Peter Obi: Ala Igbo mee ihe atọ ndị a, ala anyị ga-emepe
Peter Obi bụ aka chiburu Anambara steeti nakwa onye ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party zọọ oche osote onyeisiala na ntulaiaka 2019 agụpụtala ihe ole na ole e kwesiri ime iji wulite obodo
Naịjirịa.
O kwuru na ihe ndị a ga-enye aka tụmaadị n'oge a coronavirus jidere akụ na ụba mba dị iche iche kụtụọ n'ala.
O kwuru na ọrụ nwulite ala Igbo bụ nke diri onye ọbụla bụ onye Igbo.
Kirie ọkpụrụkpụ ihe o kwuputere n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a.
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chioma Obianinwa