Mkpocha ala Ogoni: Ka o si kwụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Na ngwupụta mmanụ agbidi na Naija-Delta emebiala mmiri na ala ma mee ka ọrụgbo na ndụ dị na mmiri nwe nsogbu abụghị akụkọ ọhụrụ.
Okwu a bụ okwu dịgoro afọ kwuru afọ kemgbe Ken Saro Wiwa, nwa afọ Naija-Delta nwụrụ anwụ jiri bido ọgụ ka a kwụsị ihe na-emebi na mpaghara ahụ, okwu nke ọ tunyere ndụ ya.
Okwu akpụ n'ọnụ bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu gbasara mgbocha ala Ogoni na-akpụ ka eke kemgbe e jiri kwube ya.
Cheta na ọchịchị onyeisiala Mụhammadụ Buhari kwere nkwa na a ga-ebido mkpocha ahụ n'afọ 2016.
Mana onwebeghị ihe a hụrụ anya a na-eme.
N'izuụka gara aga, iji gosi na nkwa ahụ abụghị okwu e ji emeju okwu, Buhari nyere NNPC iwu ka ha wepụta ego maka ibido mkpocha Ogoni.
Mana n'uche ọtụtụ ndị mmadụ, ọ bụ mgbe a hụrụ ndịọrụ na ngwaọrụ ebe a na-atụ anya ha ka ha ga-ama n'ugo berela na mgbagbu.

Ebe foto si, Getty Images
Na mkparịtaụka ya na onye ntaaakụkọ BBC nwere, otu onye na-alụ ọgụ maka nchekwa gburugburu bụ Celestine Akpobari, kwuru na agbanyeghị na okwu mkpocha Ogoni na-akpụ akpụ, o birila ọkụ.
"Anyị na-akpụ akpụ n'ezie, mana ọ bụ ihe dị mma na o bidola."
Akpobari kwuru na ihe mere mbido ọrụ jiri wee oge bụ na kemgbe ewepụtara ozi maka nsogbu ahụ n'afọ 2011, mmebi gburugburu ọhụrụ dịka nkwafu mmanụ emela, nke mere o ji dị mkpa na a ga-enyochakwa ọnọdụ nsogbu ahụ ọzọ tupu e bido ọrụ.
Na nso nso, Marvin Dekil, bụ onyeisi otu na-ahụ maka inyocha mmerụ e merụrụ mpaghara ahụ nke a kpọrọ, 'Hydrocarbon Pollution and Remediation Project (HYPREP),' na bekee o kwukwara na ihe ọzọ bụ ọkpụkpụ mbido ọrụ ahụ bụ igbaso usoro inye ọrụngo maka mkpocha ahụ dịka iwu (Procurement Act) siri kwuo.
Ka ọ dị ugbua, e meela mgbasaozi maka ụlọọrụ ndị ga-ewughari mmiri na gaasị n'obodo ndị ihe mebiri na ya.
Mana ole ebe ọrụ e kwuru ga-ewe afọ iri atọ na ise ikpocha ga-ejedebe?









