Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị agha ụgbọelu 'egbuola ndị omekome 20'

Akụkọ ndị dị mkpa

Ndị agha ụgbọelu Naịjira

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa atụọla ogbunigwe ma gbuo ndị na-eyi ndụ egwu dị iri abụọ n'obodo Yanwari na Mashema nke Zamfara steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha ụgbọelu bụ Ibikunle Daramola bu onye zipuru ozi banyere mwakpo a.

Afam Power Station

Ebe foto si, Getty Images

Minista na-ahụ maka ọkụ bụ Babatunde Fashola ekwupụtala na ọkụ Latrik Naịjirịa na-ewepụta ugbua dị megawatt puku asaa

Fashola gara n'ihu kwuo na ministri ya arụọla ọrụ pụtara ihe n'ime afọ atọ gara aga kama na-enwere ọtụtụ ihe ka fọdụrụ.

Na mba ofesi,

Ngwaagha nuklia

Ebe foto si, KCNA

Nkọwa foto, Ndị Nọt Korịa nwalere ọtụtụ ngwaagha nuklia ha n'afọ 2017

Akụko ndị nchekwa United Nation wepụtara ụnyaahụ na-egosi na mba Nọt Korịa ka na-aga n'ihu na mmepụta nakwa orire ngwaagha nuklia.

Dịka ọ dị ugbua mba Nọt Koria ekwubeghi ihe ọbụla banyere akụkọ a ma ọ bụ eziokwu, ka ọ bụ asị.

N'egwuregwu,

Okagbare,Udo-Gabriel, Amusan, Chukwuma

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụafọ Naịjirịa gụnyere Blessing Okagbare, Joy Udo-Gabriel, Tobi Amusan na Rosemary Chukwuma atụrụla ugo ọlaedo n'ọsọ relay n'egwuregwu atiletiks na-eme n'Asaba.

Ebe Semenya nke mba Saụt Afrịka maburu ọlaedo nke ya n'ọsọ mita narị anọ.

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra.