"Etu ndị ọchịehi si awakpo, atọrọ ma na-egbusi anyị n'obodo Ukpata dị n'Uzo-Uwani, Enugwu Steeti"

Aha onyonyo, "Etu ndị ọchịehi si awakpo, atọrọ ma na-egbusi anyị n'obodo Ukpata dị n'Uzo-Uwani, Enugwu Steeti"
"Etu ndị ọchịehi si awakpo, atọrọ ma na-egbusi anyị n'obodo Ukpata dị n'Uzo-Uwani, Enugwu Steeti"

Ndị obodo Ukpata dị n'okpuruọchịchị Uzọ-Uwani etiela mkpu akwa maka nwakpo ndị ọchịehi na-awakpo ha n'ụlọ nakwa n'ọrụ ugbo ha.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha kọọrọ BBC Igbo ọtụtụ ihe ha na-agabiga n'aka ndị ọchịehi.

Ha kwuru na ndị ọchịehi na-emebi ihe ha kọrọ n'ugbo ma kpọrọ ehi ha na-ata ọtụtụ ihe ha kọrọ.

Otu onye n'ime ha kwara arịrị na o bitere ego n'ụlọakụ wee kọọ ọtụtụ nri n'ugbo ya mana ihe gbawara ya obi bụ na a kpọrọ ya oku sị na ehi atachaala ihe ọ kọrọ n'ugbo ahụ.

Onye isi-oche gọọmenti okpuru ọchịchị Uzo-Uwani bụ Mazi Chijioke Ezugwu

Ebe foto si, Kingsley A. Onyeji/Facebook na Getty Images

Nkọwa foto, Mazi Chijioke Ezugwu

"Ka m gbatara n'ugbo m, ahụrụ m ehi karịrị otu narị ka ha na-ata akpụ m. Nke tachaa nwanne ya abịa taa.

"Ka m na-ekiri ha, ndị ọchịehi ejiri aka ha na-abọpụta akpụ m kọrọ na-enye ya ehi ha ka ọ taa."

"Ka anyị hụrụ ihe a, anyị ji anya mmiri gbapụ ọsọ, maka na ha hụụ anyị, ha ga-eji egbe gbagbuo anyị."

Onye ọzọ kwuru na ndị Ukpata e gburu egbu na ndị e jiri mma gbukasịa ahụ karịrị akarị.

"Ị bịa n'obodo anyị bụ Ukpata nakwa obodo ndị ọzọ n'Uzo-Uwani, ọtụtụ mmadụ gara ugbo ka a tọọrọ ma nara nnukwu ego tupu a hapụ ha, ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha kwasara iko n'ike ma meruọ ha nnukwu ahụ."

"Ọ dịka gọọmenti Enugwu echefuola anyị bụ ndị Uzọ-Uwani nakwa ụmụnne anyị ndị okpuruọhịchị Isi-ụzọ ".

Anyị etiela mkpụ, mee ngaghariiwe sị gọọmentị nyere anyị aka chụpụ ndị ekperima ahụ n'obodo anyị, mana ha egeghị anyị ntị"

Ihe gọọmenti kwuru maka ọnọdụ Uzo-Uwani

Mazi Chijioke Ezugwu na ndị uweojii

Ebe foto si, Kingsley A. Onyeji/facebook

Nkọwa foto, Mazi Chijioke Ezugwu

Onye isi-oche gọọmenti okpuru ọchịchị Uzo-Uwani bụ Mazi Chijioke Ezugwu gwara BBC na ọgụ ndị Ochị-Ehi na ndị Ọrụ ugbu abụghị naanị na obodo Ukpata ka ọ na-ada, kama na ọ bụ n'Uzo-Uwani niile ka mwakpo ahụ na adapụtakarị.

"Ndị Ọchi-ehi na-awakpokari anyị, ma na Ukpata, Nimbo, Nkpologwu, Abi na ndị ọzọ n'ihi na ala anyị n'emepụta nri gbaṅụụ " Ha na ewere obi ojọọ duru ehi ha baa n'ala ugbo nri ga tachapụ ya"

"Anyi na ha enweela nkwekọrịta dị iche iche nke ha edobeghịị. Nkwekọrịta na-ha ga-akwụ onye ọrụ ugbo ọbụla ehi ha tara akụrụ ubi ya akatankpo ego, mana ha anaghị edobe iwu a.

"Ugbua gọmenti Enugwu nke Peter Mbah nọ n'isi ya ewepụtala atụmatụ "Farm Estate" nke pụtara na gọmentị ga agbachite nnukwu ala ubi n'ụzọ-uwani ma nye ya ndị ọrụ ugbo ka ha kọwa. Mgbachite a ga-eme ka ndi Ọchị-ehi na ehi ha ghara ịbanye n'ala ubi ahụ ọzọ ga-mebie ihe.

Ya bụ atụmatụ "Farm Estate" ga-ewetakwa ezi ndị nche n'obodo maka ọnọdụ gbata gbata ọbụla.

Ọka ikpe Ezugwu yọrọ ndị Ụzọ-Uwani ka ha dere jụụ, makana oge adịghị anya, gọmentị ga-emecha mgbachi ala ahụ nke ha malitegoro ka mgbe afọ gara-aga.

Ngwa ngwa nkea mechara, dika o siri kwuo, ọgụ ndị obodo na ndị ọchụ ehi ga-abụ ihe gara-aga.

Gịnị dị n'Uzo-Uwani mere e ji awakpokaarị ya

Mazi Chijioke Ezugwu

Ebe foto si, Kingsley A. Onyeji/facebook

Nkọwa foto, Mazi Chijioke Ezugwu

Okpuruọchịchị Uzo-Uwani dị n'Enugwu steeti bụ otu n'ime ebe a na-enwe ọgbaaghara n'etiti ndị na-achị ehi nakwa ndị obodo na-akọ ugbo.

N'ime obodo dị iche iche n'Uzo-Uwani ọgụ na-ada n'etiti ndị ọchị-ehi na ndị ọrụ ugbo.

Ụzọ-Uwani bụ okpuruọchịchị kachasị akọpụta nri n'Enugwu. Ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị bụcha ndị ọrụ ugbo na-akọpụta nrị ndị dịka Osikapa, Agwa, Akpụ, Ji, Ede, unere, Ogede nakwa ọtụtụ nri ndị ọzọ.

Mana kamgbe afọ iri na ụma gara aga, Uzọ-Uwani bụzị kwa izuụka ka a na-anụ ihe na-agbawa obi etu ndị ọchịehị si atọọrọ mmadụ.

Ndị ọchịehi na-eji anụmanụ ha mebisie a ihe a kọrọ n'ugbo ma gbuo ọtụtụ ndị nwe ugbo ahụ.

Mgbe ọzọ ndị ọchịehi wakporo Uzo-Uwani

N'afọ 2016 oge Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi na-achị steeti ahụ, ndị ọchị-ehi wakporo obodo Nimbo, Abi dị n'okpuru ọchị Ụzọ Uwani bụ ebe anyị na-ekwu maka ya.

Ha gburu mmadụ karịrị iri na otu nke gunyere otu onye ụkọchukwu, onye nkuzi sekọndiri, ndị ọrụ ugbo nakwa ndị obodo.

Ha wakpokwara obodo ọzọ gunyere Adani, Ugbene Ajima, Adabaa, Ukpata, Nkpologwu na ndị ọzọ.

Mana mgbe ọbụla ya bụ mwakpo kpara, ọtụtụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyi ka ndị ọchị-ehi na-enwere mma bekasịa ahụ.

Etu ọnọdụ a si emetụta ndị ahịa

Isi ụlọọrụ Uzo-Uwani
Nkọwa foto, Isi ụlọọrụ Uzo-Uwani

Otu nwoke n'azụ ahịa nrị na ahịa main market Enugwu kwuru na kata kata na obodo adịgjị mmahụ n'eme n'Ụzọ uwani nakwa isi ụzọ n'ihi nwakpo ndị ọchị-Ehi emela ka ọnụ nrị gbagoo nke ukwuu.

"Mgbe mbụ, a na m aga ahia ime ohịa n'Adani, Ukpata, adabaa na nfị ọzọ ga zụta osikapa, akoụ, garri, tomato na ihe ndị ọzọ, mana ugbua egwu ndị ọchi-Ehi na atọrọ ndị njem gbuo ha ekweghizi anyị ga yabụ ahịa."