Akụkọ odogwu nwoke mbụ nabatara ndị ọcha ma webata mmepe n'Enugwu

Aha onyonyo, Ị nụla akụkọ maka Onyeama n'Eke onye mbụ wetara mmepe n'Enugwu?

Igbo tụrụ ilu sị na a na-enwe obodo enwe maka na obodo anaghị eko n'elu ka ụgbọgụrụ.

A kọwa akụkọ ndị nwe obodo Enugwu n'oge gboo, onye mbụ a ga-akpọ aha bụ Mazị Onyeama n'Eke.

Ọ bụ ya bụ nwoke mbụ kara obi gakwuru ndị ọcha oge mbụ ha batara na mpaghara Enugwu.

Nke a mere ka ya na ha dị na mma, o wee sizie n'aka ndị ọcha webata ọtụtụ ihe mere ka Enugwu mepee.

Ụfọdụ na-ekwukwa na Onyeama n'Eke bụ nwaafọ Igbo mbụ gara mba ofesi n'abụghị dịka ohu.

Gere akụkọ ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu.

Onye mere akụkọ a bụChris OkerekenaChiemela Peter.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: