Abia Assembly: 'Ikuku' ekuola ndị Abia dịka Chinedum Orji bụrụ onyeisi ụlọomeiwu ha

Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti

Ebe foto si, Nora Onuoha

Nkọwa foto, Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti

Ndị ụlọomeiwu ọhụrụ nke Abia Steeti ahọpụtala Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu Abia ka ọ bụrụ onyeisi ha.

Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu.

Ndị ọzọ nwetere ọkwa gụnyere Ifeanyi Uchendu nke Ohafia South dịka Osote onyeisi.

Solomon Akpulonu nke PDP onye ndu pati kachasị, Abraham Oba nke APGA dị ka onyendu pati dị nta.

Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti

Ebe foto si, Nora Onuoha

Nkọwa foto, Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu.

Chukwu Chijioke nke APC dịka osote onye ndu pati kachasị, Paul Taribo osote onye ndu pati kachasị nta.

Munachim Alozie dịka 'Chief Whip', Chukwudi Apugo dịka osote 'Chief Whip'.

Ọ bụ omeiwu Munachim Alozie họpụtara Orji dịka onyeisi, ebe omeiwu Ginger Onwusibe kwenyere ya, mana onweghi onye ọzọ mara ya aka.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: