Anambra Crime: Ọkụ latrịk adọgbuola onye a na-eche na ọ bịara izu waya

Igwe ọkụ latrik

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa

Mmadụ ọ na anọkata je were aka ya tinye n'ọkụ?

Akụkọ si n'obodo Ezinifite dị n'okpuruọchịchị Aguata apụta na-ekwu na ọkụ larịk adọgbuola otu nwoke a na-eche na ọ bụ onye ohi waya.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na ebe elekere asaa nke ụtụtụ taa ka ndị nchekwa ime obodo wetara mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii.

Ndị nchekwa ahụ kwuru na ha hụrụ onye a na-eche na ọ gara izu waya na-enye ọkụ mana chi ya rapụtara ya dịka waya gbara ma dọgbuo ya.

Mgbe onyeisi ụlọọrụ uweojii dị n'Ezinifite Aguata na ndị otu ya kpọgara nwa amadị a ụlọọgwụ, dibia bekee kwuru na ọ nwụọla.

Ka ọ dị ugbua akpọkuola ụlọọrụ "Enugu Electricity Distribution Company", see ozu ahụ foto ma bụga ya n'ụlọozu maka nyocha.

Ọkụ Latrịk

Haruna kwuru na ndị uweojji ka na-eme nyocha ịchọpụta onye nwa amadị a bụ nakwa ihe niile gbasara ọdachị a.

Akụkọ ga-amasị gị: