Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Mgbali elu ọnụahịa ihe na Naịjirịa ruru pasentị 26.72 n'ọnwa Septemba

    Onye na-ere osikapa

    Ọnụ ahịa ihe na Naịjirịa ka na-arịkwa elu n'ike n'ike dịka ngụkọ nke ụlọọrụ 'National Bureau of Statistics' (NBS) mere si gosi.

    Ngụkọ a nke a na-akpọ 'Consumer Price Index' gosiri na ọ bụ ọnụ ahịa ihe oriri kacha rịa elu n'etiti ọnwa ọgọst na ọnwa Septemba 2023.

    N'Ọgọst, mgbali elu ọnụahịa dị na pasentị 25.80, mana o jiri pasentị 0.92 rịa elu n'ọnwa Sepụtemba dịka ọ nọzi na pasentị 26.72.

    Iji tụnyere etu ihe dị n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2022, ngụkọ gosiri na ọnụahịa ihe ji pasentị 5.94 gbalie elu na Septemba 2023.

    Na ntule ọnụahịa ihe oriri naanị, mgbali elu kwụ na pasentị 30.64, nke ji pasentị 7.30 kara elu karịa etu ọ dị n'ọnwa Sepụtemba nke afọ gara aga bụ pasnrụ 23.34.

    Mgbali elu ọnụ ahịa ihe dị icheiche kawanyere njọ kamgbe onyeisiala Bola Tinubu kwuru na gọọmentị ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Nke a bịara mee ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa site na naịra 140 maọbụ 150 ruo ebe naịra 620. Nke a mere ka ọnụahịa njem ụgbọala gbalikwaa, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kwuburu na ha ga-amalite abụbụ ọrụ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba 2023 n'ihi nnukwu nhịahụ ndị ọrụ na-agabiga maka ọnọdụ akụnaba ọjọọ Naịjirịa nọ na ya ugbua. Mana ha kwuru na ha akagbuola atụmatụ ahụ dịka gọọmentị kwere nkwa ilebanye n'etu a ga-esi bulie ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

  2. Unu asaala chi?

    Nnọọ nụ n'ọbaozi anyị

  3. Gọọmentị etiti ga-ebunye Mahadu dị icheiche ụgbọala iji belata ụgwọ njem

    Ụgbọala Bus

    Ebe foto si, The Herald

    Nkọwa foto, Foto ochie a gosiri ụgbọala gọọmentị etiti zụtara maka njem ọha n'afọ 2012, oge gọọmentị site n'atụmatụ SURE-P dịka gọọmentị kwụsịrị ịkwụ 'fuel subsidy'

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwuola na gọọmentị ga-ebunye otu ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị elu dị icheiche na Naịjirịa ụgbọala bus iji nyere ha aka na njem ịga nakwa ịla akwụkwọ.

    Ụlọọrụ onyeisiala kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde, ma kwuo na ọ bụ ụzọ onyeisiala ji ebelata ihe nhịahụ ụmụakwụkwọ na-agabiga n'oge a.

    "Ụgbọala ndị a ga-ebupu ibu arụ sitere na mgbali elu ụgwọ ime njem bụ nke na-anyịgbu ụmụakwụkwọ nakwa ndị nne na nna ha," akwụkwọ ozi ahụ si n'aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Dele Alake kwuru.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ha kwukwara na Onyeisiala Tinubu enyela ntuziaka ka e wepụ ihe niile nwereike igbochi ụmụakwụkwọ inweta ego mgbazinye nke gọọmentị kwere na nkwa site n'atụmatụ 'students loan'.

    "Nke a bụ iji hụ na onweghị nwa akwụkwọ Naịjirịa ọbụla ga-agbahapụ agụmakwụkwọ ya n'ihi ụlọ ego maọbụ ndakpọ akụnụba nke nne na nna ya."

    "Onyeisiala enyekwala iwu ka a malite ikesa nri ruru 'Metric Tonne puku narị abụọ nye ezinụlọ dị icheiche na steeti niile dị na Naịjirịa nakwa FCT, ma hụkwa na ụmụ akwụkwọ ritere elele na ya."

    "Onyeisiala Tinubu ga-aga n'ihu n'ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naịjirịa site n'ịkwalite ọdịmma ndị nkuzi, ndị ọrụ mahadum na-anọghị na nkuzi, ụmụakwụkwọ, nakwa site n'iwulte mahadum Naijirịa dị icheiche iji mee ka ha nwee ike ịma aka ha na ndị ogbo ha na mba ụwa dị icheiche."

  4. 'Bikonu, ụnụ agbakwala abụbụ ọrụ' - Orji Kalu na-arịọ NLC

    Orji Uzor Kalu

    Ebe foto si, oukgram/Instagram

    Sinetọ na-anọchi anya mpaghara Abia North n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Orji Uzor Kalu, arịọla otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' ka ha hapụ ịgba abụbụ ọrụ ha kwuru na ha ga-agba.

    Kalu rịọrọ arịọrịọ a n'ihe onyonyo o tinyere n'akara soshal midia ya n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 31 nke ọnwa Julaị 2023.

    Nke a na-abịa dịka ndị NLC kwuru na ha ga-amalite abụbụ ọrụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst iji gosi iwe ha maka nnukwu nhịahụ ndị ọrụ na-agabiga ugbua dịka gọọmentị etiti kwụsịrị ịkwụ ụgwọ 'fuel subsidy'.

    Kalu, onye bụbu gọvanọ Abia Steeti malite na 1999 ruo 2007, kwuru na ya onwe ya ma na ihe siri ike nke ukwuu na Naịjirịa ugbua, dịka ya bụ onye nwere ụlọọrụ dị icheiche ma nwekwaa ndị na-arụrụ ya ọrụ.

    Mana o kwuru na abụbụọrụ abụghị ụzọ ka mma iji soo ya, kama ka NLC na gọọmentị etiti nwee mkparịtaụka iji mata etu a ga-esi gboo ihe isi ike ndị mmaọ̄ụ na-agabiga.

  5. Onyeisiala Niger Repọblik egosila onwe ya n'ọha nke mbụ kamgbe a chụturu ya n'ọkwa

    Idris Deby na Mohamed Bazoum

    Ebe foto si, President Idris Deby

    Ahụla onyeisiala mba Niger Repọblik bụ Mohamed Bazoum n'ọha nke mbụ kamgbe izuụka gara aga oge ndị agha mba ya chụturu ya n'ọkwa.

    Foto ebe onyeisiala mba Chad bụ Idriss Deby gara leta Bazoum na Niamey, isi obodo Niger Repọblik, fesara na soshal midia n'ụtụtụ Mọnde.

    Ọgbakọ a dị n'etiti Bazoum na Deby bịara dịka otu Ecowas zigara ya ka ọ gaa kpaa udo n'etiti onyeisiala Bazoum na ndị agha mba Niger.

    Cheta na otu Ecowas nyere ndị agha ahụ ụbọchị asaa ka ha nyeghachi Bazoum ọchịchị, ma ọ bụghị ya, Ecowas ga-eme ihe niile ha nwere ike iji tinyeghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na mba Niger, nke gụnyere iji aka ike chụpụ ndị agha ahụ.

    Foto fesara na soshal midia gosikwara ebe Idriss Deby na ndị agha ahụ nọzị n'ọchịchị na Niger Repọblik ugbua na-enwe ọgbakọ.

    Idris Deby na Abdouramane Tchiani

    Ebe foto si, President Idris Deby

  6. Ndị Igbo mmamma nu!!!

  7. Ka chi fo

    Igbo ndị ọma, mgbasaozi anyị nke taa abịala na njedebe.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Ka emesia.

  8. Ndị DSS ahapụla Nnamdi Kanu ka ọ hụ dọkịta nke ọ chọrọ - Ifeanyi Ejiofor

    Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor

    Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor

    Ifeanyi Ejiofor, bụ ọkaiwu onyendu otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ndị uwojii nzuzo Naịjirịa bụ DSS n'ịchafụ tọhapụrụ Nnamdi Kanu n'ụbọchị Fraịde ka ọ ga hụ dọkịta ya.

    Ejiofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Satọde ma kwuo na Nnamdi Kanu gara mee nnyocha ahụike a n'otu ụlọọgwụ dị n'Abuja, mana ọ kpọghị aha ụlọọgwụ ahụ.

    "Obi dị anyị ụtọ ịgwa ụnụ na Onyendu Mazi Nnamdi Kanu gara zute dọkịta nke o ji aka ya họrọ n'ụbọchị Fraịde n'otu ụlọọgwụ dị n'Abuja, na-abụghị n'ogige ndị Department of State Service (DSS)," Ejiofor kwuru.

    "Dịka usoro iwu si dị, eso m ya mee njem a ma hụkwanụ ihe niile merenụ. Nnyocha ahụike a gara nke ọma ma mịtakwa mkpụrụ, Kanu ga-agakwa maka agba nke abụọ nke nnyocha a n'oge adịghị anya."

    Nke a bụ nke mbụ ndị DSS na-enye Kanu ohere ka ọ hụ dọkịta na-abụghị nke ha onwe ha na-akpọtara ya n'ụlọ mkpọrọ.

    Kamgbe ọnwa Ọktoba afọ 2021 ka ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere iwu ka ndị DSS nye Nnamdi Kanu ohere ka ọ hụ ndị dọkịta ya n'ihi mkpesa ahụike dị icheiche, mana ndị DSS ekweghị ahapụ Kanu ka ọ gaa ụlọọgwụ, kama ha na-akpọta ndị dọkịta nke ha ka ha bịa na-enye ya ọgwụgwọ n'ime ụlọ mkpọrọ.

    N'ihi nke a, ndị ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome (SAN) na Ifeanyi Ejiofor wegakwara mkpesa ọzọ n'ụlọikpe ka ọkaikpe manye ndị DSS ka ha hapụ Kanu ka ọ ga hụ ndị dọkịta nke ọ chọrọ.

    N'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, ọkaikpe Binta Nyako nyekwara ndị DSS iwu ọzọ ka ha nye Kanu ohere ka ọ hụ ndị dọkịta nke ọ chọrọ.

    Mana ọkaikpe ahụ kwuru na ndị DSS ga-eso ya gaa hụ dọkịta ọbụla ọ chọrọ ịhụ ma nọrọkwa ebe ahụ hụ etu ihe niile ga-esi gaa.

  9. Tinubu ahọpụtala onye nnyocha pụrụ iche iji nyọchaa ụlọakụ etiti

    CBN

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ahọpụtala nwa amadị aha ya bụ Jim Obazee dịka onye nnyocha pụrụ iche iji nyochaa Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa (CBN) nakwa ngalaba gọọmentị ndị ọzọ.

    N'ozi nke onyeisiala binyere aka na ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Julaị 2023, Tinubu kwuru na ya na-eme nke a n'iso usoro iwu nke Naịjirịa nakwa imejupụta nkwa ya ibuso mpụ na nrụrụaka agha na Naịjirịa.

    Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na a ga-eme ka Obazee mara kpọmkwem ihe niile onyeisiala chọrọ ka o mee n'ime ụbọchị ndị na-abịa n'ọdịnihu.

    Mana onyeisiala gwara Obazee ka o mee ihe niile dị mkpa ime iji mechie mpio niile dị n'ụlọakụ etiti nke Naịjirịa, ma mekwaa ka ngalaba niile nke gọọmentị ji enweta ego siwanye ike.

    Mazị Obazee bụbu onyeisi ngalaba a kpọrọ 'Financial Reporting Council of Nigeria' (FRCN).

    Akwụkwọ ozi ahụ nyere Obazee ikike ka ọ họrọ ndị niile o chere na aka siri ike, ndị nwerela ahụmihe gbara ọkpụrụkpụ nakwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ mgbochi nrụrụaka ọbụla o chere na ha ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ a nke ọma.

    Obazee ga na-ezitere Onyeisiala ozi kwa izuụka etu ọrụ nnyocha a sị aga

    Cheta na onyeisiala Tinubu wepụrụ Gọvanọ Ụlọakụ Etiti bụ Godwin Emefiele n'ọkwa n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jun 2023.

    N'ụbọchị iri nke June, ndị ọrụ nchekwa DSS jidere Emefiele maka ebubo nrụrụaka dị icheiche. Emefiele ka nọ n'aka ndị DSS ruo taa, dịka ha jụrụ ịtọhapụ ya n'agbanyeghị na ụlọikpe enyela iwu ka a tọhapụ ya ma ọ kwụọ ego dị nde naịra 20.

    N'agbanyeghị na DSS kwuburu na ọ bụ n'ihi nnyocha nrụrụaka ka ha ji jichie, Emefiele, ebubo ha boro ya n'ụlọikpe bụ na ha hụrụ egbe na ngwaọgụ dị icheiche n'aka ya.

  10. Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

    Adamawa

    Ebe foto si, Premium Times

    Gọvanọ Adamawa Steeti bụ Ahmadu Umaru Fintiri etinyela ọnọdụ mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile, dịka ụfọdụ ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri dị icheiche ma ndị nke gọọmentị nwe ma ndị nke ndị nkịtị nwe.

    Akụkọ kwuru na igwe mmadụ malitere ịkpagharị n'ụbọchị Sọnde na-akụka ụlọ ebe gọọmentị na-echekwa ihe oriri nakwa ụlọ ahịa ndị mmadụ na-ere ihe oriri na ihe ndị ọzọ, ma na-ebukọrọ ihe niile ha nwere ike.

    Otu onye aha ya bụ Manu Haruna gwara ndị ntaakụkọ Premium Times na "ọ bụghị naanị ihe oriri ka ndị ahụ na-eburu, ha na-ebukọrọkwa ihe ndị ọzọ dịka igwe na-enye ọkụ, akwa ndina, na ihe ọbụla ha hụrụ n'ụlọahịa ndị mmadụ".

    O kwuru na ndị na-eme ihe a na-ekwu na nhịahụ akarịala ha ahụ dịka ọnụahịa ihe niile gbaliri elu kamgbe gọọmentị etiti kwụrụ ịkwụ 'fuel subsidy'.

    Humwashi Wonosikou bụ ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Fintiri wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Sọnde iji katọọ ihe a ndị mmadụ na-eme ma tinyekwa mmachi mkpagharị ndị mmadụ na steeti ahụ niile.

    "Gọvanọ Fintiri na-etinye ọnọdụ mmachi mkpagharị a n'ihi etu ụfọdụ ndị omekome si jiri mma na-awakpo ndị mmadụ na mpaghara dị icheiche ma na-ebukọrọkwa ihe ha," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    "Nke a pụtara na agaghị enwe mkpagharị ọbụla na Adamawa Steeti niile ogologo ụbọchị niile.

    "Naanị ndị na-arụ ọrụ dị mkpa ga-enwe ike ịkpagharị n'oge a, mana ha ga-eji akwụkwọ njirimara ga-egosi na ha na-arụ ọrụ dị mkpa.

    "Gọvanọ na-arịọ ndị niile bi na steeti a ka ha rube isi n'iwu a maka na onye ọbụla a hụrụ ka ọ na-enupu isi, a ga-ejichi ya ma nye ya ntaramahụhụ siri ike dịka iwu si dị."

    N'otu aka ahụ kwa, ndị uweojii Adamawa Steeti wepụtakwara akwụkwọ ozi iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rube isi n'iwu mmachi mkpagharị ahụ ma sepụ aka n'ihe ọbụla nwereike ibute ọgbaaghara.

    Kọmishọna ndị uweojii Adamawa Steeti bụ Afolabi Babatola kwuru na ya ezipụla ndị uweojii site na ngalaba dị icheiche iji hụ na onye ọbụla rubere isi n'iwu mmachi mkpagharị nke gọọmentị tinyere.

  11. Ihe Peter Obi kwuru maka atụmatụ ‘sit at home’

    Onye ji ọkọlọtọ Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

    Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

    Peter Obi bụ onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023 akatọọla atụmatụ ịnọ n’ụlọ bụ nke otu ngalaba Indigenous People Biafra (Ipob) Simon Ekpa nọ n’isi ya tinyere.

    O kwuru nke a n’ọgbakọ mkparịtaụka nke otu a kpọrọ ‘Parallel Facts’ haziri n’ọbaozi Twitter n’ụbọchị Satọde 29 Julaị 2023.

    Obi kwuru na ọ a bịa n’ọchịchị onye kwuo uche ya, na ndị mmadụ nwere ikike ịchọ ihe masịrị nke a kpọro ‘agitation’ na Bekee.

    O kwuru na ihe ọ ga-eme bụ ịkpọku ndị niile nwere ọchịchọ ndị a ka ya na ha nwee mkparịtaụka banyere ya nakwa etu a ga-esi mee ka ọ dị mma.

    N’okwu ya “Ọ bụrụ na m bụrụ onyeisiala Naịjirịa aga m agba mbọ hụụ na m kpokọtara ndị niile na-azọ otu ihe na nke ọzọ, ma jụọ ha ihe ha chọrọ, anyị akpaa nkata ma rọzie olu ọfụma.”

    “Ndị mmadụ nwere ikike ịchọ otu ihe maọbụ nke ọzọ.”

    “E kwuola m ya mbụ, m na-akatọ kpam kpam ihe niile gbasara atụmatụ ịnọ n’ụlọ, o kwesighi ekwesi.

    “Ana m ekele ndị gọvanọ na-apụta ugbua na-ekwu na ha achọghị ya bụ ‘sit at home’.

    “Apụtatụla m n’ụbọchị Mọnde ma kpagharịa n’okporoụzọ.

    “Ọ bụghizi ihe banyere Ipob maka na ha ekwuola ya mbụ na ha akwadoghi ya na ọ bụghị ha na-etinye iwu a.

    “Ugbua ọ bụzi ihe ndị omekaome ji akpa ike nke pụtara na e kwesiri ime ha etu e si eme ndị omekaome

    “N’uche nke m, ndị ahụ na-etinye ma na-amanye ‘sit at home’ bụ ndị omekaome, ana m asị ka ndị ọchịchị mee ha ka e si eme ndị omekaome.”

    Na mkparịtaụka ahụ, Obi tinyere ọnụ ma zaa ọtụtụ ajụjụ banyere nchekwa, akụnaụba, ahụike, ịdịnotu Naịjirịa, ngaharịiwe EndSARS na ihe ndị ọzọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ihe mere ndị uweojii jiri nwuchie Nonso Nkwa - Gọọmentị Imo Steeti

    Maazị Nonso Uba bụ onye mgbasaozi na Redio Oziza dị n'Owerri Imo steeti

    Ebe foto si, Nonoso Nkwa/Facebook

    Gọọmentị Imo steeti agọọla na aka ha adịghị na nwuchi ndị uweojii nwuchiri onye mgbasaozi na redio bụ Nonso Uba.

    Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ Declan Emelumba kwuru na ihe mere ndị uweojii si Abuja jiri nwuchie nwamadị a bụ maka ebubo ime mpụ na nkwutọ ọ na-ekwu nke metụtara nchekwa obodo.

    O kwuru na ndị mmadụ jizi n’ihi ọmaiko na-akatọ gọọmentị Imo kama chefuo ebubo ihe a sị na onye mgbasaozi a mere.

    O kwuru na ihe kachasị bụrụ nsogbu abụghị usoro e jiri nwuchie kama na ọ bụ etu nwamadị a si kwutọọ aha Gọvanọ Hope Uzodimma na nke Asari Dokubo ma sị na ọ bụ ha na-egbusi ndị mmadụ n’Imo Steeti.

    O kwuru na ihe gọọmentị mere bụ ịgwa ndị uweojii ka ha leba anya n’ebubo nwamadị a boro ma chọpụta nke bụ eziokwu.

    “Gọvanọ ṅụrụ iyi ichekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ mana mmadụ apụta na-ekwu na ọ na-egbusi ndị ọ ṅụrụ iyi ichekwa. Ọ bụ ihe ziri ezi ma ọ sị ndị uweojii mee nyocha banyere ebubo a”

    Kọmishọna kwuru dịka iwu kwuru na onye boro ebubo ga-egosi ihe akaebe, na ọ dị mkpa ka ndị uweojii kpọọ nwamadị a oku ka o gosi ihe akaebe n’ebubo ndị o boro.

    O gara n’ihu kwuo na kama ndị mmadụ ga-ele anya n’ebubo nwamadị a boro gọvanọ, ha na-emezi ka ọ bụ ya ka a na-emegbu emegbu.

    O kwuru na ndị na-akpọ oku ka Gọvanọ Hope tọhapụ Nonso na ha maara na okwu a dị n’etiti ya na ndị uweojii.

    “O doro m anya na ndị uweojii ga-atọhapụ ya ma o gosi ihe akaebe etu gọvanọ Uzodimma na Asari Dokubo si na-egbusi ndị Imo steeti.”

    Cheta na ndị a si mechiri ihu ha wakporo Nnoso ma nwuchie ya n’izuụka gara aga mana e mechara ọ bụrụ ndị uweojii.

  13. Nwụlatara anyị Simon Ekpa ka o soro anyị mee ‘sit at home’ – Hope Uzodimma

    Gọvanọ na-achị Imo Steeti bụ Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

    Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodimma arịọla gọọmentị etiti Naịjirịa ka ha nwụlata Simon Ekpa site na mba Finland ka ọ bịara soro ndị bi n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nọrọ n’ụlọ dịka ọ na-enye n’iwu.

    Gọvanọ Uzodimma kwuru nke a mgbe ọ na-anatara onyeisi ndịagha Naịjirịa ngalaba ‘82 Division’ bụ H.T Dada n’obi ọchịchị ya dị n’Owerri n’ụbọchị Satọde.

    Uzodimma kwuru na ọtụtụ ihe gịnyere nchekwa na-ama ndị bi na mpaghara ahụ aka n’ihu ọkachasị atụmatụ ‘sit at home’ bụ Simon Ekpa bi na mba Finland na-akwado.

    N’okwu ya “Ọ bụ olileanya ma na ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ọzọ na Naịjirịa ga-egbo nsogbu nchekwa, ntọrị, ekperima na mpụ jupụtara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    “Nke kachasị nke bụ atụmatụ ịnọ n’ụlọ bụ otu onye a kpọrọ Simon Ekpa bi na Finland na-amanye ndị mmadụ n’ike. Ọ ga-amasị ma na ndịagha Naịjirịa nakwa gọọmenti etiti ga-agbakọta aka ọnụ nwụlata Ekpa na Naịjirịa ka ọ bịa soro anyị nọrọ n’ụlọ maọbụ taa ahụhụ dịịrị ya.”

    N’aka nke ọzọ, ọchịagha Dada kwuru na ọ malitere ọrụ ya na ngalaba 82 division n’izuụka abụọ gara aga ma sị na onyeisi ndịagha na Naịjirịa bụ Taoreed Lagbaja enyela ya iwu ibuso mpụ agha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha dị njikere ịrụ ọrụ ha dịka ike kwere ha iji kpochapụ ndị niile na-ebute ọgbaghara, ntọrị na enweghi ezi nchekwa na mpaghara ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị nọ n'ọchịchị kpọrọla oku ka a kwụsị atụmatụ 'sit at home' a nke Simon Ekpa bụ onye ndu otu ngalaba Indigenous People of Biafra (Ipob) nọ n'isi ya.

    N'otu aka ahụ ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa n'izuụka gara aga gwara gọọmentị etiti ka ha nwụlata Ekpa site na mba Finland.

    Na nso nso Nnamdi Kanu, bụ onyendu Ipob site n'aka ọkaiwu ya degaara Ekpa ozi sị ka ọ kwụsị inye iwu maka ịnọ n'ụlọ a mana Ekpa kwuru na ọ gaghị ege onye ọbụla nọ na mkpọrọ ntị.

  14. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Anyị ji obi ọcha anabata unu n'ọgbakọ anyị bụ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Biko bịa nọnyere anyị maka ịgụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe taa na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.

    Daalụ.

  15. Ihe isii Bola Tinubu merela n'ime ụbọchị 60 ọ rụrụla ọrụ ka Onyeisiala Naịjirịa,

    Onyeisiala Tinubu na onyeisiala Fransị bụ Emmanuel Macron

    Ebe foto si, Twitter/Bola Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu anọọla ụbọchị 60 n'ọkwa ahụ.

    Ọ bụ ezie na otu ndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) na ndị 'Labour Party' (LP) ka nọ n'ụlọikpe na-agbagha mpụtara ntuliaka nke wepụtara Tinubu dịkaonyeisiala, mana ọdịghị ka nke a ọ na-emetụta Tinubu, dịka ọ maliterela ọrụ ya ka onyeisiala na-eleghị anya n'azụ

    N'ime ụbọchị 60 a Tinubu rụrụla ọrụ dịka onyeisiala, ọrụ ya agbapụtala ihe, ụfọdụ na-ekwu na na ọrụ ya dị mma, ndị ọzọ na-akatọ ya, ọ dabeere n'onye ị jụrụ.

    Anyị ga-agbali itule ụbọchị 60 nke onyeisiala Tinubu n'ọchichi n'isiokwu isii ndị a:

    1) Mwepu 'fuel subsidy'

    Aha onyonyo, Fuel subsidy removal: Ego ole m na-ejibụ agba ụgbọala aga ọrụ anaghịzị ezu

    N'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, dịka e duchara Tinubu n'iyiọrụ dịka onyeisiala, o kwupụtara sị "Fuel Subsidy alaala".

    Okwu a tinyere ọgbaaghara na Naịjirịa dịka ndị na-ere mmanụ ụgbọala kwụsịrị ire, ma mechaa tinye ya nnukwu ego nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbalie site na N184 ruo N488.

    Iji mee ka ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na Naịjirịa dịtụ mfe, onyeisiala gwara ndị omeiwu ka ha nye ya nkwa ịgbazite ego dị nde $800 n'aka ụlọakụ mba ụwa.

    Tinubu kwuru na ezinụlọ dara ụbịa ga na-enweta ego enyemaka puku naịra asatọ kwa ọnwa ruo ọnwa isii site n'ego a ụlọakụ etiti ga-agbazinye Naịjirịa.

    Mana ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ atụmatụ ahụ nke mere onyeisiala Tinubu ji kwuo na a ga-elebanye anya ọzọ na ya bụ atụmatụ.

    2) Atụmatụ dị icheiche maka ngalaba akụnụba

    Emefiele na Shonubi

    Ebe foto si, Getty Images/NIRS

    Onyeisiala Tinubu chụpụrụ Godwin Emefiele bụbu gọvanọ ụlọakụ etiti nke Naịjirịa (CBN) ma họpụta Folashodun Adebisi Shonubi iji nọchie ya.

    Tinubu kwupụtakwara na gọọmentị ya ejikọọla ọnụahịa mgbanwe ego ofesi, nke pụtara na ọnụahịa ego dọla, maọbụ paụnd maọbụ Euro bụzị dịka ahịọ́ si kwuo ka ọ ga-eji gbalie maọbụ gbatuo.

    Onyeisiala binyekwara aka n'akwụkwọ iwu anọ iji ụfọdụ ụtụisi nke a na-ana maka ịkpọ oku ekwentị, mmanya alkọhọl, nakwa ụfọdụ ụgbọala.

    Ndị na-ekwuru onyeisiala kọwara na nke a bụ iji mee ka ọ dịwanye mfe ndị ojiego achụ ego ịbata na Naịjirịa maka azụmahịa.

    Ọzọkwa bụ, iji belata etu ọnụahịa ihe oriri si arị elu, onyeisiala Tinubu tinyere ọnọdụ gbatagbata na ngalaba nkọpụta na nchekwa ihe oriri na Naịjirịa.

    O nyere iwu ka ihe niile gbasara ihe oriri bụrụzie nke ngalaba 'National Security Council' ga na-ahụ maka ya.

    Aha onyonyo, Gịnị ka 'State of Emergency' na ngalaba nkọpụta nri Naịjirịa pụtara?

    3) Ego mgbazinye maka ụmụakwụkwọ

    Otu n'ime nkwa Onyeisiala Tinubu kwere oge ọ na-achụ nta vootu bụ iwepụta atụmatụ mgbazinye ego maka ụmụakwụkwọ ndị nne na nna ha enweghị ego iji zụọ ha na mahadum.

    N'ụbọchị olemole o ji malite ọrụ, Tinubu binyere aka n'iwu ọhụrụ gbasara nke a. Iwu a nyere ohere ka ụmụakwụkwọ enweghị ego gbazite ego n'ụlọakụ iji kwụọ ụgwọ akwụkwọ ha, ma kwụghachi ya bụ ego mgbe ha gụchara akwụkwọ ma nweta ọrụ.

    Mana ọtụtụ akatọọla iwu a dịka ha kwuru na dịka iwu ahụ siri dị, ọ ga-ara ahụ nwata akwụkwọ ọbụla irite uru na ya.

    Aha onyonyo, Students Loan: Onye ga-etozu inweta ego mgbazinye agụmakwụkwọ a gọọmentị tinyere ọhụrụ?

    4) Mgbanwe ndị isi ọrụ nchekwa, na ndị ọzọ onyeisiala họrọ n'ọrụ

    Onyeisiala Tinubu gbanwere ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa niile, malite n'onyeisi ndị uweojii ruo na onye ndụmọdụ pụrụ iche maka nchekwa.

    Ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ nke onyeisiala Tinubu họpụtara gụnyere:

    • Nuhu Ribadu - 'National Security Adviser'
    • Maj. Gen. Christopher .G Musa - 'Chief of Defence Staff'
    • Maj. Gen. Taoreed. A Lagbaja - 'Chief of Army Staff'
    • Rear Admirral E. A Ogalla - 'Chief of Naval Staff'
    • Hassan Bala Abubakar - 'Chief of Air Staff'
    • DIG Kayode Egbetokun - 'Inspector General of Police'
    • Adeniyi Bashir Adewale - onyeisi 'Customs'
    • Maj. Gen. Emmanuel Akomaye Parker Undiandeye - 'Chief of Defense Intelligence'.
    Ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ

    Na nsonso a, Tinubu wepụtakwara aha mmadụ 28 ndị ọ chọrọ inye ọrụ dịka Mịnịsta. Aha ndị a nọ ugbua n'ihu ndị omeiwu sineti, bụ ndị ga-enyocha ha ma nye ha nkwado tupu Tinubu enya ha ọkwa mịnịstrị ha ga na-elekọta.

    5) Onyeisioche Ecowas

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu?Twitter

    N'ọnwa Julaị, a họpụtara Onyeisiala Tinubu dịka onyeisioche nke otu 'Economic Community of West African States' (ECOWAS).

    Nke a ka Tinubu bụrụ onyeisi Naịjirịa nke itoolu na-anọ n'ọkwa a kamgbe afọ 1975 oge Yakubu Gowon bụụrụ onye Naịjirịa mbụ nọrọ n'ọkwa ahụ.

    Kamgbe Tinubu bụụrụ onyeisi Ecowa, e nweela ọgbaaghara na mba Niger Repọblik, bụ otu mba so n'Ecowas, nke mere ka Tinubu ziga ndị mmadụ na mba ahụ ịga kpaa udo.

    6) Njem ofesi Tinubu merela

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

    Nkọwa foto, Tinubu oge ọ na-ahapụ Nairobi, Kenya, ebe o sonyere n'ọgbakọ African Union

    Njem ofesi mbụ Tinubu mere bụ oge ọ gara obodo Paris, na mba Fransị, isonye n'ọgbakọ mba ụwa a kpọrọ 'Paris Summit for New Global Financial Pact'.

    O sonyekwara n'ọgbakọ Ecowas na mba Guinea Bissau bụ ebe a nọrọ nye ya ọkwa onyeisi oche.

    Tinubu gakwara mba Kenya ebe o sonyere n'ọgbakọ 'African Union' nke e nwere n'obodo Nairobi.

  16. Ụgbọelu nke ndịagha Australia na Amerịka ji eme ọzụzụ akpọkasịala

    Ụgbọelu ndị agha

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọelu helịkọpta MRH-90 Taipan, etinyere iji kọwaa akụkọ

    A na-achọ ndị ọkwọ ụgbọelu anọ achọ ugbua na mba Australia, dịka ụgbọelu helịkọpta ha nọ na ya kpọkasịrị na mpaghara Queensland nke mba ahụ.

    Ihe mberede a mere n'abalị ụbọchị Fraịde n'ọzụzụ nke ndị agha mba Amerịka na Australia na-eme na mpụga 'Lindeman Island'.

    Mịnịsta nchekwa mba Australia bụ Richad Marles kwuru na ha zipuru ndị otu gbatagbata ozugbo ụgbọelu helịkọpta ahụ kpọkasịrị.

    Ka ọ dị ugbua, a hụla ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị, hụkwanụ akụkụ ụgbọelu ahụ ndị mebiri emebi, mana ahụbeghị mmadụ anọ nọ n'ime ya bụ ụgbọelu helịkọpta.

    "Anyị ahụbeghị mmadụ anọ nọ n'ime ụgbọelu helịkọpta ahụ," Marles gwara ndị ntaakụkọ n'ụtụtụ ụbọchị Satọde.

    O kwuru na ihe mberede ahụ mere n'ebe elekere iri na ọkara nke abalị.

    "Echiche anyị niile dị n'ebe ndị ọkwọ ụgbọelu ahụ na ndị ezinụlọ ha dị, anyị na-enwe olileanya na anyị ga-enweta akụkọ ọma dịka ụbọchị taa na-aga."

    "Ugbua ka bụ chi ofufo, n'oge na-adịghị anya anyị ga-enwetakwu ozi gbasara ihe a merenụ.

    Angus Campbel bụ 'Chief of Defence Force' kwuru na ihe kacha mkpa ugbua bụ "ịchọta ndị nke anyị ma nyekwa ha na ndị ezinụlọ nkwado niile dị ha mkpa.

    Ụgbọelu a bụ MRH-90 Taipan kpọkasịrị dịka e ji ya eme ọzụzụ a kpọrọ 'Talisman Sabre', nke bụ ọzụzụ ndị agha kacha ibu n'etiti ndị agha Australia na nke ndị Amerịka bụ nke a na-eme kwa afọ. Ndị agha si mba Japan, France, Germany nakwa South Korea na-esonyekwa n'ọzụzụ a.

    Ya bụ ọzụzụ kwesịrị ịkwụsị n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst, mana ndị isi otu agha mba Austrelia kwuru na ha akwụsịtụla ya ugbua iji gbado anya n'ịchọta ndị ọkwọ ụgbọelu anọ ahụ.

  17. Ụtụtụ ọma

    Igbo nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa na-egbughịoge.

    Daalụ maka isonyere anyị.

  18. Kamala Harris, Antonio Gutteres akpọọla Tinubu gbasara ọgbaaghara na Niger Repọblik

    Kamala Harris, Bola Tinubu, Antonio Guterres

    Ebe foto si, Getty Images/Nigeria Presidency/BBC

    Osote Onyeisiala mba Amerịka bụ Kamara Harris na onyeisi otu 'United Nations' bụ Antonio Guterres ekwupụtala nkwado ha maka mbọ Naịjirịa na-agba iji weghachite ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mba Niger Repọblik ebe ndị agha weghaara ọchịchị n'ike n'ụbọchị Tọzde.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Bola Ahmed Tinubu bụ Dele Alake kwuru na ndị ọchịchị mba ụwa abụọ a kpọrọ Tinubu n'ekwentị n'ụbọchị Tọzde iji nye ya nkwado ha.

    N'ụbọchị Fraịde, Kamara Harris dere n'akara Twitter ya na ya na Onyeisiala Tinubu kpara nkata ebe ha nọrọ kwupụta ezi mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ, nakwa mbọ ha na-agba ịkwado ọchịchị onye kwuo uche ya na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịca nakwa Sahel, iji kwalite mwulite ọnọdụ akụnụba.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Dele Alake kwukwara na ndị ọchịchị mba ụwa abụọ ahụ kelere Tinubu onye na-agba mbọ, dịka onyeisioche otu Ecowas, iweghachite udo tọrọ atọ na mba Niger Republic.

  19. Ihe anyị ma maka nnwụchi ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Nonso Nkwa n'Imo Steeti

    CHINONSO UBA

    Ebe foto si, CHINONSO UBA NONSONKWAFM

    Ndị ọrụ nchekwa ejichiela onye ntaakụkọ a ma ama n'Imo Steeti aha ya bụ Chinonso Ubah, onye ndị mmadụ ji Nonso Nkwa mara.

    Akụkọ etu e si jichie nwa amadị ahụ fesara na soshal midia ma kwuo na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa kpuchiri ihu nakwa ụfọdụ ndị uweojii jidere Nonso Nkwa n'ihu ụlọakwụkwọ 'Holy Ghost Secondary School', dọtuo ya n'ụgbọala ya, ma dọbanye ya n'ime ụgbọala nke ha tupu ha eburu ya pụọ.

    Ndị hụrụ ihe merenụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị uweojii ahụ bucha egbe ekweghị ka ndị mmadụ bịa nso dịka ha na-ejide Nonso Nkwa, ha ekwekwaghị ka ndị mmadụ sete ihe na-emenu n'ekwentị ha.

    "Nonso nọ na-eti mkpu na ndị ọrụ nchekwa chọrọ igbu ya, mana ndị ọrụ nchekwa ahụ yicha akwa ojii ma kpuchichaa ihu ha, buruchaa egbe, kpụụrụ ya tinye n'ụgbọala ha pụọ," otu onye na-achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru.

    Onye nlekọta ụlọọrụ mgbasaozi 'Ozisa FM' bụ Rev Fr Raymond Nzeogwu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị uweojii jidere Nonso Nkwa.

    Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii imo Steeti bụ Henry Okoye, na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC, kwuru na ndị uweojii Imo Steeti amaghị maka njide e jidere nwa amadi ahụ, kama ọ bụ ndị ngalaba uweojiia a kpọrọ 'CID' si n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja jichiri ya.

    Okoye rịọrọ ka anyị nyetụ ya nwa oge ka ya chọpụta kpọmkwem ihe niile gbasara njichi Nonso Nkwa nakwa ọnọdụ ya ugbua.

    Nke a abụghị nke mbu Chinonso Uba na-abanye na nsogbu n'ihi ọrụ ya dịka onye mgbasaozi.

    N'ọnwa Julaị afọ 2022, ngalaba na-achịkọta mgbasa ozi ọha na Naịjirịa bụ 'National Broadcasting Commission' machiri Nonso Nkwa ịgbasa ozi na redio na Naịjirịa ruo ọnwa isii maka ebubo na "o mehiere megide ọtụtụ iwu NBC" bịakwa bụrụ na o kwupụtala mmasị ya ịzọ ọkwa ọchịchị.

    Ọnụ na-ekwuru NBC n'oge ahụ bụ Franca Aiyetan kwuru "na iwu machiri onye ntaakụkọ ka nọ n'ọrụ ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla, mana anyị chọpụtara na Nonso (Nkwa) na-azọ ọkwa ọchịchị na pati ADC."

  20. Ndị agha iweghara ọchịchị n'ike na Niger, etinyela mpaghara Sahel n'ọnọdụ ọjọọ,

    Ndịmmadụ na-eme ngagharịiwe na Niger
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ wakporo isi ụlọọrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala Mohamed Bazoum nke mba Niger dịka ndị agha chụpụrụ ya n'ọkwa n'ụbọchị Tọzde

    Site na Mali ruo Sudan, mpaghara dị icheiche n'Afrịka nọzị n'ọchịchị ndị agha ugbua.

    Niger sobu na mba ebe ọchịchị onye kwuo uche ya siburu ike na mpaghara Sahel nke Afrịka, mana ugbua, ndị agha ewerekwala ọchịchị na mba ahụ.

    Onyeisiala Niger bụ Mohamed Bazoum, chọburu isi ọnwụ dịka ndị agha kwuru na na-eweghara ọchịchị, mana ndị agha ahụ jichiri ya.

    Bazoum so na ndị ọchịchị Afrịka na-enye ndị mba ofesi nkwado n'agha a na-ebuso ndị ọgụ nnupuisi alakụba.

    Mba France, bụ mba chịburu Niger, nakwa mba Amerịka akatọọla mweghara ọchịchị ndị agha mere na Niger, mana a na-atụ egwu ma ndị agha a nọ n'ọchịchị ugbua na-adọnyere mba Russia ukwu.

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na Niger na-efe ọkọlọtọ mba Russia dịka ha na-enwe aṅụrị maka etu ndị agha si weghara ọchịchị

    Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ ga-abụ ịgbaso ihe mere na mba Mali na Burkina Faso, bụ ebe ndị agha weghaara ọchịchị ma kwuo na ha chọrọ nkwado Russia.

    Ọnụọgụgụ mwakpo ndị ọgụ alakụba na Mali na Burkina Faso na-agbali elu, n'agbanyeghị ndị agha Wagner nke mba Russia nọ na mba Mali iji wulite nchekwa.

    Mana na mba Niger, ọnụọgụgụ ndị nwụrụla na mwakpo ndị ọgụ alakụba na-agbada kamgbe 2015 dịka ngụkọ gosiri.

    Nke a mere o jiri gbaa ụfọdụ gharịị dịka ndị agha weghaara ọchịchị na Niger kwuru na ọ bụ maka enweghị nchekwa nke sitere n'oke mwakpo ndị ọgụ alakụba, kpatara ha ji chụtuo onyeisiala.

    O dobeghị anya ma aka mba Rusia, maọbụ otu ndị agha Wagner nke Russia ọ dị n'ihe na-eme na Niger ugbua, akụkọ ekwuola na onyeisi Wagner bụ Yevgeny Prighozin kwuru na ya nabatara ihe ahụ ndị agha mba Niger mere.

    A na-atụzi anya ịmata ebe Ọchịagha Abdourahmane Tchiani, onye kpọpụtara onwe ya dịka onyeisiala Niger n'ụbọchị Tọzde, ga-eche ihu n'ọchịchị ya; onwebeghị onye ma ma ọ ga-aga n''ihu na mmekọrịta ya na ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ mba ụwa, ka ọ ga-anabata enyemaka mba Russia bụ nke na-abawanye nwayọ nwayọ na mpaghara Afrịka ugbua.

    Ọtụtụ na-ekwu na mweghara ọchịchị a egosila na ọchịchị onye kwuo uche ya nke jị nwayo ewere ọnọdụ na mpaghara Afrịka abụrụla ihe na-amazi jiji.

    Mana dịka otu Ecowas - nke bụ otu jikọrọ mba ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka - na-agba mbọ ịkpa maka udo, o doro anya na ọnọdụ nchekwa mpaghara ahụ na-akawanye njọ karịa etu ọ dịbu mbụ.