Gịnị ka 'State of Emergency' gọọmentị tinyere na ngalaba nkọpụta nri Naịjirịa pụtara?
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwupụtara n'ụbọchị Tọzde na o tinyela ọnọdụ gbatagbata n'ihe oriri na Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka ọnụahịa ihe oriri na-agbali elu n'ike n'ike na Naịjirịa, nakwa dịka enweghị nchekwa na-egbochi ndị ọrụ ụbị ịga n'ubi ha n'ụfọdụ ebe na mpaghara Ugwu, bụ ebe nkọpụta nri kacha na Naịjirịa.
Mana nkwupụta a na-agba ọtụtụ ndị mmadụ nkịtị gharịị ihe 'state of emergency' pụtara, maọbụ etu ọ ga-esi metụta ndụ ha.
Gịnị ka 'State of Emergency' pụtara?

Ebe foto si, AFP
'State of Emergency' bụ ọnọdụ na-egosipụta nnukwu ihe egwu, maọbụ nnukwu ihe mberede, maọbụ ọgbaaghara, nke ga-eme na ihe adịghịkwa etu ọ si adịbu.
Mana ọ bụrụ na gọọmentịt inye ọnọdụ gbatagbata n'otu ngalaba gọọmentị maọbụ nke ọzọ, ọ pụtara na ngalaba ahụ anaghị emebu ọfụma mana gọọmentị chọziri ịkpachapụrụ ngalaba ahụ anya nke ọma iji kwalite ya.
N'ọdị nso a, Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru kwuru na o tinyela ọnọdụ gbatagbata na ngalaba agụmakwụkwọ nakwa ahụike na Steeti ahụ.
Gọọmentị Taraba steeti mekwara nke a dịka Gọvanọ Agbu Kefas kwuru na ya etinyela ọnọdụ gbatagbata na ngalaba agụmakwụkwọ na steeti ahụ.
Kedụ etu ọnọdụ a ga-esi metụta ndị nkịtị na Naịjirịa?

Ebe foto si, Reuters
O dobeghị anya kpọmkwem ndịiche ọnọdụ a ga-eweta na ngalaba nkọpụta ihe oriri na Naịjirịa, mana dịka ndị ọkachamara si kwuo, ihe ndị a na-atụ anya ya gụnyere:
- Nkesa nri site n'aka gọọmentị nye ezinụlọ ndị nọ n'oke ụbịam, ọ kachasị ndị bi n'ime ime obodo.
- Nkwalite ọnọdụ nchekwa, ọ kacha na mpaghara ebe e ji nkọpụta nri mara. Iji maa atụ, Benue na Plateau steeti so na ndị kacha akọpụta ihe oriri na Naịjirịa, mana n'ọdị nso a, mwakpo ndị ọchịehi nakwa ndị ekperima ndị ọzọ emee ka ọtụtụ ndị ọrụ ugbo gbahapụ ala ubi ha dị icheiche n'ihi ụjọ ọnwụ
- Ọnụahịa nri ka nwereike ịdị elu n'ahịa, mana ọ bụrụ na atụmatụ a mịta mkpụrụ etu gọọmentị si chee, o nwereike ime ka ọnụ ahịa nri gbadatatụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo.
Kedụ etu gọọmentị ga-esi soo ọnọdụ 'state of emergency' a?

Ebe foto si, AFP
Dele Alake, bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu kọwara na etu ọnụahịa ngwa nri si agbali elu ugbua na-emetụ onyeisiala n'obi, dịka ọ ma na ihe siri ike ugbua.
N'ihi nke a, onyeisiala nyere iwu ndị a:
- Ikesa mkpụrụ ọka na nri ndị ọzọ nye ezinụlọ dị icheiche iji belata ahụhụ so mwepụ ego 'subsidy', nakwa ikesa fetịlaịza nye ndị ọrụ ubi iji kwalite nkọpụta ihe oriri.
- Ihe niile gbasara nri na mmiri ịdị n'uju, nakwa akụrụngwa niile dị mkpa e ji ebi ndụ, ga-eso n'ihe otu 'National Security Council' ga na-ahụ maka ya.
- A ga-enwe ezi mmekọrịta n'etiti Mịnịstrị na-ahụ maka mmiri na Mịnịstrị na-ahụ maka nkọpụta nri, iji hụ na ndị ọrụ ugbo na-enwe mmiri zuru oke ha ji akọpụta nri ogologo afọ niile
- A ga-ekepụta ụlọọrụ a kpọrọ 'National Commodity Board' nke ọrụ ha ga-abụ ị na-atụle ọnụahịa ngwa nri, nakwa inwe atụmatụ siri ike maka nchekwa nri. Atụmatụ a ka a ga-eji na-ejikwa mgbago nakwa mgbatu ọnụ ahịa ihe oriri na Naịjirịa
- Ịkwalite ọnọdụ nchekwa Naịjirịa iji hụ na ndị na-arụ ọrụ ubi nwere nchekwa zuru oke iji laghachi n'ubi ha dị icheiche na-enweghị ụjọ ọbụla maka mwakpo ndị ekperima
- Gọọmentị amapụtala obosara ala dị hekta 500,000 maka nkwalite nkọpụta ihe oriri
Gọọmentị tụrụ anya na atụmatụ ndị a ga-ebutu ọnụahịa ihe oriri, belata nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga, ma gbochie Naịjirịa ịbanye n'ọnọdụ ụnwụ n'ọdịnihu.










