Inflation in Nigeria: Onweghi ego ole ọbụla i jiri banye ahịa na-ezu ịzụta ngwa nri ugbua

Aha onyonyo, Inflation in Nigeria: O nweghi ego ole ọbụla m jiri banye ahịa na-ezu ịzụta ngwa nri ugbua
Inflation in Nigeria: Onweghi ego ole ọbụla i jiri banye ahịa na-ezu ịzụta ngwa nri ugbua

Ụfọdụ ndị na-ere ngwa nri na Naịjirịa etiela mkpu n’oke olu maka etu ọnụego ngwa nri si arị elu ugbua.

Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahụ maka ngụkọ na Naịjirịa ‘National Bureau of Statistics' kwuru ọnụahịa ihe na Naịjirịa dị pasentị iri abụọ na abụọ (22.7%) nke bụ na o ji pasentị 0.38 rịa elu site n’ọnwa Mee ruo ọnwa Juun afọ 2023.

Nke a bụ mgbali elu ọnụahịa kachasị njọ kamgbe afọ iri na asaa (17yrs) gara aga

Ọnụego ngwa nrị arịala elu ugbua

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị n’ahịa iji mara ihe bụ uche ndị na-ere ngwa nri banyere mgbali elu ọnụahịa a.

Ụfọdụ ha kọwara na ngwa nri ekwezighi nzụta ugbua maka etu ihe si kwụrụ, otu penti osikapa nọbu otu puku naịra nọzi puku naịra atọ ugbua.

Otu nwaanyị na-ere tomato kwara arịrị na o nweghizi ezigbo uru ha na-erite n’ịzụ ahịa tomato na Naịjirịa.

Nwaanyị ọzọ kwuru na o nweghi ego ole ọbụla o ji gaa ahịa ịzụta ihe nke na-ezu oke ịzụta ihe niile ị chọrọ.

Kirie ihe ha kwuru n’uju.