Etu ọtanisi mba UK ga-esi metụta gị?

Ezinụlọ na-ekiri TV

Ebe foto si, Getty Images

Akụ na ụba mba UK malitere ịdatụ kamgbe ọnwa Eprelu na Juun dịka atụmaatụ etu a ga-esi gbochi mfesa coronavirus kwanyere ha n'ọtanisi (recession).

Nke a butere nsogbu dịka ọchụchụ ọtụtụ mmadụ n'ọrụ nakwa ndatụ etu ndị mmadụ si ewepụta ego iji goro ihe.

Mana kedụ ka ya bụ ọtanisi ga-esi metụta ndị Afịrịka ha na mba UK nwere mmekọrịta?

Onye o ji ego achụ ego nakwa onye bụbụ onyeisioche 'Nigerian Economic Summit Group', Sam Ohuabunwa, kwuru na ọtanisi a ekwesighị ịtụ ụwa n'anya makana nsogbu covid-19 bu bia, tinyere ụwa n'ọgbaghara.

O kwuru na mba ndị ọzọ ka ga-aba ọtanisi makana ha amalitechabeghị azụmahịa na ihe ndị ọzọ na-ewebata ego na mba ha.

Etu coornavirus si metụta mba ụwa niile

Nsogbu coronavirus mere ka ọtụtụ ụlọahịa kwụsị ma chụọ ọtụtụ ndị ọrụ nke butere ndatụ akụ na ụba.

Etu o ga-esi metụta mba Afịrịka

1.Ndatụ enyemaka

Ohuabunwa kwuru na ọtụtụ mba nọ n'Afịrịka ka na-ele anya enyemaka n'ebe UK na mba ndị ọzọ tolitere etolite nọ, nke mere na ọ bụrụ na ha banye ọtanisi, ọ ga-eme ka ha welata aka n'enyemaka ha na-enye mba ndị a maka nsogbu nke ọrịa coronavirus butere.

2.Njem na nlegharị anya

Ọdọ ụgbọelu

Ọ ga-emetụta etu ndị mba UK si aga njem n'Afịrịka makana ọtụtụ n'ime ha enweghịzị ọrụ na-enye ha ego ha iji aga njem.

Jimi Ogbobine bụ onyeisi nnyocha n'ụlọọrụ na-ahụ maka akụnaụba, kwuru na mba dịka Kenya ga-ahụ ndatụ ndị na-eme njem nlegharị anya na be ha.

3.Ndatu ego ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi na-ewebata

Naira-Yuan

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Naijiria na China nwere nkwekọrịta mgbanwe ego ọnụahịa ya pụtara ijeri naira 844 nke pụtara ijeri Yuan 15

Ogbobine kwuru na nnyocha ụlọọrụ ha mere nso nso a na-egosi na mba UK kacha ewebata ego na Naịjirịa a kpọrọ disapora remittances na bekee.

Ha ji pasenti ruru iri atọ na ise maọbụ iri anọ wee gafee mba ndị ọzọ na-ewebata ego a.

Mana Ogbobine na-ekwu na ego ahụ ruru ijeri dọla iri abụọ na ise (25 billion dollars) kwa afọ ga-adatu ruo ijeri dọla iri abụọ (20 billion dollars) sọsọ n'afọ a.

Nke a ga-eme ka ndị Naịjirịa maọbụ Afịrịka bi na mba ofesi ghara ị na-ewenata ego eji arụrụ ha ihe n'ụlọ makana ọrụ adịghịzị.

4. Mbuli ọnụ ego ngwa ahịa

Ndị na-azụ ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Ohuabunwa kwuru na ọnụ ego ngwa ahịa ga-ada ọnụ na UK makana ọtanisi na-ebute ihe ndị bekee kpọrọ "inflation."

5. Enweghị ọrụ ga-agbagolite

Ọtanisi a ga-eme ka ndị mba UK gbado anya n'inye ndị be ha ọrụ dị adị tupu ha chọwa ndị Afịrịka nwereike ịrụrụ ha ọrụ,

Nke a ga-eme ka ha nye naanị ndị ga-ewulite akụ na ụba ha ọrụ.

Olileanya ọ dị?

Ohuabunwa kwetere na olileanya dị tụmadị n'afọ 2021 makana a na-ele anya iwepụta ọgwụmgbochi coronavirus n'oge ahụ.

Nke a ga-eme ka mba UK na ụfọdụ mba gbakee na ndatu akụ na ụba ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: