Aguleri na Umuleri: Ihe mere n'etiti obodo abụọ a ụnyaahụ

Ndị uweojii nọ n'Anambara steeti ekwuola na ọ bụ esemokwu okeala butere okwu dapụtara n'etiti obodo Umuleri na Aguleri dị n'okpuruọchịchị Anambra Ist ụnyaahụ bụ Jenụwarị 16, 2021.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na nke a mere ka onyeisi ndị uweojii zipu ndị otu ya ka ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jịkọọ aka gaa meyụọ nsogbu ahụ dapụtara ebe ahụ.
O kwuru na ebe niile adaala jụụ, ebe ndị ọrụ ha ka na-agagharị n'ogbe ahụ iweta udo ebe ahụ.
O kwuru na o nweghị onye tufuru ndụ ya maọbụ merụọ ahụ n'ọgbaghara ahụ, mana ụfọdụ ndị si obodo abụọ a na-alụ ọgụ gbara ụgbọala anọ na ọgbatumtum abụọ ọkụ.

Ebe foto si, ABS Radio TV
Haruna kwuru na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ CP John B.Abang enyela iwu ka ụlọọrụ nnyocha ndị uweojii dị n'Awka ka nyochaa ma mata ihe niile gbasara ọgbaghara a dapụtara ọhụrụ n'etiti Aguleri na Umuleri iji mara ndị dara iwu ikpe.
Kọmishọna Abang rịọkwara ka ndị obodo a mịaghachị mma ha n'ọbọ ma were ụzọ iwu kwadoro wee chọọ udo. O kwuru na ọ ga-akpọtụrụ gọọmentị Anambara steeti ka o weta ogbugbo tọrọ atọ maka nsogbu.
Kọmịshọna na-ahụ maka mwulite obodo n'Anambara steeti bụ Marcel Ifejiofor bụkwa onye Aguleri, kwuru na ihe a kọọrọ ya butere ya bụ mkpamkpa bụ na otu onye Umuleri onye Umuleri ji ụgwọ nwụrụ mgbe ọ gara ịnata ụgwọ n'aka onye otu ya.

Ebe foto si, ABS Radio TV
Ndị otu onye ahụ gburu mmadụ gara n'akụkụ Aguleri mebisiwe ụlọ ka ọ wee dịka ka ọ bụ obodo na obodo na-alụ ọgụ.
Ifejiofor kwuru na ọ bụ eziokwu na a na-enwebu esemokwu ala n'etiti obodo abụọ a, mana ndị igwe na gọvanọ Anambara steeti amanyela ọnụ n'okwu ahụ na-ele anya iweta udo gbasara esemokwu okeala.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde bụ Jenụwarị 16, 2021 ka gọọmentị Anambara steeti tinyere mmachị ngagharị n'obodo Aguleri, Umuleri nakwa Umuoba Nnam maka ọgbaghara a dapụtara.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
- Ihe i kwesịrị ịma maka Omenụkọ, Ije Odumodu, Mbediọgụ na akwụkwọ Igbo ndị ọzọ ị gaghị echefu echefu
- Make money online: Lee ụzọ ị ga-eji were ekwentị gị kpatawa ego
- Uganda Election 2021:Bobi Wine ajụla mpụtara ntuliaka mba Uganda
- Ihe ga-eme ka otu nchekwa ndị IPOB na nke ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ rụkọọ ọrụ - Aloy Ejimakor









