MMM: Atụmaatụ a ọ laghachitela?

Ebe foto si, @MMM_Glo_World
MMM nke a na-akpọ "Mavrodi Mundial Moneybox" na bekee alaghachitela azụ dịka ndị nwe atụmaatụ a si depụta na webụsaiti ha.
Atụmaatụ a nke ndị nwe ya kwuru na ndị mmadụ ji enweta enyemaka , ma bụrụkwa nke ụlọakụ gọọmenti dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbara ọsọ, kwuru na ha adịla njikere ịmalite ọzọ.
N'ọnwa Aprelu nke afọ 2018, ndị nwe ya bụ atụmaatụ gwara ndị mmadụ na ha gbachiri ọnụ ụzọ ha maka onyeisi ha bụ Sergie Mavrodi anwụọla.
Ọtụtụ ndị mmadụ si mba Ghana, Kenya nakwa Naijirịa tufuru ọtụtụ ego mgbe aka bidoro gbajiwe atụmaatụ a n'afọ 2016.

Ebe foto si, MMM Global
Nchọpụta BBC mere gosiri na dịka nke mbụ ndị mmadụ ga-edebanye aha na webusaiti MMM, ha ewepụtakwuola akara Whatsapp ndị Naịjirịa ga-eji na-eme ya bụ atụmaatụ.
Ha kwuru na ugbua na ọ bụ 'robot' ga na-ahazi etu esi eme MMM kama mmadụ.
Gọọmenti Naịjirịa na-adọsi ụmụ Naịjirịa aka na nti ike ka ha gbaara ụdịrị atụmaatụ a ọsọ.




