Gọvanọ Edo steeti ekwela nkwa ijide ndị ọzọ soro gbuo ndị ugwu n'Uromi

Ebe foto si, Edo state government / facebook
Gọvanọ Edo steeti bụ Sinetọ Monday Okpebholo agaala Kano steetị ileta ezinaụlọ ndị ugwu e gburu n'Uromi dị na steetị ahụ, ma kwe nkwa na a ga-ejide ndị ọzọ soro kpaa mkpamkpa ahụ na steeti ya.
Gọvanọ Okpebholo kwuru na etu e siri gbuo ndị ahụ bụ ajọ ihe ma kwe nkwa na ya ga-eme ka ezinaụlọ ndị ahụ nakwa ndị e gburu nweta ikpe ziri ezi.
Ọtụtụ n'ime ndị ahụ e gburu si na mpaghara okpuru ọchịchị Bankure dị na Kano steeti.
N'oge Gọvanọ Okpebholo na-ekwu okwu ka ọ sịrị na "anyị emeela ezigbo nnyocha banyere ihe mere. Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na-ewe iwe maka ihe mere ma nyekwa iwu ka ndị ọrụ nchekwa jide ndị kpara mkpamkpa ahụ ma kpee ha ikpe".
Ọ gara n'ihu sị na "e jidere mmadụ iri na anọ (14) n'ime ndị kpara mkpamkpa ahụ.
O kwuru na a ga-akpụga ndị ahụ Abuja.

Ebe foto si, Edo state government / facebook
Ihe Gọvanọ Kano steeti bụ Alhaji Abba Kabir Yusuf na ndị ọzọ kwuru
N'oge Gọvanọ Kano steeti bụ Alhaji Abba Kabir Yusuf nabatara gọvanọ Edo steeti, o kelere ya na mbọ ọ gbara nakwa etu ọ sịrị nye ezinaụlọ e gburu ndị nke ha nkwado.
Yusuf gara n'ihu si na "Gọvanọ Edo steeti kwere nkwa na ya ga-akwado ezinụlọ ndị ahụ e gburu n'Uromi ma gaa n'ihu mezuo nkwa ya".
Ndị ọzọ kwuru okwu n'ebe ahụ gụnyere onye isi ọgbakọ jikọrọ ndị Edo na Kano bụ Fred Akhigbe nakwa onyeisi ndị Arewa n'Edo steeti bụ Badamasi Sally.
Ha abụọ kwuru na ha enweghị nsogbu ọbụla na steetị ha bi.
Ndị uweojii sị ha anwuchiela mmadụ 14 a na-enyo na aka ha dị n'ogbugbu ndị Ugwu na-eme njem n'Edo Steeti

Ebe foto si, Edo State Police Command
Ndị uweojii n'Edo steeti ekwuola na ha anwuchiela mmadụ iri na anọ a na-enyo na aka ha dị n'ogbugbu ndị njem n'ụbọchị Tọzde 27 Maachị, 2025.
A tụrụ ụtụ aka kụgbuo ndị a ma gbaa ha ọkụ n'obodo Uromi nke steeti ahụ maka ebubo na ha bụ ndị ntọrị. A sị na ndị a bụ ndị dinta.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Edo bụ Moses Yamu kwuru na ha anwuchiela ụfọdụ ndị a na-eche kpara arụ a. Ndị uweojii kwuru na ọ bụ mmadụ iri na isiii ka e gburu.
" Dịka a na-eme nnyocha, a nwuchiela mmadụ iri na anọ a na-eche na aka ha dị n'arụ ahụ, a kpọọla oku ka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo nwee nzukọ ma leba anya n'oku ahụ."
Yamu kwuru na e zipụla ndị uweojii ka ha gaa were ọnọndụ n'ebe ihe a mere ka ọgbaghara hapụ ịdapụta.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na nnyocha ka na-aga n'ihu ma dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha dere jụụ,
Etu e si gbuo ma gbaa ndị a ọkụ

Ebe foto si, Screen shot Collage
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ndụ Naịjirịa ọkachasị ndị si mpaghara Ugwu akpọọla oku ka e mee nnyocha banyere ogbugbu e gburu ụfọdụ ndị ugwu na-eme njem n'obodo Uromi nke dị n'Edo Steeti, bụ ndị e gburu ma gbaa ha ọkụ n'ebubo na ha bụ ndị ntọrị.
Onyeisiala Tinubu nyere ndị uweojii iwu ka ha mee nnyocha tara ọchịchị ma hụụ na a nwuchiri ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ ruuru ha.
N'otu aka ahụ, gọvanọ Edo Steeti bụ Monday Okpebholo n'ozi o wepụtara kwuru na ndị a nọ na-eme njem n'ụgbọala ukwu 'truck' mgbe ụfọdụ ndị nchekwa ime obodo n'Uromi kwụsịrị ụgbọala ha, mgbe e nyochara ụgbọala ha,a a hụrụ ọtụtụ egbe n'ime ya, nke mere e jiri malite ịkụ ha ihe.
Odobeghi anya mmadụ ole ndị a kụrụ ihe ma gbuo mana otu na-ahụ makai kike dịịrị onye na Naịjirịa bụ Amnesty International kwuru na ọ bụ ihe ruru mmadụ iri na isii ka e gburu. Ha katọrọ arụ a ma kpọọ oku ka e mee nnyocha ma nwuchie ndị mere ya.
Ebe ọtụtụ ihe onyonyo gosiri etu e si kụgbuo ma mụnye ndị a ọkụ na-efegharị na soshal midia.
Ndị ole bụ ndị a e gburu?

Ebe foto si, Edo State Government
Akụkọ kwuru na mkpa mkpa kpara n'ụbọchị Tọzde 27 Maachị, 2025 n'obodo Uromi nke Edo Steeti.
E gburu ndị a site n'ịtụ ha ụtụ aka a kpọrọ 'jungle justice' na Bekee, mgbe ụgbọala bu ha na-agbafe n'obodo Uromi ahụ. A sị na ndị a si na Port Harcourt na-aga Kano maka isoro ezinaụlọ ha mee emume mmechi ibu ọnụ nke ndị okpukperechi Alakụba.
Ozi Onyeisiala Tinubu wepụtara kwuru na ndị a bụ ndị 'dinta na-eme njem' na-aga na mpaghara ugwu.
Ka ụgbọala ha rutere n'obodo Uromi, ndị ọrụ nchekwa ọdịnala na ndị mmadụ bi n'obodo ahụ jidere ha sị na ha bụ ndị ntọrị. A malitere iti ha ihe ma mụnye ha okụ.
Gọvanọ Edo Steeti kwuru na ha anwuchiela ihe karịrị mmadụ anọ aka ha dị n'ogbugbu a.
Ọtụtụ ndị ndu na Naịjirịa ọkachasị na mpaghara Ugwu gụnyere Atiku Abubakar, Rabiu Kwankwaso, Peter Obi akatọọla ogbugbu e gburu ndị ma rịọ ka e mee nnyocha iji nwuchie ndị mere nke a.
N'otu aka ahụ ndị Gọvanọ mpaghara Ugwu akatọkwala arụ a ma kpọọ oku ka e mee ezi nnyocha banyere ya.
Onyeisi otu ha bụ Gọvanọ Gombe Steeti, Muhammad Inuwa Yahaya kwuru na nke a bụ mwakpo nye 'ikike dịịrị onye'.
Ha gara n'ihu tie ezinaụlọ ndị a e gburu aka n'obi.









