Innoson vs EFCC: Iwu Ụlọikpe nyere ka a kpụta Innoson gbara anyị gharịị' - Cornel Osigwe

Innocent Chukwuma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Innocent Chukwuma

Ụlọikpe ukwu dị na steeti Legọs enyela iwu ka anwuchie Innocent Chukwuma bụ onye eji Innoson mara ma kpụta ya n'ụlọikpe.

Ọkaikpe Ayokunle Faji nyere iwu a taa bụ Mọnde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun afọ 2019.

Mana Cornel Osigwe bu ọnụ na-ekwuru "Innoson Group" gwara BBC na iwu ahụ ụlọikpe nyere gbara ha gharịị.

Osigwe kwuru na onweghi akwụkwọ ọbụla ha nwetara gosiri na ụlọikpe na-akpọ ha oku ikpe a.

O kwukwara na ha ewepulari okwu ahụ n'ụlọikpe mkpegharị bụ "court of appeal" kamgbe.

Maazị Osigwe sị na ha che na ihe a mere bụ usoro a chọrọ iji mee ka Innoson bịa ka ya na ụlọakụ ahụ kpaa nkata.

Nke a abụghị nke mbụ ụlọikpe na-enye iwu ka ejichie Innoson n'ihi okwu dị n'etiti ụlọọrụ ya bụ 'Innoson Group' na otu ụlọ ọbaego ama ama.

Ngalaba "Economic and Financial Crimes Commission" (EFCC) etinyelarị ọnụ n'okwu ahụ mana a ka nọkwa na ya.

EFCC na-ebo Innoson ebubo na o ji akwụkwọ adigboroja wee ga gbaziri ụlọ ọbaego ahụ nnukwu ego. Ha sị na nke a megidere iwu Naijiria.

Mana Innoson kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu kama na ọbụ ụlọ ọbaego ahu ji ya ụgwọ ruru ijeri naịra abụọ na ụma.