Ihe anyị ma maka obodo a sị na ndị na-achị ehi wakporo n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Obinagu Anozalla Affa
Kemgbe akụkọ pụtara na ndi ojiegbe achị ehi wakporo otu obodo n'Enugwu steeti ma tọrọ ụfọdụ mmadụ, BBC Igbo tinyere anya n'ala iji achọpụta nke bụ eziokwu.
Ndị obodo ahụ mkpamkpa a na-akpa kọwara ihe na-eme mana maka egwu ndị ntọ ahụ, ha kwuru na ha achọghị ka anyị kpọọ aha ha.
Ha kwuru na ndị ntọ ahụ e jirila obodo ha mere ebe a na-atọrọ mmadụ kwa mgbe kwa mgbe kemgbe ọnwa Jenuwarị 2025.
Kedụ obodo mkpamkpa a na-akpa?
Obodo a na-ekwu maka ya bụ Obinagu Amozalla Affa dị n'okpuru ọchịchị Udi, n'Enugwu steeti.
N'abalị garaaga bụ Maachị 3, 2025 ka ndị omekome ahụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-achị ehi jiri mma bekasịa otu nwoke.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe nwoke ahụ jụru na ya agaghị eso ndị ntọ ahụ ka ha jiri mma gbukasịa ya ahụ.
"Chukwu mere ebere ka ọ gbalaga n'agbanyeghị mma e jiri bekasịa ya ahụ".
Ọ sị na ebe kacha enwe nsogbu nchekwa ahụ bụ mpaghara ebe a na-akpọ Obinagu Amozolla Affa.
"Nke a bụ maka Obinagu Amozolla Affa dị n'ime ime ma bụrụ ebe a na-ako ugbo".
"Mana ugbu a ihe anyị na-ahụzị na-agbagwoju anya".

Ebe foto si, Obinagu Anozalla Affa
Etu ihe niile si bido
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye ahụ a maama n'obodo ha kwuru na mkpamkpa ahụ bidoro kemgbe ọnwa Febuwarị 2025.
Ọ sị na "anyị chopụtara na ọ bụ ụbọchị Monde ọbụla ka ndị ahụ ji akpa mkpamkpa ahụ. Ọtụtụ ihe megoro eme mere n'ụbọchị Monde".
"N'ọnwa Jenuwarị 2025, e nwere nwoke abụọ aha ha bụ Desmond Nwankwo na Boniface Emehelu. Ha abụọ bi n'ebe Obinagu Amozalla Affa bụ ebe ndị ntọ tọrọ ha abụọ."
"Ha abụọ anọghị otu ebe. Otu onye nọ n'ime ugbo ya, ebe onye nke ọzọ nọ n'ụlọ ya. Mana ndị ntọ ahụ gara tọrọ ha abụọ".
"Mana e mechere tọhapụ ha abụọ na-akwụghị ụgwọ"
N'ọnwa Febuwarị 2025, ha wakporo otu nwoke onye ọrụ nchekwa aha ya bụ Francis. Ọ bụ onye Obinagu mgbe o na-erute ebe anyị na-akpọ nkotonko, n'Eziagu.
"N'ebe ahụ ka ndi ojiegbe achị ehi gbapụtara n'ọhịa nwere tọrọ Francis ma gba egbe n'ụgbọala ya. Mana Francis gbalagara".
"Anyị gara hụ nwoke ahụ ma nụta ihe ya na ndị ojiegbe achị ehi gara. Ọ kọọro anyị".
"N'izuụka garaaga ka ụmụ agbọghọbịa atọ gara ka ha họta mpụrụ cashew mana ndị ojiegbe achị ehi tọọrọ ha".
"Ha mechere tọhapụ otu onye na mmadụ atọ ahụ ma torọ naanị abụọ n'ime ha, ha jidere ha ruo abalị atọ tupuu ezinaụlọ ha aga nye ndị ntọ ahụ ego".
"Mana mgbe nwoke ahụ a tọọrọ ụmụ ya na-enwegara ha ego ka ya na ndị ntọ ahụ na-asụ asụsụ awụsa. Ha naara ya ego, ma tọhapụ nwa ya. Ndị ntọ ahụ gwara nwoke ahụ na onye ọzọ ha ga-atorọ ga-abụ nwoke, na onye ahụ ga-akwụ ha nde naịra iri (N10m) tupuu ha atọhapụ ya".
Ha tọhapụrụ ndị ụmụnwanyị abụọ ahụ n'ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị 2025.
N'ụtụtụ abalị garaaga bụ ụbọchị Mọnde, ka a kpọrọ m n'ekwentị na ndi omekome ahụ awakpoola onye ọzọ.
"A sị na onye nke mbụ ha jidere gbara ọsọ mana n'oge ha jidere onye nke abụọ, o kweghị ka ndị ntọ ahụ tọrọ ya, nke a mere ha jiri were mma bekasịa ya ahụ. Mana Chukwu mere ebere o si n'aka ha gbalaga"

Ebe foto si, Obinagu Amozalla Affa
Etu ọnọdụ a si emetụta ndị obodo anyị
Ebe ndị ntọ a na-atọrọ ndị mmadụ bụ ebe a na-akọ ọrụugbo. Nnukwu ọhịa nakwa mmiri ala dị ebe ahụ.
Ugbu a bụ oge eji akọ ọrụugbo, ndị obodo anyị na-atụ ụjọ, enweghị onye ụjọ kwere ịga ọrụ ugbo ugbu a.
"Anyị niile nọ n'egwu ugbu a".
Mmekọ ndị obodo anyị na ndị na-achị ehi

Ebe foto si, Obinagu Amozalla Affa
Kemgbe ụwa, ndị na-achị ehi na-abịa ma na-esi na be anyị agafe.
Anyị na ha enweghị nsogbu ọbụla.
Ọ na-abụ ha kwụsị, ha arịọ anyị mmiri, anyị na-enye ha mmiri.
"Ọtụtụ n'ime ha na-anaanyị mmanụ nri, ka ha nwere rie ji maọbụ sie nri, anyị na-enyekwa ha".
Ihe ndị uweojii n'Enugwu steeti kwuru
Tupu akụkọ a apụta, BBC Igbo enwetebeghị ozi si na ngalaba mgbasa ozi ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe azabeghị ajuju anyị zigara ya banyere ihe ndị uweojii na-eme maka i jide ndị na-akpa mkpamkpa ahụ.









