Gọvanọ Fubara a wuchiela n'ọdụgbọelu Ọmagwa, dị na Pọtakọtụ

Ndị nkwado Gọvanọ Fubara ahụghị ya ha ji tụ anya

Ebe foto si, Siminalayi Fubara /X
Ọtụtụ ndị na-akwado gọvano Riva steeti Siminalayi Fubara chekatara ya n'ụbọchi Tọsde 18 Septemba, 2025 ka obata n'isi ụlọọrụ gọọmentị na Pọtakọt mana ha ahụghị ya.
Ufọdụ n'ime ha gbakọrọ ọnụ kemgbe ụtụtụ ruo elekere ise nke mgbede tupu ha laa.
Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji ajụ si, "kedụ ebe Fubara nọ?"
Mana onye bubu Gọvano steeti ahu Nyesom Wike gwara ndị ntaakụkọ na ọ bughị iwu na Fubara ga-ebido ọrụ ozugbo.
Ndị ụlọomeiwu na Riva steeti ebidola ọrụ n'ụbọchị Tọzde. Dịka ha nwechara nzukọ ha, ha kpọrọ okwu ka Gọvanọ Fubara gaa n'ihu wetara ha aha ndị ọ chọrọ itinye na-ọrụ dịka kọmishọna ka ha mee nnyocha.

Ndị bi na Riva steeti awuchiela n'okporo ụzọ Pọtharcọt igosi obi ụtọ ha maka nlọghachi Gọvanọ Siminalayi Fubara dịka omechara ọnwa isii nke onyeisiala Tinubu kwusịtụrụ ya ọrụ maka nsogbu dị n'etiti ya na ndị ụlọomeiwu na steeti ahụ.

Ka ọ dị ụgbu a, ndị mmadụ agbakọrọ n'okporoụzọ UTC na ndị ọzọ ama ama iji chere mgbe ọ ga-agbafe.
Otụtụ ndị mmadụ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ si na obi dị ha ụto nke ukwu maka nlaghachiteya dịka ha na-atụ anya na ọ ga-aga n'ihu n'ọrụ ọma ya.
Onye bụ Siminilayi Fubara?
Lee nkenke ihe i kwesịrị ịma maka Gọvanọ Siminilayi Fubara
- A mụrụ ya n'ala Opobo, Riva steetu na 18 Jenụwarị 1975
- Aka ọrụ ya bụ onye ndekọ ego, ma bụrụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
- O ji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa Gọvanọ.
- Ọ batara ọchịchị na Mee 2023, mana ya na Nyesom Wike bụ aka chịburu Rịva Steeti nwere nsogbu ka ọ batara n'ọkwa ọchịchị

Ebe foto si, Tinubu, Fubara / Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu wepụrụ ọchịchị gbatagbata na Rivas steeti ma kpọghachita Gọvanọ Siminalayi Fubara dịka Gọvanọ steeti n'ụbọchị Wednezde 17 Septemba 2025, dịka o si mba ofesi lọta, ebe ọ gara ezumike.
Tinubu mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara ma nye nkọwa banyere ọnọdụ ọchịchị gbatagbata na steeti ahụ ma kwuo ụbọchị Gọvanọ Siminalayi Fubara, osote ya bụ Ngozi Nma Odu na ndị omeiwu ga- ebido ọrụ ha n'ụbọchị Tọzde 18 Septemba, 2025.
Etu o si dị na mbụ, bụ na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu manyere ọchịchị gbatagbata na Rịvas steeti na Maachi 18, 2025 nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ọnọdụ ahụ.
Onyeisiala Tinubu manyere ọnọdụ ahụ maka esemokwu dị n'etiti Rivas steeti kpụrụ afọ n'ala maka na ndị omeiwu nakwa gọvanọ adịghị arụkọ"
Akwụkwọ ozi Onyeisiala Tinubu wepụtara n'ụbọchị Wenezde 17 Septemba, 2025 mere kelere ndị niile ọnụ na-eru n'okwu na Riva steeti ma kpọọ oku ka Gọvanọ Fubara na ndị omeiwu steeti ahụ rụọ ọrụ ma kwalite udo zuruoke na steeti ahụ.
Rịva steeti eweela SSG ọhụrụ dịka George Nwaeke bụbu onyeisi ndị ọrụ gbara arụkwaghịm

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X na Vice Admiral Ibok-Ete Ibas/screengrab
Aka na-achị Rịva Steeti dịka onye nlekọta bụ Vice Admiral Ibok-Ete Ibas, enyela ọka mmụta Ibibia Worika ọrụ odeakwụkwọ steeti ahụ a na-akpọ 'SSG' na nkenke.
Ibok-Ete Ibas kwuru na SSG ọhụrụ ahụ ga-ebido ọrụ ya ozugbo ozugbo n'egbughị oge.
Ibas nyekwere onye ọzọ aha ya bụ Iyingi Brown ọrụ onyeisi ndị ọrụ nke nchere oge dịka onye nọ n'ọkwa ahụ bụ George Nwaeke gbara arụkwaghịm.
Aka na-achị Rịvas kenere George Nwaeke ma kpeere ya ekpere ọganiru n'ihe ndịọzọ ọ ga-eme n'ọdụ n'iru.
Ihe megoro kemgbe ụlọ omeiwu kwadoro ị wezuga Gọvanọ Rịvas steeti bụ Sim Fubara n'ọkwa

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Siminalayi Fubara/Bola Tinubu/Wole Soyinka/Facebook
Kemgbe Tuzde, Maachi 18, 2018 Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu nyere iwu wepụrụ Gọvanọ Rịvas Steeti bụ Sim Fubara n'ọkwa ma nwere onye bụbu onye agha Naịjirịa aha ya bụ Ibok-Ete Ibas tinye dịka onye nlekọta steeti ahụ; ọtụtụ ihe emeela.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu tinyere ọnụ n'ọdọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Rivas steeti nakwa etu o si metụta Naịjirịa niile.
Mmadụ dịka Peter Obi na Atiku Abubarkar so na ndị mbụ katọrọ amụmụ ị wepụ Gọvanọ n'ọkwa maka na a manyere ọchịchị gbatagbata na steeti ahụ.
Ndị ọzọ tinyere ọnụ mgbe ụlọ omeiwu kwadoro ihe Onyeisiala mere gunyere onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan, ndị Gọvanọ dị icheiche ma odeakwụkwọ a maama bụ Woke Soyinka dgz.
Ihe ọhụrụ megoro kemgbe ahụ

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook
Ndị Gọvanọ nọ na Patị PDP gunyere Adamawa, Bauchi, Bayelsa, Enugwu, Osun, Plateau, na Zamfara steeti ga-agba akwụkwọ n'ụlọikpe maka ị wezuga Sim Fubara n'ọkwa dika Gọvanọ Rịvas steeti.
Ndị Gọvanọ ahụ na-achọ ka ụlọikpe dị elu nwee mkpebị gbasara ngaraba 305 iwu Naịjirịa nke 1999. Ha chọrọ ịmara na o nyere Onyeisiala ikike ịwezuga maọbụ ịwepụ Gọvavọ na ndị omeiwu na steeti ọkachasị ndị si na ntulịaka banye n'ọkwa.
Ha chọrọ ịmara na Onyeisiala enwere ikike ịnye onye nlekọta ikike ka ọ na-achị Rịvas steeti n'oge ọ manyere ochịchị gbatagbata na steeti ahụ.
Gọvanọ atọ si na mpaghara Saụt – Saụt katọkwara ịmanye ọchịchị gbatagbata na Rịvas steeti.
Gọvanọ Duoye Diri nke Bayelsa Steeti bụ onyeisi oche otu jikọrọ ndị Gọvanọ Saụt-Saụt kwuru na "ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Rịvas steeti erubeghị nke ị manye ọchịchị gbatagbata nakwa dịka ọ dị na ngaraba 305(3) n'akwụkwọ iwu Naịjirịa nke afọ 1999".
Mana Gọvanọ nke Edo steeti na Rịvas Steeti sị na ha kwadoro ihe Onyeisiala Tinubu mere bụ ị wezuga Gọvanọ Sim Fubara n'oche nwa nkenke oge.
Mana otu na-akwado ikike dịara mmadụ bụ Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) kwuru na ha agbaala Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu akwụkwọ n'ụlọikpe dị elu n'Abuja maka "ị wezuga maọbụ ịwepụ Gọvanọ, Osote Gọvanọ na ndị omeiwu n'oche" dịka o mere na Rịvas Steeti.
Ihe Goodluck Jonathan na Wole Soyinka kwuru

Ebe foto si, Goodluck Jonathan / Wole Soyinka/ Facebook
Goodluck Jonathan bụbu Onyeisiala Naịjirịa kwuru na ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị na Rịvas steeti na-emebi aha Naịjirịa.
Jonathan kwuru na "ndị nọ n'ochichi na Naịjirịa maara ihe dị mm ana nke na-adịghị mma mana ha maama na-eme ihe ha na-eme".
Ọ kọwara ihe mere dịka "ị mebị ikike mmadụ were n'ọchịchị, ị metọ ngaraba ọchịchị na Naịjirịa".
N'okwu nke a, ode akwụkwọ a maama bụ Wole Soyinka kọwara ihe Onyeisiala Naịjirịa mere dịka "aka ike'.
Soyinka sị na-etu Onyeisiala siri kpachie usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na Rịvas steeti adịghị mma ma kwuo na "Onyeisiala kwesiri ime ihe o mere n'ụzọ ka mma".
O gara n'ihu kwuo na ya kwenyere na ndị o metụtara ga-enwega okwu ahụ n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa .
Ndị Sịneti akwadola ọnọdụ gbata gbata Onyeisiala Tinubu tinyere na Rivas Steeti

Ebe foto si, Akpabio, Tinubu, Fubara
Ndị Sịnetị akwadola ọnọdụ gbata gbata Onyeisiala Tinubu tinyere na Rivas Steeti.
Ndị omeiwu Sịnetị akwadola ọnọdụ gbata gbata Onyeisiala Bola Tinubu tinyere na Rivas Steetị nke gbagidere ụkwụ n'ikike onyeisiala nwere dịka iwu nke afọ 1999.
Nkwado a ha nyere Onyeisiala kwuru na ọ ga-ewere ma manye ọchịchị na steeti ahụ, bụ nke a ga na-atụle n'oge ọbụla mana ọ gaghị akarị ọnwa isii.
Dịka iwu a si kwuo, ndị omeiwu ga-ehiwe kọmitii ga ana-eme iwu ma na-eleba anya etu ọchịchị si aga na Rivas Steeti.
Ọzọ kwa bụ na a ga-ehiwe ndị kọmitii gụnyere ndị Naịjirịa ọnụ na-eru n'okwu ka ha kpaa nkata maka etu a ga-esi weta udo na Rivas Steeti.
Nke a na-abịa dịka ndị ụlọomeiwu nta nwere mkpebi ma kwadoo ọnọdụ gbata gbata Onyeisiala Bola Tinubu tinyere .

Ebe foto si, House of Representatives/Facebook
Nke a na-abịa n'ime ụbọchị abụọ Onyeisiala Tinubu kwupụtara nke a ma kwụsị Gọvanọ Simi Fubara nke Rivas Steeti, osote ya na ndị omeiwu steeti ahụ ọrụ n'ihi esemokwu dị n'etiti ha.
Ndị omeiwu narị abụọ na iri anọ na atọ gara n'ọgbakọ ebe ha kwadoro ya.
Mana ndị omeiwu gara n'ihu tinye ụfọdụ ihe iji hazitu ọnọdụ ahụ, nke gụnyere;
Na onyeisiala Bola Tinubu agaghị e ji aka ya kwadoo iwu ọbụla a chọrọ ime na steeti kama na ọ bụ ndị omeiwu Naịjirịa ga-enwe ikike ime iwu banyere ọchịchị dịka iwu Naịjirịa ngalaba (section 4, sub-section 11) nke afọ 1999 si kwuo.
Ha gara n'ihu kpebie na Onyeisiala nwereike iwepụ ọnọdụ ahụ n'oge na-adịghị anya na-echeghi ka ọnwa isii ahụ o nyere gachaa.
Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Onyeisiala ịkwụsịtụ Gọvanọ na ndị omeiwu steeti ọrụ?

Ebe foto si, Bola Tinubu na Siminalayi Fubara / X
Kemgbe Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu manyere ọchịchị gbatagbata na Rịvas steeti n'abalị garaaga, ọtụtụ ndị mmadụ na-aju ajuju banyere ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ọnọdụ ahụ.
Ndị ọzọ na-aju ajụjụ sị kedụ "ngaraba iwu Naịjirịa kwadoro Onyeisiala ịkwụsịtụ Gọvanọ na ndị omeiwu ọrụ?" dịka ọ dị ugbua na Rịvas steeti.
Mazi Afam Osigwe bụ onyeisi otu jikoro ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ Nigerian Bar Association (NBA) zara ajuju a n'akara X soshal mịdịa ya.
N'okwu Afam Osigwe "Onyeisiala ị manye ọchịchị gbatagbata abụghị ihe na-adị ire ngwangwa a manyere ya. Ọ bụ ihe ndị omeiwu ga-atule ma mee ka ọ dị ire n'ime oge iwu Naịjirịa kwadoro".
"NBA kwuru na naanị ihe ga-eme ka ị manye ọchịchị gbatagbata Onyeisiala Naịjirịa manyere dị ire bụ ma ọ bụrụ na ụlọ omeiwu Naịjirịa kwadoro ka a manye ya. E wepụ ụlọomeiwu Naịjirịa ịkwado ya, mara na onweghị isi, ọzọ bụ na ọ gaghị akwụdo dịka iwu".
NBA gara n'uhu kwuo na:
- Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu enweghị iwu kwadoro ya ị wepụ gọvanọ sitere na ntuliaka banye n'ọkwa ọchịchị mgbe ọ manyere ọchịchị gbatagbata.
- Ị wepụ ndị si na ntuliaka banye n'ọkwa ochichi adịghị n'iwu Naịjirịa. Ọ megidere ngaraba iwu kwadoro ikeke gọọmenti steeti were.
- NBA ji ohere ahụ kpọọ ụlọomeiwu Naịjirịa ka ha hara ịkwado ịkwụsịtụ gọvanọ Siminalayi Fubara na ndị omeiwu Rịvas ọrụ. Ị kwado ọchịchị gbatagbata bụ ihe a kwesiri ime n'usoro iwu Naịjirịa.
Gịnị bụ ọchịchị gbatagbata?

Ebe foto si, Bola Tinubu / x
Ọchịchị gbatagbata nke ndị bekee kpọrọ 'state of emergency rule" bụ ọnọdụ ọchịchị nke n'ewezuga iwu obodo n'akụkụ ma jiri ike aka n'achị obodo.
Onye ọkaiwu maara ihe ekwe na-akụ na ngaraba iwu obodo bụ Ọkaiwu Chijioke Agbo bụ onye nkuzi na mahadum n'Enugwu steeti kọwara ihe dị icheiche banyere ọchịchị gbatagbata.
Agbo si na "n'oge ọchịchị gbatagbata "ihe Onyeisiala kwesiri ime bụ ị zịga ndịagha na mpaghara ahụ. Mee ka ha na-echekwa mpaghara ahụ. Gbochie ndị mmadụ maọbụ onye ọbụla ga-ewete ọgbaaghara".
"Ndịagha wereike ijide onye ọbụla gbochie ha n'ụlọ nga. Onye kwuo ihe ga-ebute ọgbaaghara, ha wereike ijide onye ahụ na-ejighị akwụkwọ ikike si ụlọikpe".
Chijioke Agbo kwuru na ihe na-eme n'oge a tinyere ọchịchị gbatagbata gunyere "ịwezuga iwu na-achị obodo nakwa ọtụtụ ikike dịaara mmadụ".
"Ọ bụ ị wezuga ikike dịaara mmadụ nakwa ị wezuga iwu obodo n'oge ọchịchị gbatagbata bụ ihe dị iche n'ọchịchị onye kwuo uche ya na nke gbatagbata".
Etu ọchịchị gbatagbata si bido na Naịjirịa
Chijioke Agbo kwuru na ọ bụ n'afọ 1962 bụ oge mbụ a manyere ọchịchị gbatagbata na mpaghara ọdịda anyanwụ maka ọgbaaghara na-eme n'ụlọomeiwu ha.
N'oge ahụ, Praịm mịnịsta Naịjirịa bụ Tafawa Belewa manyere ọchịchị gbatagbata nke mbụ ahụ.
Onye ọzọ manyere ọchịchị gbatagbat bụ Onyeisiala Olusegun Obasanjo na Plateau Steeti maka ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọkpụkpere chi chraịst na ndị alakụba nke mere o jiri kwụsịtụ ma Gọvanọ ma ndị omeiwu na steeti ahụ ọrụ.
Mana n'afọ 2013 ka Onyeisiala n'oge ahụ bụ Goodluck Jonathan manyere ọchịchị gbatagbata na Borno, Yobe, and Adamawa steeti maka ibuso ndị na-enyi ọha egwu bu Boko Haram agha.
Ọkaiwu Chijioke Agbo kwuru na "Goodluck Jonathan n'oge ahụ enweghị gọvanọ maọbụ ndị omeiwu ọ kwụsịtụrụ ọrụ".

Ebe foto si, Siminalayi Fubara / X
Kedụ iwu Naịjirịa kwadoro Onyeisiala ị kwụsịtụ Gọvanọ na ndị omeiwu ọrụ?
Ọkaiwu Chijioke Agbo kwuru na ọchịchị gbatagbata nke nyere Onyeisiala ikike ị wepụ gọvanọ na ndị banyere n'ọkwa ọchịchị adịghị na iwu Naịjirịa nke 1999.
Mana Chijioke kwuru na ọ bụ na iwu 1960 – 1963 nke Naịjirịa bụ ebe iwu Naịjirịa nyere Onyeisiala udiri ikike ahụ.
O kwuru n'oge ahụ, akwụkwọ iwu Naịjirịa mere ka o doo anya na Onyeisiala ga-ewepụ gọvanọ ma tinye onye nlekọta a na-akpọ "sole administrator".
"Mana n'akwụkwọ Iwu Naịjirịa nke 1999, enweghị ebe o nyere Onyeisiala iwu ị wepụ onye ọbụla si na ntụlịaka banye n'ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ maọbụ ụlọomeiwu".
"Amaghị m ebe Onyeisila Tinubu si weta ikike o jiri kwụsịtụ gọvanọ Fubara na ndị Omeiwu ọrụ".
Ihe Peter Obi na Atiku Abubakar kwuru
Onye ji out patị Labour were zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi katọrọ amụma ị manye ọchịchị gbatagbata na Riva steeti.
N'okwu ya "ihe bụ ihe na-adịghị n'iwu, nke a megidere usuro ọchịchị dị n'iwu obodo ma bụrụ ihe ị cheakamgba n'ọchịchị onye kwuo uche ya".
Atiku Abubakar boro Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubuna gọọmenti ya ebubo sị na "aka ha dị n'ọgbaaghara na-eme na Riva Steeti"
Atiku sị na udo onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Umaru Yar'Adua wetere na mpaghara Naịja Delta bụ he e mebiri n'ọchịchị Tinubu ma katọọ ị manye ọchịchị gbatagbata na steeti ahụ dịka "ihe megidere ọchịchị onye kwuo uche ya".
Ihe Gọvanọ Rivas steeti bụ Sim Fubara kwuru
Ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwuputara amụmụ ị manye ọchịchị gbatagbata nakwa ị kwụsịtụ gọvanọ na ndiomeiwu ọrụ na Rịvas steeti, gọvanọ steeti ahụ bụ Sim Fubara kpọrọ oku ka onye ọbụla nọrọ juu.
Fubara kwuru na kemgbe ya banyere n'ọkwa dịka gọvanọ na ihe niile ya mere dị n'iwu nakwa akwụkwọ iwu ọ ṅụrụ ịyị na ya.
Ọ sị "dịka anyị na-enwe ọgbaaghara na ya dị njikere ị chekwa iwu na ị me ka nchekwa ndị steeti ahụ bụrụ isi sekpụntị".
Gịnị ga-eme ugbua Onyeisiala kwuputara ọnọdụ gbatagbata na Riva steeti?

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuputala ọnọdụ gbatagbata na Riva steeti n'ihi nsogbu na ọgbaaghara na-akpọtụ na steeti ahụ na nso nso a.
Tinubu kwuputara ọnọdụ ahụ na mgbasaozi o mere n'ụbọchị Tuzde 18 Maachị 2025 bụ nke o jiri gwa ọhanaeze okwu.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ na-ewute ya na nsogbu dị na Riva steeti ka na-aga n'ihu n'agbanyeghị ụkwụ ọ zọbatara iji gboo nsogbu ahụ.
Nkwuputa ọnọdụ gbatagbata ahụ bụ nke onyeisiala mere site n'ịgbakwasa ụkwụ na mpaghara 305(5) nke iwu Naịjirịa e mere n'afọ 1999.
Onyeisiala nyere iwu ka Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Prof. Ngozi Odu kwụsịtụ ọrụ ruo ọnwa isii.
Ọ gakwara n'ihu kwụsị ndị omeiwu nke ụlọ omeiwu steeti ahụ ọrụ ruo ọnwa isii.
Onyeisiala kwuru na obi adịghị ya ụtọ na aka na-achị Riva steeti gara bibie ụlọ omeiwu kemgbe ọnwa iri na asatọ ma jụ iwugharị ya ruo ugbua.
"Steeti ahụ nọ n'ọnọdụ agaghị n'ihu alaghị azụ kemgbe ọgbaaghara ahụ malitere, bụ nke mere ụmụafọ Riva steeti anaghị ahụta uru ọchịchị onye kwuo uche ya.
"O doro onye niile anya na gọvanọ Riva steeti bibiri ụlọ omeiwu steeti ahụ kemgbe afọ 2023 ma ruo ugbua, ọ rụgharịbeghị ya," ka Onyeisiala Tinubu kwuru.
O kwuru na e nweghị onyeisiala ṅụjuru mmiri ara afọ ga-anọrọ otu ebe na-ele ka ọnọdụ ọjọọ ahụ na-aga n'ihu ma ghara ime ihe ọbụla dị n'okpuru iwu iji leba anya na ya.
Onyeisiala sịrị na ya eleela ka ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị siri dobe ihu na Riva steeti ma hụkwa na gọvanọ ha na osote ya agbabeghị mbọ ịbịa kpọtụrụ ya, bụ nke mere o jiri mee nkwuputa ahụ dịka ọ dị na mpaghara 305(5) n'usoro iwu Naịjirịa nke afọ 1999 e megharịrị.
"Site na nkwuputa a, Gọvanọ Riva steeti bụ Maazị Siminalayi Fubara, osote ya bụ Odoziakụ Ngozi Odu nakwa ndị niile a họpụtara dịka ndị omeiwu Riva steeti ga-esite taa kwụsịtụ ọrụ ruo ọnwa isii, na mmalite," ka Tinubu nyere iwu.
Onye ga-eburu oche ọchịchị ugbua na Riva steeti?
Dịka Onyeisiala Tinubu siri kwuo, Vice Admiral Ibok-Ete Ibas (Rtd) ga-eburu oche dịka onye ga-achị Riva steeti mana ọ gbakwunyere na ọnọdụ ahụ emetụtaghị ngalaba ikpe ziri ezi.
"Ka ọ dị ugbua, ana m ahọpụta Vice Admiral Ibok-Ete Ibas (Rtd) dịka onyeisi ọchịchị ga-elekọta Riva steeti maka ọdịmma ụmụafọ ha.
"Iji wezuga ihe mgbagwojuanya, nhọpụta ya agaghị emetụta ngalaba ikpe ziri ezi na Riva steeti," ka Tinubu kwuru.
Dịka onyeisiala siri kwuo, onyeisi ọchịchị ọhụrụ ahụ agaghị emebe iwu ọhụrụ mana ọ pụrụ ịrọpụta usoro dị iche iche bụ nke otu kansụl na-achị Naịjirịa ga-akwado maka steeti ahụ.









