Ncheta Biafra: Ndị uweojii Abịa sị na ha amaghị maka onye egburu n'Aba

Ibrahim Idris

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ibrahim Idris bidoro ịchị ndị uweojii Naịjirịa n'afọ 2016

Ka a na-eme emume ncheta Biafra ụnyaahụ, ọtụtụ akụkọ pụtara n'ọwụwa anyanwụ banyere ihe na-eme.

N'Aba dị n'Abia steeti, ndi mmadụ dere na soshal media na otu okoroọbịa aha ya bụ Kelvin Nnamdi Ikemeh, nwụrụ n'aka ndị agha Naịjirịa, mana BBC Igbo gbara mbọ ịmata nke bụ eziokwu mana anyi enweteghị anya hụru mgbe o mere.

Akụkọ okwu ọnwụ nwa amadị a sị na ndị e chere na ha bụ ndị agha ala anyị gbagburu Kelvin dịka ya na ndị agbataobi ya nọ n'ihu ụlọ ha n'Uranta dị nso n'ụzọ Pọt Hakọt n'Aba.

Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti, bụ Geofrey Ogbonna iji mata nke bụ eziokwu, o kwuru na ọ maghi maka ya.

Ogbonna kwuru; "enwetabeghị m ozi ọbụla maka nke a" ma kwukwa na ọ ga-achọpụta nke bụ eziokwu.

Etu ọ dị ugbua, anyị ka na-etinye anya n'okwu a ịchopụta nke gara na etu o si ga.

Nkọwọta:

Akụkọ a kwubụrụ na ndị agha gbagbụrụ nwa amadi a mana anyị degharịrị ya igosi na anyị achọputabeghị nke bụ eziokwu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ