Lee etu ikpe Willie Obiano na EFCC si gaa n’ụlọikpe taa

Ebe foto si, Obiano/EFCC/Facebook
Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja agbatịala oge ikpe dị n’etiti aka chiburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano na ụlọọrụ na-ebugha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC).
Ọkaikpe Inyang Ekwo ji ikpe ahụ bugharịrị ya ka ọ bụrụzie n’ụbọchị 13 Maachị 2024 iji nye ndị ọkaiwu Obiano ohere ka ha saa ụlọọrụ EFCC n’akwụkwọ ha gbara megide mkpesa ha dere na ụlọikpe ahụ ekwesighi itinye aka n’ikpe Obiano ikpe.
N’ikpe nke taa, ọkaiwu EFCC bụ Sylvanus Tahir gwara ụlọikpe na o nwenwughi ike inye ọkaiwu obiano ụ Onyechi Ikpeazụ akwụkwọ ha gbara n’oge kwesịrị maka na ọ zuteghi ya n’ụlọọrụ ya n’oge ọ gara ebe ahụ.
N’aka nke ọzọ, ọkaiwu Obiano bụ Patrick Ikweto nọchịtereanya n’ụlọikpe taa kwuru na ọ bụ taa n’ime ụlọikpe ahụ ka ọ natara akwụkwọ ahụ si n’aka EFCC ma rịọ ka e nye ya ohere ileba anya n’ime ya tupu ha dee nzaghachị banyere ya.
Ọkaikpe Ekwo nyere ya ụbọchị abụọ iji zaghachị akwụkwọ ahụ malita taa bụ Tọzde ma bugharịa ikpe ahụ gawa ụbọchị Wenezde 13 Maachị, 2024.
Cheta na ụlọọrụ EFCC boro Obiano ebubo ime mpụ na nrụrụaka ego dị ijeri naịra anọ (N4bn) mgbe ọ na-achị dịka gọvanọ Anambra Steeti.
Aka m dị ọcha n’ebubo ndị ụlọọrụ EFCC boro m – Obiano gwara Ụlọikpe

Gọvanọ chiburu Anambra Steeti bụ Willie Obiano agwala ụlọikpe ukwu dị n’Abuja na aka ya dị ọcha n’ebubo itoolu ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) boro ya.
O kwuru nke a n’ihu Ọkaikpe Inyang Ekwo mgbe ọkaiwu EFCC gụpụtachara ebubo ndị ahụ n’ihu ya.
Ọkaiwu gara n’ihu gwa ụlọikpe ka a kpọchie Obianọ n’ụlọmkpọrọ ruo mgbe a ga-ekpe ikpe banyere ebubo ndị a mana ọkaikpe Ekwo jụrụ ịnabata nke ahụ.
Ọkaikpe Ekwo kwuru na ebe ọ bụ na agbapụtabuola Obiano n’ụlọ nga na ọ baghị uru itinye ọzọ kama na ọnọdụ na iwu niile e nyere ya n’oge ahụ ka dị ire.
O kwuru ka e mee ka ndị ọrụ nchekwa Immigration maara na e ji akwụkwọ njem Obiano e ji na mgbe ọbụla ọ chọrọ ime njem na ọ ga-etinye akwụkwọ.
Ọkaikpe a gara n’ihu hiwe ụbọchị 4 ruo 7 nke ọnwa Maachị dịka mgbe ọzọ a ga-etinye n’ikpe ahụ.

Ọnụ ebubo itoolu EFCC boro Obiano gbadoro ụkwụ na mpụ na nrụrụaka ego ruru ijeri naịra anọ (N4bn).
Nkpụpụ Obiano n’ụlọikpe a na-abịa n’ime otu izuụka Onyeisi EFCC bụ Ola Olukoyede ṅụrụ iyi ịbọlite ebubo mpụ metụtara ndị ọchịchị nke a gbahapụrụ kamgbe ọtụtụ afọ ọkachasị ndị bụbu gọvanọ.
Cheta na ụlọọrụ EFCC nwuchiri Obiano n’ọdọụgbọelu dị na Legọs n’ọnwa Maachị 2022 n’ime awa ole ma ole ọ rịturu n’ọkwa gọvanọ mgbe ọ chọrọ ime njem aga mba Amerịka.

EFCC mara ọkwa ịkpụpụ Obiano n'ụlọikpe

Ebe foto si, OBIANO/FACEBOOK
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC bu Dele Oyewale gwara BBC nke a na mkparituaka ekwenti na ha ga-akpụpụ Obiano n'ụlọikpe n'ụbọchị Wenezde 24 Jenụwarị 2024.
Oyewale kwuru na ha na-akpupu n'ihu Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'ebubo itoolu banyere izu ego ruru ijeri naira ano (N4bn).
N'okwu ya, "o bu eziokwu, anyi ga-akpupu ya uloikpe maka mpu ruru N4bn".
Ufodu ebubo ndi e ji akpupu Obiano uloikpe
Onye nkwuchiteonu EFCC bu Dele Oyewale gwara BBC Igbo na ebubo e ji akpupu Obiano uloikpe bu ebubo itoolu. Nke a gunyere
- O si n'ime ego 'Security vootu' nke Anambra steeti ma site n'aka onye oru ya aha ya bu maazi Willie Nwokoye were ego ruru N156,800 zigara C.I Patty Ventures Nigeria Limited bu onye ya na goomenti Anambara na-enweghi mmekorita obula oge ahu
- O si n'ego "security vootu' Anambra Steeti site n'aka onyeoru ya maazi Willie Nwokoye zipu ego ruru N261,268,585.00 gaa Easy Duamond Integrated Link nke ha Anambra steeti na-enweghi mmekorita obula.









