Ị maara Ọkankụzi Humphrey Nwosu lara mmụọ?

Ebe foto si, facebook
Ọkankụzi Humphrey Nwosu rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ National Electoral Commission (NEC) na-ahụ maka ntụliaka site n’afọ 1989 ruo 1993 anwụọla ka ọ gbara afọ 83.
Professor Humphrey Nwosu nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Virginia na mba Amerịka.
Ọchịagha Ibrahim Babangida hopụtara Ọkammụta Nwosu dịka onyeisi ụlọọrụ NEC nke bụzi Independent National Electoral Commission (INEC) ugbua, ka ọ hazie ntụliaka afọ 1993.
Ntụliaka afọ ahụ bụ nke ụfọdụ kọwara dịka nke kachasị kwụrụ ọtọ na Naịjirịa.
Onye bụ Ọkankụzi Humphrey Nwosu?
A mụrụ Ọkankụzi Humphrey Nwosu n'Anambra steeti n’ọnwa Ọktoba 2, 1941. Ọ bụ ọkammụta n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na mahadum University of Nigeria, Nsukka.
Ọkankụzi Humphery Nwosu bụ onye obodo Ajali dị n’kpuru ọchịchị Orumba Nọt, Anambra steeti.
Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna oge Samson Omeruah bụ Gọvanọ Anambra steeti ochie ma nyere aka hụ na ndị eze ọdịnala nwetara ikike ọchịchị ha, rite ụgwọọnwa ma nweta udo n’esemokwu dị n’etiti obodo na ibe ya.
Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisioche kọmitii gọọmenti etiti mepụtara iwu ma hazie usoro ọchịchị okpuru ọchịchị.
N’afọ 1989, a họpụtara ya dịka onyeisioche ụlọọrụ National Electoral Commission (NEC).
N'afọ 2008, Ọkammụta Humphrey Nwosu dere akwụkwọ e be ọ nọ kọwaa na ọbụghị Ọchịagha Babangida abụghị onye nyere iwu ka a kagbuo ntụliaka e mere n'afọ 1993.
Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ akwụkwọ ahụ o dere n'ihi na ọ kọwaghị nke ọma ihe niile mere na ntụliaka ahụ.
Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti kọwara ya dịka oke osisi ndị Ajali ji eme ọnụ ma kwuo na a gaghị echezọ mbụ niile Ọkammụta Nwosu gbara iji nwulite ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa.









