Etu akwamozu na oliliozu Humphery Nwosu si gaa n'obodo Ajalli dị n'Anambra Steeti

Aha onyonyo, Etu e si kwaa ozu Ọkammụta Humphrey Nwosu bụbu onyeisi NEC na Naịjirịa
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Mmemme olili ozu Ọkammụta Humphery Nwosu kpọtụrụ ụbọchị Fraịde 28 Maachị, 2025 n'obodo ya Ajalli dị n'okpuruọchịchị Orumba Nọt dị n'Anambra steeti.

Nchọpụta BBC Igbo mere ka a mata na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu sonyere n'ụka ikpeazụ a kara ya n'ụlọụka St Marks Anglican Church Ajali.

Ndị anyị hụrụ bịara ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ gụnyere Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra steeti, Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia steeti, mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi, Emeka Ihedioha chibụru Imo steeti, ndị eze ọdịnala na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu sonyere n'ụka ikpeazụ a kara ya n'ụlọụka St Marks Anglican Church Ajali.
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu sonyere n'ụka ikpeazụ a kara ya n'ụlọụka St Marks Anglican Church Ajali.
E liri Ọkammụta Humphery Nwosu n'ụlọ ya dị n'Ajali Anambra steeti
Nkọwa foto, E liri Ọkammụta Humphery Nwosu n'ụlọ ya dị n'Ajali Anambra steeti

Tupu ọ laa mmụọ, Humphery Nwosu bụ ọnye nkuzi na mahadum University of Nigeria Nsukka(UNN) n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị (political Science) tupu ọ za oku ịrụ ọrụ ịgbara ọha odibo.

Mgbe ndị chiri echichi Knight na-akwanyere Nwosu ugwu ikpeazụ

Ọ bụ ya bụ onye haziri ntuliaka 'Juun 12' afọ 1993 na-ewu ewu nke bupụtara MKO Abiola.Na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ mere, ọ kọwara etu o si gbaa isi akwara ịhazi ntuliaka ma jụ ime ihe ndịisi agha na-achị oge ahụ bụ 'National Defence and Security Council' manyere ya ime na ntuliaka ahụ.

Humphery Nwosu nwụrụ ụbọch Sọnde 20 Ọktoba, 2024 na Virginia steeti dị na mba Amerịka ka ọ gbara afọ 83.

E liri Ọkammụta Nwosu n'ime ụlọ ya dịka o si nye n'iwu.
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu bịara olili ya.

Humphrey Nwosu: Nwodo, Umeh, Uwazurike Obioha agbarụọla ihu maka Ọjụjụ sineti inye 'dike ọchịchị onye kwuoucheya nkwanye ugwu pụrụiche

Ọkammụta Humphrey Nwosu, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa.

Ebe foto si, Humphrey Nwosu/Facebook

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'ọkwu n'Ọwụwa Anyanwụ agbarụọla ihu etu ụfọdụ ndị omeiwu n' Ụlọimeuwu Ukwu si kpụpụ n'ụsọ oku nke ụfọdụ ndị ogbo ha sị Ọwụwa Anyanwụ kpọrọ ka e nye Ọkammụta Humprey Nwosu lara mmụọ ugwu pụrụ iche maka ike ọ kpara n'íhazi ntuliaka Juun 12, afọ nke MKO Abiola meriri.

Ụbọchị Wenezde ụlọọmeiwu dere jiji dịka ụfọdụ ndị omeiwu jụrụ ịnabata oku Senatọ na-anọchite anya Abia -South bụ Enyinnaya Abaribe kpalitere alo ka a kwanyere Nwosu ugwu n'ụzọ pụrụ iche site n'ịgụgharị isiụlọrụ Inec aha ya iji cheta mbọ ọ gbara maka ọchịchị onyekwuoucheya.

Mana Osote Onyeisi Uloomeiwu Ukwu bụ onye n'isioche ọgbakọ ndị omeiwu sineti ụbọchị ahụ, Bamidele, Cyril Fasuyi,Sunday Karimi,Afolabi Salisu nakwa Jimo Ibrahim kponyere aja na garị sị na Nwosu akpọpụatghị mppụtara ntuliaka.

Ọkammụta Nwosu nwụrụ na mba Amerịka n'abalị 20 nke ọnwa Ọktọba afọ 2024 ka ọ gbachara afọ 83 ma bụrụ onye mmemme olili ozu ya ga-akpọtụ n'obodo ya bụ Ajali n'abalị 28 nke ọnwa Maachị afọ 2025.

Ihe ndị ndu Igbo kwuru maka ya bụ okwu

Victor Umeh, Goddy Uwazuruike na Okechukwu Obioha

Ebe foto si, BBC/Obioha

Aka chịbụrụ Enugwu Steeti bụ Okwesilieze Nwodo,onye kwuru na ihe ndị omeiwu Ukwu mere dị " Obi nwutem" na ha mere nwoke haziri ntuliaka kachasị mma,kachasị kwụrụ ọtọ ụdị ihe.

Ọ gara n'ihu jụọ sị, "Kedụ ka anyị ga-esi aja ndị isioche Inec ike " ịkwụba aka ọtọ?"

" Ntuliaka kwụ ọtọ bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ọchịchị onyekwuoucheya, ọ bụrụ na anyị akwanyereghị ndị haziriya nke ọma, ebe ka anyị na-aga?"

Onye bụbụ onyeisi Aka Ikenga bụ alaka Ohaneze Ndigbo bụ Ichie Goddy Ụwazuruike kọwara agwa ndị omeisu kpara n'ijụ ịnaba ịkwanyere Nwosu ugwu agwa "na-ahụ agbọ.

Uwazuruike kwuru sị, "Ọkammuta Humphrey Nwosu haziri ntuliaka kachasị mma na Naijiria. ndịagha taara ya ahụhụ n'iji kwado nkagbu ha kagburu ntuliaka ahụ."

Uwazuruike onye kpokuru ndị omeiwu ka ha lebanye anya n'okwu ahụ ọzọ, rụtụrụ aka na "E nyere ya ajọ aha mana ọ bụ akwụkwọ Babagida deere na nsonso a zọọrọ aha Nwozu."

Okwesilieze Nwodo na Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, Okwesilieze Nwodo/BBC

Onyeisi otu Njiko Igbo bụ Rev Okechukwu Obioha kwụrụ sị, "Ebe a kwanyere MKO Abiola ugwu pụrụ iche ka ọ nwụchara n'ihi ntuliaka ahụ,, kedụ maka onye bụ ya haziri ntuliaka ahụ? bụ Ọkammụta Humphrey Nwosu?"

Omeiwu na-achọchite Anya Anambra-Central bụ Victor Umeh katọrọ ihe ndị ogbo ya mere na mkparịtaụka ya na ụlọntakụkọ Channels nwere.

"Echere m na ọ dịghị mma na kama wito nwoke n'ihe ọma o mere, ha na-akpasa ya ụdị agwa ọbụladị n'ọnwụ."

Dịka e nyeghị ya nkwanye ugwu na ndụ, si nye ya n'ọnwụ - Inec

Mamood Yakubu

Ebe foto si, Inec/Facebook

Ọ bụghị nani ndị ndu ọwụwa Anyanwụ bụ ndị gbarụrụ ihu na e nweghị nkwanye ugwu e nyerela Nwosu.

N'ozi ha wepụtara dịka ha na-akwando maka mmemme olili ozu ya, Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu tụrụ na arịrị na-akwanyeere MKO na Kingibe ugwu pụrụ iche maka ntuliaka 'Juun 12', mana ụlọọrụ ha bụ ndị haziri ya bụ ntuliaka nke Nwosu nọ n'isi ya enweghị ihe o riteree.

Ndị ezinaụlọ Humphrey Nwosu

Ebe foto si, Inec

" Ka a gasị na ọ bụ ntuliaka haziri onwe ya," bú ihe Yakubu kwuru díka ndị ezinaụlọ Nwosu bịara maka mmemme ịkwanyere nna ha ugwu ikpeazụ nke Inec hiwere n.isiụlọọrụ a nsonso a.

" Ọ bụrụ na elegharara anya inye Ọkammuta Nwosu nkwanye ugwu ka ọ dị ndụ, oge ka dị ndị nọ n'ọchịchị inye ya ka ọ nwụchara".

Ihe ndị ị maghị maka Humphrey Nwosu

Ụmụ Humphrey Nwosu na Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/X

Ka ọ dị ugbua, e sila n'ala Bekee bulata ozu dike Igbo ji eme ọnụ bụ Ọkammụta Humphrey Nwosu maka mmemme akwamozu ya.

Lee ihe ụfọdụ ị maghị maka nwoke Igbo ji aha ya eje mba:

  • Ọkammụta Humphrey Nwosu bụbụ Onyeisi ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka n'obodo ya bụ Ajali dị n'Orumba North,Anambrara steeti..
  • Ọ bụ ọnye nkuzi mahadum na mahadum University of Nigeria Nsukka(UNN) n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị (political Science) tupu ọ za oku ịrụ ọrụ ịgbara ọha odibo.
  • Odogwu a bụ ya bụ onye haziri ntuliaka 'Juun 12' afọ 1993 na-ewu ewu nke bupụtara MKO Abiola.Na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ mere, ọ kọwara etu o si gbaa isi akwara ịhazi ntuliaka ma jụ ime ihe ndịisi agha na-achị oge ahụ bụ 'National Defence and Security Council' manyere ya ime na ntuliaka ahụ.
  • Ọ gwara ụlọntakụkọ Sahara Reporter tupu ọ nwụọ sị, "Agwara m ha sị na anyị ekpokobala mpụtara ntuliaka nile, nani mpụtara Taraba steeti ka ọ fọrọ, Anyị abụghị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, hapu anyị ka anyị lụruo ọrụ anyị n'isi ma kpọpụta mpụtara ya. "Ọ bụrụ na ụnụ achọghị ya otu ahụ, ahụ kpoonụ Abiola na Tofa ka a kpaa ya akpa n'ihi na ọ bụ Abiola meriri." "Abacha sịrị m,' Taa kpuchi ọnụ, ị bụ onye iji agwa anyị ihe anyị ga-eme?"