Ọ gịnị butere nghọtahie n'etiti Sinetọ Nwebonyi na Oby Ezekwesili?

Ebe foto si, Oby Ezekwesili/Onyekachi Nwebonyi/ Facebook
Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmụta na Naịjirịa bụ Oby Ezekwesili na Sinetọ Onyekachi Nwebonyi nwere nghọtahie n'ụlọ omeiwu ukwu ụnyaahụ bụ Tuzde 25 Maachị 2025 mgbe Sinet Kọmitii na-ahụ maka omume mmadụ nwere ọgbakọ.
Kọmiti ahụ malitere inwe ọgbakọ maka ebubo mmekọ nwoke na nwanyị nke metụtara Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan nke na-anọchiteanya Kogi Central na onyeisi oche Sineti bụ Godswill Akpabio.
Dịka ihe onyonyo na-efegharị na soshịa midia kemgbe ụnyaahụ siri gosị, esemokwu malitere n'etiti mmadụ abụọ ahụ nke mere ka Sinetọ Nwebonyi bụ onye na-anọchiteanya mpaghara ugwu etiti Ebonyi steeti bụ 'Ebonyi North central', malite ịkparị Ezekwesili n'ọgbakọ ahụ.
Kedụ ihe Sinetọ Nwebonyi kwuru bụ iwe ya?

Ebe foto si, Onyekachi Peter Nwebonyi/Facebook
Mgbe ụlọ mgbasa ozi Channel tv na-agba ya ajụjụ ọnụ, Sinetọ Nwebonyi kwuru na iwe ya bụ na Ezekwesili buru ụzọ kpọọ ya onye nzuzu ma gwa ya ka ọ mechie ọnụ.
Nwebonyi sịrị, "Ọ malitere mgbe a gwara Ezekwesili ka ọ ṅụọ iyi n'ihi na ọ sịrị na ya bụ onye akaebe, mana o kweghị a ṅụọ iyi.
Nwebonyi kwuru na ya tinyere ọnụ sị Ezekwesili na ya dị nkwadobe ṅụọ iyi iji gosị ihe akaebe ya, mana Ezekwesili gwara ya mechie ọnụ ma kpọọ ya onye nzuzu.
O kwuru na agbanyeghị ihe mere, na ya anaghị ata onwe ya ụta, mana ya na-akwanyere Ezekwesili ugwu dịka nwaanyị.
"Olee otu m ga-esi kwaa ụta maka ọnọdụ ahụ? M nyere ya ya. Dịka onye bụbu onye ozi nke gọọmenti etiti na nne nne, jụọ ya ma ọ dị mma ka ọ gwa m okwu otú ahụ? " Nwebonyi kwuru.
Lee ihe Oby Ezekwesili kwuru banyere okwu a

Ebe foto si, Obiageli Oby Ezekwesili/facebook
Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmụta na Naịjirịa bụ Oby Ezekwesili kwuru na ihe mere ụnyaahụ na-egosigharị etu ndị omeiwu si eji usoro iwu Sineti na-agbachi ọnụ ndị mmadụ.
O kwuru na mgbe ụfọdụ, ha sị na anyị kwesịrị imechi igwe okwu, maọbụ ha asị na anyị apụghị ikwu okwu. "Ọ bụ ihe apụghị ikweta ekweta".
"Ọ bụ nkwugharị usoro nke omenala na-ekwu na 'Ọbụna mgbe ị nwere ikike, anyị amataghị ya n'ihi na anyị bụ ndị siri ike," Ezekwesili kwuru.
Onye bụ Sinetọ Nwebonyi?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Sinetọ Peter Onyekachi Nwebonyi bụ sinetọ si Ebonyi steeti. Ọ na-anọchiteanya mpaghara ugwu etiti steeti ahụ bụ 'Ebonyi North central'.
Nke a bụ oge mbụ sinetọ ahụ dị afọ iri anọ na abụọ (42) bụrụ sinetọ dịka o tụrụ ugo na ntuliaka nke afọ 2023 mgbe ọ zọrọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na pati All Progressives Congress (APC).
Nwebonyi bụ onye amara dịka osote onye na nhazi usoro na ndozi ihe n'ụlọ omeiwu Sinetị.
Tupu o nweta ọkwa sinetọ, Nwebonyi bụbu onyeisi oche pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Peoples Democratic Party (PDP) n'Ebonyi steeti malite n'afọ 2015 ruo n'afọ 2019. Mana ọ hapụrụ ya bụ ọkwa nwere banye na pati APC bụ ebe o siri nweta ọkwa o ji ugbua dịka sinetọ.
Ọ bụbu Kọmishọna na-ahụ maka isi obodo n'Ebonyi steeti mgbe David Umahi bụ aka chịburu steeti ahụ, nọ n'ọchịchị.
Mgbe ọ zọrọ ọkwa sinetọ na steeti ya, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si na pati ndị ọzọ boro ya ebubo nrụrụaka vootu ma kpụpụ kwa ya n'ụlọikpe, mana ụlọikpe kwuru na ọ bụ Nwebonyi nwetara mmeli na ntuliaka ahụ.
A mụrụ ya na Mbeke Ishieke n'okpuru ọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadum.
Sinetọ Nwebọnyi bụ onye a maama dịka onye ndu ya na onye na-akwado atụmatụ mmepe obodo.









