World Diabetes Day: Etu ndị Gen Z ga-esi chekwa onwe ha n'aka ọrịa shuga

Aha onyonyo, World Diabetes Day: Ịchekwa ndị Gen Z site n’ọrịa shuga
World Diabetes Day: Etu ndị Gen Z ga-esi chekwa onwe ha n'aka ọrịa shuga
    • Onye dere ya, Michael Ngene, Chigozie Ohaka na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Senior Journalist na Video Journalist

Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) mapụtara 14 Nọvemba afọ ọbụla dịka ụbọchị e ji agbasa ozi banyere ọrịa shuga bekee kpọrọ Diabetes.

N'Afrịka, WHO kwuru na ihe ruru mmadụ dị nde iri abụọ na anọ bụ ọrịa shuga, ebe ụkara n'ime ha amaghị na ha bu ọrịa ahụ.

Ndị ọrụ ahụike mere ka a mata na ọrịa shuga abụghịzikwa naanị ndị okenye nwereike ibute ya. Ka ọ dị ugbua, ndị ntorobịa (Gen Z) ka a na-ekwu na ha nwekwara ike ibute ọrịa maka na ha anaghị ebi ndụ etu o kwesịrị.

Onyeisi ụlọọrụ WHO n'Afrịka bụ Dọkịnta Matshidiso Rebecca Moeti, kpọkuru ndị ụlọọrụ gọọmenti, ụlọọrụ ahụike, ndị ọchịchị ime obodo na ndị omeiwu ka ha jikọọ aka ma chụọ ọrịa shuga ọsọ ụkwụ eru ala n'Afrịka.

Kedụ ka onye Gen Z ga-esi bute ọrịa shuga?

Dọkịnta Macginger Ibeneme gwara BBC Igbo na onye Gen Z ọbụla na-anọ ọdụ otu ebe ruo ọtụtụ oge ma ghara imegharị ahụ, nwereike ibute ọrịa shuga.

Ọ kọwara na ọnọdụ a nwereike ime ka mmadụ buo oke ibu.

Ihe ndị ọzọ nwereike ibutere onye Gen Z ọrịa shuga bụ iri nri a rụpụtara arụpụta nke bekee kpọrọ processed food dịka Achịcha, shuga wdz.

Nri ndị ka a na-ekwu nwereike ibute ọrịa sugar maka na o nwere kemịkalu na-ebelata mmepụta insulin n’ahụ mmadụ.

Ikuku metọrọ emetọ a na-akpọ Air Pollution na bekee bụ ihe nwereike ibutere onye Gen Z ọrịa shuga.

Ọzọ dịka ibe ya bụ ịṅụ oké ọgwụ antibiotics nke ọ na-abụghị Dọkịnta gwara ṅụọ.

Kedụ ka ị ga-esi gbochie ibute ọrịa shuga?

Onye Gen Z ọbụla na-arahụ ụra ọfụma, na-eri nri si na chi dịka mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, mmiri ara ehi na ndị ọzọ, ga-egbochi ọrịa shuga ịbịa ya nso.

Dọkịnta Ibeneme gwara ndị Gen Z ka ha na-eme egwuregwu dị iche iche dịka ịgba bọọlụ, ịgba ọsọ, ịga ije, ịkpọ ọga. Nkà ga-enyere ha aka gbochie ọrịa shuga.

Ị rahụ ụra etu o kwesịrị bụkwa ụzọ ọzọ e si egbochi ibute ọrịa shuga.

Kedụ njirimara ọrịa shuga?

Onye bu ọrịa shuga agba nke abụọ (Type 2 Diabetes) ga-amalite ịta ahụ, inyụ oké mamịrị, ịñụ oke mmiri mgbe niile, oke ike ọgwụgwụ, anaghị ahụ ụzọ nke ọma nakwa ọnya ana ana.

Ọ bụrụ na nke mee, ọ dị mkpa ka onye ahụ ga ụlọ ahụike ka eme nnyocha ma chọpụta ihe ọ bụ.