Ibrahim El-Zakzaky: Ihe kpatara anyị ji kpọlata nwa amadị a - Gọọmentị Naijiria

El-Zakzaky

Ebe foto si, IMN

Nkọwa foto, Ibrahim El-Zakzaky n'ime ụgbọelu bu ya aga India

Gọọmentị Naijiria akọwaala na ọ bụ agwa ọjọọ Ibrahim El-Zazaky na nwunye ya kpatara e ji si na mba India kpọghachite ha.

El-Zakzaky na nwunye ya hapụrụ Naijiria ụbọchị Mọnde abalị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọst, gawa India ịga leta ahụike ha anya dịka otu ụlọikpe dị na Kaduna siri nye n'iwu.

Mana ha abụọ lọghachitere Naijiria taa bụ Fraide.

Dịka akwụkwọ ọzị si n'aka ngalaba gọọmentị n'ahụ maka mgbasa ozi na omenala siri kwuo, El-Zakzaky na nwunye ya chọrọ ibute nghọtahie na esemokwu n'etiti Naijiria na India.

Grace Isu Gekpe bụ onye binyere aka n'akwụkwọ ozi ahu kwuru na El-Zakzaky chọrọ iji ụzọ aghụghọ hapụ India gaa obodo ọzọ.

Gekpe dere sị: "Mgbe ha garuru India, El-Zakzaky kpọtụụrụ ndị ọkaiwu nke ndị ndu ha bụ Ali Zia Kabir Chaudary na Gunjan Singh.

Sheikh Zakzaky
Nkọwa foto, Ibrahim El-Zakzaky

"Ọ kpọtụkwara ndị otu "Islamic Human Rights Commission" nakwa ndị otu "Shiite" ndị ọzọ.

"Ebumnuche ya bụ ịchọ ụzọ ọ ga-eji si India gafee mba ọzọ.

"Nke a gaara abụ nnupu isi n'iwu nke ụlọikpe Kaduna nyere tupu ọ hapụ Naijiria gawa India."

Gọọmentị Naịjiria kwukwara na El-Zakzaki chọrọ ịnọ n'ụlọ oriri na nkwari na India kama ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

"O doro anyị anya na El-Zakzaky nwere ihe ndị ọzọ ọ na ede na-abụghị ihe gbasara ahụike, nke a mere ka anyị kpọghachite ya na Naijiria."

Cheta na mgbe El-Zakzaki na nwunye lọbatara n'ogige ụgbọelu dị n'Abuja, e si n'akụkụ ogige ugboelu ebe onyeisial na-esi abata wee kpọpụ ya ka ndị ntaakụkọ ghara ịma na ọ batala.

Ndị ntaakụkọ nọ na-eche mgbe El-Zakzaky ga-abata.
Nkọwa foto, Ndị ntaakụkọ nọ na-eche mgbe El-Zakzaky ga-abata.

Ndị ọrụ nchekwa gbakwara ogige ụgbọelu ahụ gburugburu tupu ụgbọelu bu El-Zakzaky na nwunye ya efetuo.

Ndị ọrụ nchekwa n'ogige ụgbọelu dị n'Abuja
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa juru n'ogige ụgbọelu dị n'Abuja mgbe El-Zakzaky batara

Cheta na El-Zakzaky e kwubuola na 'gọomentị Naíjiria tụgidere ya asị' mgbe ha gwara ndị ụlọọgwu India na ha amaghị ihe na-arịa ya.

O kwuru na ọ bụ ọgwụgwọ ka ọ biara ịnata n'India, n'ihi na e mechaala ya nnyocha na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ