye ọbụla n'ime ha ihe ruru $10,000”.

“Ihe a bụ ego Naịjirịa dobere ka ha na-eresi ndị na-agbanwe ego.”

“Taa, juọ onwe gị ihe Naịjirịa na-emeputa. Enweghị ihe anyị na-emeputa e nwereike ịhụ n'ahịa ugbua nke mere ọnụahịa ihe niile ga-eji dị elu”

“CBN gbara mbọ nye ndị na-atu mgbere ego dọla, mee ka dọla karịa n’ime ahịa nke mere ọnụahịa dọla ji ada.”

Kepu kepu na-ekwu na ọnụ ahịa osikapa adawala
Nkọwa foto, Kepu kepu na-ekwu na ọnụahịa osikapa adawala

Desmond Echeta gara n’ihu jụọ “Mana ugbua ha mere ka dọla dị ọtụtụ n'ime ahịa, ha jikwa otu aka ahụ mee ka ngwaahịa arụpụtara na Naịjirịa karịa n’ime ahịa? Ọsịsa ya bụ mba!”

Ihe mere dọla jị ada mba mana ọnụahịa ka dị elu

Echeta gara n’ihu kọwaa ihe mere ọnụahịa agaghị nda na-agbanyeghị na dọla na-ada.

Echeta kwuru “maka na enweghị ihe gọọmenti ma ọ bụ Naịjirịa na-emepụta juru n'ahịa, nke a mere ọnụahịa ka ji na-arị elu”

“Achọghị m iwepụ n'akụkụ na e nwere ndị nwere anyaukwu na-azụ ahịa bụ ndị na-achọghị ịma na dọla na-ada."

Ihe CBN mere ka dọla daa ọ ga-adịgide?

Ngwa nri dị icheiche

“Ịnye ndị na-agbanwe ego dọla ga-eme ka ọnụahịa eji ego dọla azụ daa, mana ọ gaghị adịgịde”.

Mgbe na adịghị anya, ọnụego eji azụ dọla ga-arị elu ma ọ bụrụ na anyị ewepụtaghị usoro ga-adịgide.

“Usoro ga-adigide bụ ime ka ndị mmadụ nwee ịke ị ga n'ugbo ha kọpụta nri ebe o buru ibụ, rụọ ụzọ esi ebupụta ihe akọrọ n’ubi, ma mee ka ọkụ dị; nke a ga-eme ka ọganịihụ e nwetara ugbua dịgịde.”