Nnamdi Kanu: 'Onye isi ndị IPOB amaghị nke bụ eziokwu ihe mere n'Oba'

Aha onyonyo, Okwu Onyeisi ndị okorọbịa Oba banyere mwakpo ndị Ipob

Dịka onyeisi otu "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu kpọrọ ndị na-achị Oba aha ma si na ọ bụ ha ka ọ na-ejide maka mwakpo a wakporo ndị otu ya ebe ha na-eme nzukọ, onyeisi ndị okorọbịa n'Oba ekwuola etu okwu ahụ sị malite.

Ikechukwu Ezeukwu, onye bụ "President General for Youths" n'Oba gwara BBC Igbo na ya anaghị ata Nnamdi Kanu ụta maka etu o ji Jiri iwe kpọọ ndi Oba iyi ụbọchị Wenesde.

Ọ sị: "Ọ bụ ihe a gwara ya, na etu e si gwa ya kpatara oji kwuo ihe o kwuru."

Ọ gakwara n'ihu sị na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị otu nzuzo kpatara okwu a.

"Ọ bụ onye magburu mmadụ ka ndị okorọbịa chụụrụ ọsọ banye ebe ndị Ipob na-eme nzukọ."

Ọ si na ndị okorobịa na-achụ onye gburu mmadụ ọsọ gwara ndị Ipob ka ha kpụpụta onye ahụ ha na-achọ mana ha ekweghị.

Dịka Ezeukwu si kọwa, ọ bụ ka a na-adọ ndọrọndọrọ ka onye ahụ gburu ọchụ nwetere ohere gbaa ọsọ, nke butere iwe ndị okorọbịa kpatara ihe ahụ mere.

Ọ kowara ọtụtụ ihe ndi ọzọ ị ga-anụ ma i gee ihe o kwuru.