UTME 2018: Ule Jamb ebidola na mpaghara Naịjirịa niile

Ebe foto si, Getty Images
Ule eji abanye ụlọakwụkwọ mahadum na Naịjirịa nke a na-akpọ Jamb n'aha ịchafụ bidoro na mpaghara Naịjirịa niile ụnyaahụ bụ abalị itoolu ọnwa Maachị afọ a bụ 2018.
Ndị denyere aha maka n'ule a n'afọ a ruru mmadụ nde 1.6 gunyere mmadụ puku abụọ na-ede ya na Borno steeti bụ ebe ndị Boko Haram na-akpa mkpamkpa.
Tupu ugbua, a na-eme ule Jamb sọsọ otu ụbọchị na na Naijiria niile.
Ọtụtụ ndị dere ya bụ ule ụnyaahụ kwuru na nsogbu ha bụ na intanetị ebe ha nọ dee ya anaghị aga ọsịsọ kpatara na ha gburu oge maọbụ na ha edechaghị.
Ugbua, igwe kọmputa ka e ji ede ule Jamb. Ọ bụghị akwụkwọ na mkpịsị ode eji edebu ya na mbụ.
A ga-ede ule ahụ rue ụbọchị 17 ọnwa Maachị.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Jamb 2018
Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu etu ọ dị ha n'ahụ gbasara ule Jamb nke afọ a 2018 n'gwe okwu intanet.
Benedict Okeke si Abia steeti ede akwụkwọ kwuru na Twitter na etu e si eme ya bụ ule na Abia steeti adịghị mma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Allem Muniat kwuru na e kweghị ka ụfọdụ banye n'ime ụlọ ebe a na-ele ule ahụ maka na ha yi akwa e ji mara ndị ụka alakụba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'aka nke ọzọ, Michael Edene kwuru na ndị ọrụ Jamb anaghị ebido oge ha kwuru. N'okwu ya, "Ndị mmadụ amaghị ejikwa oge na Naịjiria. Jamb kwuru na ha ga-ebido n'Elekere Itoolu mana ha ebidoghị rue Elekere 11 nke ụtụtụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Jamb bụ ule ụmụakwụkwọ si sekọndịrị na-ede tupu ha abanye ụlọakwụkwọ mahadum. Mana emecha ya, ụlọakwụkwọ mahadum ụfọdụ na-emekwa ule nke ha nke ha ji ahọrọ ndị ga-abanye ụlọakwụkwọ ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










