Kabaaka onye otu egwu Oriental Brothers anwụọla

Kabaaka onye otu egwu Oriental Brothers anwụọla

Ebe foto si, Kabaaka

Nkọwa foto, Kabaaka onye otu egwu Oriental Brothers anwụọla

Akụkọ na-erute anyị ntị bụ na Kabaaka onyeisi otu egwu Oriental Brothers International Band bụ Godwin Kabaka Opara alaala mmụọ.

Ozi BBC Igbo nwetara n'aka nwa ya nwoke bụ Iheanyi Opara kọwara na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka ọ nwụrụ n'oge ọbara ya gbaliri elu.

Kabaaka onye egwu Oriental Brothers
Nkọwa foto, Oriental brothers: Kabaaka onye egwu otu a anwụọla
Mkparịtaụka Kabaaka na BBC Igbo mgbe ọ ka dị ndụ

Dịka Iheanyi siri kwuo, nna ya anaghị arịa ahụ ọbụla kama ọbara ya gbaliri elu karịa etu o kwesịrị n'ụbọchị Tọzde, o nweghịkwa ụlọọgwụ gọọmenti hibere dị n'obodo ha ma ncha ha nwereike ibuga ya.

O sị na nna ya asizie etu ahụ nwụọ.

Kabaaka bụụrụ onye ọkpọụbọ nakwa ọgụegwu nke otu egwu Oriental Brothers International Band.

Ọ bụ onye Ụmụ Awara, n'Ụmụoye n'Imerienwe dị n'okpuruọchịchị Ngor Ọkpala n'Imo Steeti.

Ndị Igbo jiri otu egwu ya mara ya n'ụwa dum.

Ọ bụ na ngwụcha n'afọ 2023 ka Kabaaka tipụtara egwu ikpeazụ ya ọ kpọrọ 'Abịala M (I am Back)'.

Kabaaka wepụtara egwu ọhụrụ n'afọ 2023

Ebe foto si, Kabaaka Godwin Opara

Nkọwa foto, Kabaaka wepụtara egwu ọhụrụ n'afọ 2023

Nwa nke nke ihe ị kwesịrị ịma maka Kabaaka

  • Kabaaka gara ụlọakwụkwọ Praịmarị n'ụlọakwụkwọ Baptist Primary School dị n'Imerienwe. O mechara gaa ụlọakwụkwọ n'Ọnịcha ma n'Enugwu. Ọ bụ n'ụlọakwụkwọ ya n'Enugwu ka ọ mụtara iti akwụrụngwa egwu.
  • Ka alụchara agha Bịafra, Kabaaka gara Legọọs ebe ọ malitere ịkwụ abọ nke ọma n'ụlọ ezumike otu Maazi Ikediala nke a kpọrọ Easy-Going Hotel ebe ọ na-eti egwu ya.
  • Ọ bụ n'ụlọ ezumike a ka o hibere ndị otu oti egwu a kpọrọ Oriental Brothers.
  • Maazị Godwin Kabaaka Opara bụ ọkpọ ụbọ mana ọ nọ n'afọ iri abụọ malite ya bụ otu otiegwu a.
  • E jiri ọtụtụ egwu mara Oriental Brothers n'oge ahụ. Otu a gakwara mba ụwa niile na-eti ya bụ egwu.
  • Esemokwu wee daa n'etiti ndị otu egwu a mere ha jiri tisaa.
  • Ka ha tisara, Kabaaka wee malitekwa otu egwu ya ọzọ a kpọrọ Kabaaka International Guitar Band nakwa Imo City Band.
  • Kabaaka lụrụ nwunye, mụọ ụmụ ma nwekwa ọtụtụ ụmụnne. Ndị na-eso egwu ya dị ọtụtụ na mba ụwa niile.
  • E jiri aha Kabaaka mara ebe o si - Imerienwe marakwa Imo steeti.
  • Maazị Godwin Kabaaka Opara bụ onye Ụmụ Awara, Ụmụoye, n'Imerienwe dị n'okpuruọchịchị Ngọ Ọkpaala, n'Imo steeti.