Ị ma na ịta anụ na-acha mmee mmee nwereike ịmetụta ahụike gị n'ụzọ ọjọọ?
Ịtụkwasị anụ n’elu ihe oriri dị ka omenala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche. Nri anaghị ezuru ọtụtụ oke ma ọ bụrụ na anụ adịghị na ya.
Atụmatụ ịgbahapụ ịta anụ, nke ndị bekee na-akpọ 'vegetarian', abụbeghi ihe ọtụtụ na-esonye na ya na Naịjirịa ugbua agbanyeghi na ya bụ ihe abụkwaghị ihe ọhụrụ na mba ofesi dị icheiche.
Anụ ehi, anụ ewu, anụ atụrụ nakwa anụ ndị ọzọ na-acha mmee mmee ka bụ ihe ndị mmadụ kacha ata n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche mana ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ịta oke anụ ndịa na-acha mmee mmee nwereike imetụta ahụike mmadụ n’ụzọ ọjọọ.

Ebe foto si, Sisiyemmie TV
Otu onye dọkịnta gwara BBC Igbo na ịta oke anụ ndị a nwereike ibutere mmadụ ọrịa obi, ọrịa mkpọnwụ ahụ na ụfọdụ ụdị ọrịa kansa.
Dọkịnta Ogechi Eze kwuru:
“Ịta oke anụ na-acha ọbara ọbara dịka anụ ehi, anụ ewu adịchaghị mma maka ọrụ ha na-enye ime ahụ mmadụ dịka akiri na imeju”.
Ọ gara n’ihu kwukwa etu ndị ọzọ ịta oke anụ ndị a sị emetụta ahụike ọkachasị ndị nwere ọndọụ ndakpo ahụike ndị ọzọ.
Dọkịnta Eze kwuru:
“Ịtafe anụ ndị a oke na-akpata mgbali elu 'cholesterol' n'ahụ mmadụ”
“Ọ dịghị mma maka ahụike ndị nwere ọrịa ọbara mgbali elu, ọ dịghịkwa mma n'ahụ ndị nwere ọrịa shuga ”
Dọkịnta ọzọ gwakwara BBC Igbo okwu ma kwuo na ịta obere anụ ndị na-acha ọbara ọbara nwereike imeziwanye ahụike ndị mmadụ, ọkachasị n’akụkụ mba ndị na-enweghị ka ọ hara ha bụ ebe iri ezigbo nrị bụ nsogbu.
Dọkịnta Francis Ezenwankwo bụ onye na-ahụ maka ahụ ụmụnwaanyị kwuru:
“Ọ bụghị na a sị ndị mmadụ atala anụ ndị na-acha ọbara ọbara, kama ka ndị mmadụ beletatu aka etu ha si ata ya bụ ihe”.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ gara n’ihu kwuo na nke ka njọ bụ ya bụ anụ nwereike ịmetụta ụmụnwaanyị n’ụzọ dị iche.
O kwuru:
“Ụmụnwaanyị ndị Afrịka, na-ebutekarị ọnọdụ ahụike a na-akpọ 'fibroid', nnyocha sanyesi egosila na e nwere ihe jikọrọ ọrịa a na ịta anụ ndị na-acha ọbara ọbara”.
Nwaanyị dọkịnta Eze dọkwara ọha ndụmọdụ ka ha na-agbalia na-atatụ ọnụ ndị na-acha ọcha dịka anụ ọkụkọ maọbụ anụ azụ dịka anụ ndị a na-acha ọcha anaghị emetụtacha ahụike ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ etu ndị nke na-acha uhie uhie.
O kwuru: “Kama mmadụ iri naanị anụ ndị na-acha ọbara ọbara, e kwesịrị ka ndị mmadụ ritu obere anụ, ha etinyekwa ihe dịka azụ maọbụ ero na nri ha”.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-agbasaozi maka mmetọ ihe eligwe na-ekwukwa na izu ehi na-emetụta mmetọ ihu eligwu, ihu mmiri, nakwa ala n’ụzọ ugboro atọ ruo 10 karịa izu ọkụkọ. A na-ekwukwa na izu ehi na anụmanụ ndị dị ka ya na-emepụta ajọọ ikuku ndị na-emetọ ihu eligwe.
Naịjirịa so na mba ndị kwere nkwa ihibe usoro ga-ebeleta mmepụta ikuku ọjọọ ndị a mana ya bụ ihe ka na-aga nwanyọ nwanyọ.
Atụmatụ akụkọ a bụ ịhụ na ndị mmadụ malitere chọba egwu ojii mgbe chi ka dị banyere ikwalite ahụike ha.
Atatụ anụ, atatụ azụ, atatukwa ero nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ na-edozi ahụ iji hụ na enyere ahụ mmadụ ihe niile e kwesịrị inye ya iji kwụrụ chịm.



