Gịnị mere EFCC ji achọ Aisha Achimugu achọ?

Aisha Achimugu malitere iwu ewu na Jenụwarị 2024 oge o merubere emume oriri na ọṅụṅụ nwere abalị asaa oge ọ gbara afọ 50.

Ebe foto si, Aisha Achimugu/Website

Nkọwa foto, Aisha Achimugu malitere iwu ewu na Jenụwarị 2024 oge o merubere emume oriri na ọṅụṅụ nwere abalị asaa oge ọ gbara afọ 50.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwuola na ha na-achọ onyeisi ụlọọrụ Felak Concept Group bụ Aisha Achimugu achọ.

Akwụkwọ ozi EFCC wepụtara n'akara soshal midịa ha ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025, kwuru na ha na achọ Aisha Achimugu maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche.

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Dele Olawale kpọkuru ohanaeze ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ EFCC maọbụ ụlọọrụ ndị uweojii dị ha nso ma ha hụ maọbụ nweta ozi ọbụla ga-enyere ha nwuchie Aisha Achimugu.

Nke na-abịa dịka onye ji aha pati PDP zoo ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 bụ Atiku Abubakar gọnarịrị na ọ bụghị eziokwu na gọọmenti Legọs steeti nyere ya ego iji chụọ nta vootu nke sitere n'aka Aisha Achimugu.

Ụlọọrụ Atiku Abubakar mere ka ọ doo anya na enweghị oge ọbụla Gọvanọ Sanwo-Olu na-achị Legọs steeti nyere ha ego ọbụla.

Ego ahụ bụ nke akụkọ kwuru na ọ bụ ego gọọmenti Legọs steeti.

Tupu EFCC ekwuo na ha na-achọ Aisha Achimugu achọ, akụkọ kwuru na ha akpọọla ya oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọ ha banyere ebubo nrụrụaka e boro ya mana ọ bịaghị.

Akwụkwọ ozi oku ahu nke EFCC degaara ya, gwara ka ọ bịa n'ụlọọrụ ha ụbọchị Wenezde 5 Maachị, 2025.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Onye bụ Aisha Achimugu?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Aisha Achimugu malitere iwu ewu na Jenụwarị 2024 oge o merubere emume oriri na ọṅụṅụ nwere abalị asaa oge ọ gbara afọ 50.

A mụrụ Aisha Achimugu n'ọnwa Jenụwarị 22, 1974.

Mmemme ahụ nwere abalị asaa bụ nke e merubere na Calivigny Island, Silversands dị na Grenada nakwa Abuja isi obodo Naijiria.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gara mmemme ahụ. Akụkọ kwuru na Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na-achị Legọs steeti gara mmemme ahụ na Caribbean Island dị na Grenada.

Aisha Achimugu kọwara onwe ya dịka nwaanyị ji ego achụ ego. Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ Felak Concept Group nke bụ nne ụlọọrụ asatọ na ngalaba dị iche iche dịka Ịnjinịarịn, mmanụ agbidi, mmụta ICT, nakwa ọrụ ndị ọzọ.

Aisha Achimugu bụ onyeisi ụlọọrụ Bluewave Exploration and Production Limited.

Akụkọ kwuru na Achimugu enwetela onyinye na Ihe nrita dị iche iche dịka nwaanyị ji ego achụ ego. Ihe nrita gụnyere FORBES Best of Africa Innovative Leadership Awards nke o ritere n'ọnwa Septemba 2022, Africa Best Quality Oil & Gas Exploration and Production Company of the year (Oceangate Engineering Oil & Gas Limited) nke afọ 2023, National Honors Award- Officer of the Order of the Federal Republic n'afọ 2023, Youth Ambassador for Peace Award nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.