Paul Kagame :Buhari, ibu agha megide nrụrụaka ezughị ma nkwalite akụnaụba esoghị ya
Akụkọ ndị dị mkpa:
Ndụmọdụ Kagame nyere Buhari

Ebe foto si, Uche Akolisa
Onyeisiala mba Rwanda adụọla onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ọdụ sị ya na ibu agha megide nrụrụaka ezughị ma ọ bụrụ na ịbawanye akụnaụba esoghị ya.
Kagame kwuru nke a n'ọgbakọ maka igbochi nrụrụaka n'ọchịchị onyekwuoucheya nke isiokwu ya bụ 'Ịbelata irifu ego na ndọrọndoro ọchichi: ụzọ ịkwụsi nrụrụaka" nke e mere ụbọchị Tuuzde n'Abuja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Kagame kwuru ọ dị mkpa ibu agha megide nrụrụaka n'ọchịchị iji weghachi ntụwasdaobi ndị mmadụ ọ kachasị ndị na-eto eto n'ọchịchị onyekwuoucheya.

Ebe foto si, UrugwiroVillage
Kagame, onye ji mba Rwanda maa atụ kwuru na ọchịchị ya sochiri ndị ọrụ ọchịchị ya ndị emeghị ihe dịka o kwesịị chụọ ha n'ọụ maọbụ kpụpụ ha ụlọikpe,ebe ụfọdụ gbapụụ na mba ọzọ. gọọmenti
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ụlọomeiwu etiti enwela ndị ndu ọhụrụ

Ebe foto si, @FMICNigeria
Lawan,Omo-Agege,Gbajabiamila na Wase abụrụla ndị ndu Ụlọomeiwu nke Itoolu.
Ụlọomeiwu enwetara ndị ndu ọhụrụ dịka e duru Ahmed Lawan na Ovie Omo-Agege n'iyiọrụ dịka onyeisi na osote onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu.
Lawan ji vootu Iri asaa na itoolu (79) merie Ali Ndume onye nwetera vootu iri abụọ na asatọ (28).
Gbajabiamila jiri vootu dị nari atọ iri asatọ na otu (381) merie Bago Mohammed onye nwetara iri asaa na isii(76) na ntụliaka ndị nnọchiteanya mmadụ narị atọ iri ise na asatọ tụrụ vootu.
Ekwermadu achịtaghị aja n'ọsọ onye ga-abụ Osote onyeisi ụlọomeiwu Nta dịka o nwetara naanị vootu iri atọ na asaa (37), ebe Omo-Agege nwetara vootu irir isii na asatọ(68).
E nyela Okorocha asambodo mmeri

Ebe foto si, Rochas Okorocha/Facebook
Dịka mmemme ntuliaka ụlọomeiwu nke Itoolu na-aga n'ihu, Inec nyere Rochas Okorocha asambo mmeri dịka Sinetọ na-anọchite Imo-West.
Nke a na-eso mmeri o nwetara n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke nyere Inec iwu ka ha nye ya akwụkwọ mmeri ya.
Women's World Cup: Netherland agwọọla New Zealand ịba

Ebe foto si, Maddie Meyer - FIFA
N'egwuregwu, mba Netherland ji otu ọkpụ a saghị asa merie mba New Zealand n'asọmpi mbido asọmpị Iko mbaụwa nke ụmụ nwaanyị na-eme na France.
gee akụkọ ndị a ebe:










