"Ọ bụ amara Chukwu ka m ji dị ndụ taa" - Zack Orji

Ebe foto si, realzackorji/Instagram
Omeiheonyonyo a ma ama bụ Zack Orji akọwaala etu Chineke si napụta ya n'ọnụ ọnwụ n'ọnwa ole ma ole gara aga.
Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere ebe ọ gbara ama na awara ya ụbụrụ ugboro abụọ iji zọ ya ndụ.
Cheta na Orji dara kubie na be ya n'ọnwa Disemba afọ 2023 nke pụtara ihe mgbe ihe onyonyo gosiri ya n'ụlọọgwụ n'Abuja malitere ịfegharị na soshal midia.
"E kubiri m ihe karịrị elekere ise tupu mmadụ achọta m" ka ọ gwara onye ntaakụkọ Channels gbara ya ajụjụ ọnụ.
Ọ sị na awara ya isi ugboro abụọ iji wepụta mkpụkọ ọbara dị ya n'ime ụbụrụ ma dụo ya ndụmọdụ ịga mba Briten maka nyocha zuruoke gbasara ụbụrụ ya.
"E nweghi m ike ibili, ọ bụ enyi m abụọ chọtara m buga m ụlọọgwụ gọọmentị dị n'Abuja
Ọ bụkwa Minista ihe gbasara ụmụnwaanyị kpọrọ nwunye m o si Legọs febata Abuja" ka o kwuru.
"A na ma ekele Chineke maka ndụ m taa nakwa ndị ọzọ jikọrọ aka ịhụ na m dị ndụ gụnyere onyeisiala na nwunye ya".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Zack Orji: "Asịrị ọnwụ ya bụ asị" Emeka Rollas Onyeisi ndị AGN

Ebe foto si, Zack Orji Facebook
Asịrị na-efeharị na soshial mịdịa na-asị na onye na eme ịhe onyoyoo na Nollywood bụ Zack Orji anala mmụọ.
Mana nke a Abughị ezịokwu dị ka ndị onye ịsị ndị na ahụ maka ịhe onyoyoo na Naịjịrịa bụ Emeka Rollas sịrị kwụọ.
Emeka Rollas kwuru na Zack Ọrji ka dị ndụ ma katọọ etụ ndị mmadu sịrị abụgharị asịrị na abụghị ezị okwu na sosal mịdịa.
Na ọkwụ ya “Zack Orji ka dị ndụ. Bịkọ unu egena ndị na ebụgharị okwu asị na abụghị ezịokwu na sọsal mịdịa”
“ịhe dị etu a na-egọsị etu ụfọdụ ndị mmadụ sịrị nwee ajọ obi. Anyị a ma nnabata ụdịrị ịhe a”
“Zack Orji ama nwu. Ọ ga adị ndụ rụọlụ chịneke ọrụ”.

Ebe foto si, Zack Orji/Instagram
Na abalị iri abụọ na itoolu nke onwa dịsemba 2023 ka Zack Orji daramba n'ọrịa nke mere e jiri buga ya n’ụlọọgwụ nkuzi ndị ọrụ ahụike n'Abuja.
Mgbe gara aga ka Mịnịsta na ahụ maka ọdịnaala na Naịjirịa bụ Hannatu Musawa kpọrọ oku ka ndị mmadu gbatara Zack Orji ọsọ enyemaka maka ọnọdụ ahụ ịke ya.
Na nke ịkpeazụ a ka ndị mmadu na ekwu na Zack Orji Anwuola mana onyeịsị ndị na eme ịhe onyonyoo bụ Emeka Rollas kwuru na ọ bụ okwu asị, ma katọọ ndị na ebụgharị okwu ahụ na soshịal mịdịa.
Nwa nkenke ihe ịmaghị maka Zack Orji

Ebe foto si, INSTAGRAM/REALZACKORJI
Zack Orji bụ onye ejije Nollywood a ma ama bụ onye ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia.
Ọ gwakwara anyị ihe ụfọdụ ndị ọzọ
Lekwa ihe ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya ebe a:
- Ọ bụ onye na-eme ma na-ahazi ejije Nollywood a ma ama
- Zackee Ama Orji, bụ nwa afọ Igbo mana a mụrụ ya na mba Gabon
- Ọ bụ onye Ngwoo, n'Udi Local Government, n'Enugwu steeti.
- Ọ gara mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.
- Tupu o sonye ndị omee ejije Nollywood ọ rụọla ọrụ na mba Amerịka, Saut Afrịka na mba dị iche iche.
- Asụsụ ndị ọ ma asụ gụnyere Igbo, Fụrenchị na Bekee.
- Ejije o mere ka ọ chakee bụ "Glamour Girls", na "Blood Money" mana o sonyela n'ọtụtụ ihe nkiri ndị ọzọ.
- Ọ bụ onye ụkọchukwu ugbua mana o nweghị ụka nke aka ya.










