Rịvas Steetị: lee usoro e ji ewepụ Gọvanọ n'ọkwa dịka iwu Naịjirịa si kwado

Sim Fubara na Nyesom Wike

Ebe foto si, Nyesom Wike / X

Nkọwa foto, Sim Fubara na Nyesom Wike
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Kemgbe ihe ruru otu afọ ka Riva steetị na-akpọtụ akpọtụ maka ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti ahụ.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Siminialayi Fubara na mmadụ iri abụọ na isii bụ ndị omeiwu na-enwe nghọtahie.

Ndị omeiwu mmadụ 26 ahụ bụ ndị na-akwado Nyesom Wike chịburu steetị ahụ ma bụrụkwa minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa bụ Abuja ugbua.

Na mbụ, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu kpọrọ Nyesom Wike na Sim Fubara oku n'Abuja bụ ebe ha nọ nwee nkwekọrịta maka udo.

Mana etu ọnọdụ si dị ugbua, nkwekọrịta Wike na Fubara were n'ihu Onyeisiala Tinubu dịka ọmịtaghị ezi mkpụrụ nke mere ndị omeiwu jiri malite usoro iwepụ Sim Fubara n'ọkwa dịka gọvanọ Riva steeti ma boo ya ebubo.

Ebubo ndi omeiwu ji chọọ iwepụ Sim Fubara n'ọkwa

N'ihe ndị omeiwu mmadụ 26 ahụ kwuru na ọ bụ maka ya ka ha jiri chọọ ka Gọvanọ Sim Fubara pụọ n'ọkwa gụnyere:

  • Imefu ego Riva steeti n'usoro adịghị n'iwu
  • Igbochi ụlọ omeiwu Riva steeti bụ ngalaba gọọmenti ọzọ ịrụ ọrụ ha.
  • Inye ndị mmadụ ọrụ na-ekweghị ka ụlọ omeiwu Riva steeti nyochaa ha maọbụ nabata ndị o nyere ọrụ.
  • Ijide ụgwọọnwa na ego ndị ụlọ omeiwu na Riva steeti.
  • Ijide ụgwọọnwa ọgaa ozi ụlọ omeiwu Riva Steeti bụ Emeka Amad
  • Dgz

Usoro e ji ewepụ gọvanọ n'ọkwa ọchịchị - omeiwu, Chima Obieze

Omeiwu na-anọchịta anya Ezeagu n'ụlọ omeiwu n'Enugwu steeti bụ, Chima Obieze

Ebe foto si, Chima Obi / Facebook

Nkọwa foto, Omeiwu, Chima Obieze

Onye Omeiwu na-anọchite anya Gọọmenti okpuru ọchịchị Ezeagu n'ụlọ Omeiwu Enugwu steeti bụ Chioma Obieze tinyere ọnụ n'usoro e si ewepụ Gọvanọ dịka iwu Naịjirị si kwadoo.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'okwu Chioma Obieze, "ụsoro iwepụ gọvanọ dị na mpaghara 188, iwu Naịjirịa nke afọ 1999".

"Usoro ahụ na-ebido n'oge ndị Omeiwu ọkara atọ n'ime anọ dere akwụkwọ ebubo megide Gọvanọ ha chọrọ iwepụ. Ọ ga-abụ ebubo imetọ ikike dịịrị ụlọọrụ ya".

"Onyeisi ụlọ Omeiwu ga-agba mbọ zigara gọvanọ e boro ebubo n'ime abalị asaa ọ nwetere akwụkwọ mkpesa ebubo ahụ ndị Omeiwu boro ya ma binyeaka na ya".

"Gọvanọ ahụ ga-enwe ohere ịzara ọnụ ya n'ebube e boro ya. Mana ndị Omeiwu ga-eme ntuliaka ị mara ma a ga-eme nnyochaa maka ebubo ahụ. Ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ọkara atọ n' ime anọ ụlọ omeiwu ahụ kwadoo ime nnyocha maka ebubo ahụ, n'oge ahụ ka onyeisi ụlọ Omeiwu ga-agwa Ọkaikpe steeti ahụ ka ọ guzobe ndị ga-eme nnyocha ebubo ahụ.

Ọ bụrụ na ndị onyeisi ọkaikpe steeti ahụ wepụtara ka ha nyochaa gọvanọ ahụ enweghị ihe ha hụrụ ị ji maa ya ikpe, n'oge a dịka iwu si kwuo atụmatụ iwepụ gọvanọ n'ọkwa ga-akwụsị

Nke a pụtara ma ọ bụrụ na ndị ahụ ọkaikpe steeti wepụtara amaghị gọvanọ ikpe, ya bụ na usoro iwepụ ya n'ọkwá ga-akwụsị, gọvanọ agaghị apụ n'oche, ndị Omeiwu agaghị aga n'ihu n'usoro iwepụ ya".

"Mana ndị Omeiwu nwereike ị ga n'ihu wepụkwa gọvanọ n'ọkwa ọchịchị n'agbanyeghị mkpebi ndị ahụ Ọkaikpe steeti wepụtara ka ha nyochaa Gọvanọ".

"Nke bụ eziokwu bụ bụ na mbido na njedebe usoro iwepụ gọvanọ n'ọkwá ọchịchị dị ndị Omeiwu n'aka mana ụlọikpe nwekwara ọrụ nke ha".

Kemgbe 1999 lee Gọvanọ ndị e wepụrụ n'okwa:

Ndí omeiwu mmadụ iri abụọ na isii na-eso mịnịsta FCT bụ Nyesom Wike

Ebe foto si, RSHA Media

Nkọwa foto, Ndí omeiwu mmadụ iri abụọ na isii na-eso mịnịsta FCT bụ Nyesom Wike

E wepula ọtụtụ Gọvanọ n'ọkwa kemgbe Naịjirịa lọghachitere n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999.

N'ime ndị gọvanọ ahụ, ọtụtụ n'ime ha gara ụlọikpe ma nweta ikpe ziri ezi nke nyeghachiri ha ọchịchị ha.

N'afọ 2005, e wepụrụ Gọvanọ Diepreye Alamieyeseigha chịri Bayelsa steetị

Gọvanọ Diepreye Alamieyeseigha chịrị Bayelsa steeti site n'afọ 1999 ruo afọ 2005.

E wepụrụ ya n'ọchịchị n'abalị Desemba 9, 2005 maka ebubo mpụ, izu ego steetị na imetọ ikike dịịrị ụlọọrụ dịka gọọmenti.

Mana ụlọikpe kpebiri okwu ma nyeghachi ọkwa ya dịka gọvanọ.

Gọvanọ Rashidi Ladoja chiri OYO steetị n'afo 2006:

E wepụrụ Gọvanọ Rashidi Ladoja n'ọkwa n'abalị 12, ọnwa Jenụwarị 2006.

Mana ụlọikpe mkpegharị na ụlọikpe dị elu kpebiri ikpe na Novemba 2006 ma kwuo na usoro e ji wepụ ya n'ọkwa esoghị usoro iwu.

Gọvanọ Peter Obi chịrị ANAMBRA steetị n'afọ 2006

E wepụrụ Peter Obi n'abalị abụọ nke ọnwa Novemba n'afo, 2006. Obi gara ụlọikpe ma nweta ikpe weghachiri ya n'ọkwá.

Gọvanọ Joshua Dariye chịrị PLATEAU, n'afọ 2006:

E wepụrụ Gọvanọ Joshua Dariye n'ọkwá n'ọnwa Novemba, abalị iri na atọ n'afọ 2006.

Ma ụlọikpe mkpegharị na ụlọikpe dị elu kpebiri ka ọ laghachi n'ọkwá ya na Ọnwa Maachị, abalị iri n'afọ 2017.

Gọvanọ Murtala Nyako chịrị Adamawa steeti:

E wepụrụ gọvanọ Murtala Nyako n'ọkwá na Julaị 15, 2014 maka ebubo imetọ ike ọ were dịka gọvanọ.

Ụlọikpe mechara weghachita ya n'ọkwa.