Nigeria's inflation 2021: Etu 'inflation' si akpa mụ na gị eze

Aha onyonyo, Nigeria's inflation 2021: 'Oke agụụ na-abịa maọbụrụ...'

Na nsonso a, ngalaba ngụkọ Naijiria bụ National Bureau of Statistics(NBS) wepụtara ozi nchọpụta ha mere nke kwuru na ọnụahịa(inflation) e jirila pasent iri na asatọ na ụma(18.17%) rịa elu.

Nke a bụ mgbali kachasị kemgbe afọ anọ gara aga.

Ka ọnụ ego nri sirịa site n'afọ 2009 ruo 2021
Ihe ụfọdụ nrị dara n'afọ 2021 na afọ 2016

Dịka nchọpụta NBS mere siri kwuo, ihe ndị kachasị tinye ego bụ ngwanri(23%) ọkachasị, anụ,azụ, ji,nduku,bredị,mmanụ akwụkwọnri na mkpụrụosisi.

Nri dị icheiche

Ebe foto si, BBC/NBS

Ọkachamara n'okwu nchọpụta metụtara iji ego achụego jiri osikapa kọwaa ihe ọ pụtara inwe 'inflation' site na ịgbakọ ihe ọ na-eri isi osikapa jelọf ga-ezuru otu ezinaụlọ mmadụ anọ n'afọ 2021 nakwa ihe o riri ime nke a n'afọ anọ gara aga.

Osikapa jelọf

Ha kwụkwara ihe e nwere ike ime iji gboo ya bụ ọgụ mgbalielu ọnụahịa.

Lee ya n'uju n'elu:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: