Yello Fever: Gọọmenti Enugwu amalitela ịgba ọgwụ mgbochi Yellow Fever ugbua

Ọgwụ ntụntụ

Ebe foto si, Reuters

    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service

Iji gbochie mfesa ọrịa yellow fever na-efesa n'Enugwu, gọọmenti steeti ahụ ekwuola na ịgba ọgwụ mgbochi amalitela n'uju.

Ọrịa yellow Fever ahụ egbuola ihe karịrị mmadụ iri ise na asaa, na obodo Ette Ụnọ na Ụmụopu nke dị na okpuru ọchịchị Igboeze north n'Enugwu Steeti.

Komishiona na-ahụ maka ahụike n'Enugwu bụ Dọkinta Ike Obi kwuru na ewepụtala usoro eji eso ụdịrị ọrịa ahụ n'ụwa niile nke gunyere iwepụtara yellow fever agalaba n'ụlọ ministri ya.

Obi kwuru na ha agbaala ọgwụ na egbu anwụ nta ebe ahụ niile ometụtara, ma na akuziri ndị mmadụ ka ha ga esi mata ọrị ahụ nakwa mgbichi ya.

Onye a na-agba ọgwụ mgbochi ọrịa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, "Yellow Fever" kpara ike ya bụ na Naijiria n'afọ 1864 na Legọs

Dokinta Obi kọwara na Enugwu Steeti na Federal ministy of Health na arụkọ ọrụ ọnụ ma yọọ ka onye ọbụla anaghị enweta onwe ya gas ụlọ ọgwụ ozigbo ozigbo.

Lee ihe dị mkpa ịkwesịrị ịma maka ọrịa Yellow Fever

Kemgbe ọnwa Septemba afọ 2020 oge ọrịa "Yellow Fever" gbakapụtara ọhụrụ na Delta steeti nakwa n'obodo Ette-Ụno na Umuopu dị n'okpuruọchịchị Igboeze-North n'Enugwu steeti, o tinyela ọtụtụ ndị mmadụ na gbagharịa.

Ya bụ ọrịa eriela isi ihe karịrị mmadụ iri ise

Nke a bụ n'ihi na ọtụtụ amaghị ihe ọbụla banyere ya bụ ọrịa karịa ịga nata akwụkwọ na-egosi na ha ebughị ya ma ha chọọ ịhapụ Naijiria ịga njem mba ọzọ.

Mana "yellow Fever" abụghị ọrịa ọhụrụ, dịka ọ na-atụ ka ọnwa kwa afọ iri maọbụ karịa.

Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control'(NCDC) si kwuo na websait ha, mbụ a hụrụ ọrịa "Yellow Fever" na Naijiria bụ na Legọs n'afọ 1864.

Mpụta ikpeazụ ọrịa a pụtara bụ na Septemba 12 nke afọ 2017, nke mere ya mbụ ọ na-apụta ka afọ iri abụọ na asaa (1996) gachara o jiri kpaa ike ikpeazụ.

Ya bụ ọ bụrụ na i so na ndị a mụrụ n'agbata afọ 90, lee ihe ndị i kwesịrị ịma maka "ọrịa "yellow Fever" dịka Dọkịta ahụike ọha bụ Dkta Kemi Odukoya si kọwaa ya:

Aha onyonyo, Lassa Fever: 'A na m eri oke iri n'ụbọchị'- Nwaanyị na-eri oke
  • "Yellow fever" bụ ọrịa a na-ebute ma ọ bụrụ na anwụnta bụ ya bụ ọrịa ahụ taa mmadụ.
  • Njirimara onye ọrịa "yellow fever" gụnyere ahụọkụ, isi ọwụwa, ọgbụgbọ, ike ọgwụgwụ,ahụ mgbu, anya ịcha edo edo."
  • Dkta Odukoya kwuru na nkwenye ọtụtụ nwere na ọrịa Yellow fever bụ ọrịa anaghị ahụ kwa daa abụghị eziokwu. Ọ kọwara na ya bụ ọrịa na agbakapụta ihe dịka kwa afọ iri abụọ ọbụla na Naijiria.
  • Ụzọ ị ga-esi egbochi ibute ya bụ ọrịa bụ site na ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi
  • Ụzọ ọzọ e ji egbochi ya bụ ịgba ọgwụ na-egbu anwụ na gburugburu nakwa ihi ụra n'okpuru netị

Ndị iche dị n'etiti ịba na 'yellow Fever'

Dịka Dkta Odukoya siri kọwaa, ọrịa abụọ ndị a nwere njirimara yiri onwe ha dịka, "Ha abụọ na-ebute ahụọkụ, isi ọwụwa nakwa ahụ mgbu" mana;

  • "Ọrịa "Yellow Fever" na-eme ka ọbara si onye ọ na-arịa n'ọnụ, imi nakwa n'anya apụta."
  • "Ịba anaghị egbukarị ndị mmadụ na Naijiria n'ihi ọtụtụ enwela mgbochi ya n'ime ahụ ha, nke bekee kpọrọ 'immunity', mana "yellow fever" na-egbu ndị mmadụ agbaghị ọgwụ mgbochi maọbụ ndị anataghị nleta n'oge."
  • Anwụnta na-ebutekarị ịba bụ nke a kpọrọ 'anọpheles", ebe nke na-ebute "yellow Fever bụ nke a kpọrọ "aedes."
Dkta Kemi Odukoya

Ebe foto si, Kemi Odukoya

Nkọwa foto, Dkta Kemi Odukoya

Yello Fever: Ihe mere amalitebeghị ịgba ọgwụ mgbochi n'Igboeze North - Gọọmentị Enugwu

Onye na-agba mmadụ ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọgwụ mgbochi 'yellow fever' ga-ewe opekatampe abalị iri tupu ọ malite ịrụ ọrụ n'ahụ onye a gbara ya

Kọmishọna ahụike n'Enugwu steeti bụ Ik Emmanuel Obi akọwaala na ọgwụ mgbochi 'yellow fever' gọọmentị nwere ugbua agaghị ezu ndị niile bi na mpaghara Igboeze North, ebe ya bụ ọrịa na-akpa ike ugbua.

Obi kwuru nke a oge BBC kpọtụụrụ ya iji mata ihe mere na ịgba ọgwụ mgbochi amalitebeghị.

Cheta na ọrịa amaghị ihe ọbụ malitere inye ndị mmadụ nsogbu ihe dịka otu ọnwa gara aga.

Nnyocha mechara gosi na ọrịa ahụ bụ Yellow Fever, nke mere gọọmentị ji kwuo na a ga-amalite ịgba ọgwụ mgbochi n'ebe niile ya bụ ọrịa na-enye nsogbu.

Mana ndị bi na mpaghara Igboeze North gwara BBC n'ụbọchị Mọnde na ya bụ ịgba ọgwụ mgbochi amalitebeghi.

Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gosipụtara iwe ya ma kwuo na ọ dị ka gọọmentị ejighị ndụ ndị mmadụ kpọrọ ihe.

Gịnị kpatara na ịgba ọgwụ mgbochi amalitebeghị?

'General Hospital' dị n'Enugu Ezike

Ebe foto si, Facebook/Igbo-Eze North LGA

Nkọwa foto, Gọọmentị Enugwu steeti akwadoola ụlọọgwụ ọha dị n'Enugwu Ezike maka ịnaba ndị nwere ọrịa yitere 'yellow fever'

Kọmishọna ahụike bụ Ikechukwu Obi gwara BBC Igbo na ọgwụ mgbochi nke dị na steeti ahụ ugbua agaghị ezu ndị mmadụ bi na mpaghara Igboeze North.

Obi kọwara na ọgwụ mgbochi gọọmentị nwere ugbua bụ nke e ji eme ihe Bekee kpọrọ 'routine immunization', mana ihe e kwesịrị ime n'Igboeze North ugbua bụ nke Bekee kpọrọ 'mass immunisation'.

O kwuru sị: "Ọ gaghị adị mma ịmalite ịgba ọgwụ mgbochi ugbua ebe anyị ma na ọ gaghị agazu ndị mmadụ."

"Anyị na-agbasi mbọ ike inweta ole ga-ezunu n'oge adịghị anya."

Ụzọ ị ga-esi gbanahụ ọrịa yellow fever

Onye anya ya na-acha edo edo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụrụ na anya mmadụ amalite ịcha edo edo, mara na o nwere ike ịbụ 'yellow fever'

Mana Obi kọwakwara na "ihe kacha mkpa ugbua abụchaghị ịgba ọgwụ mgbochi, kama ọ bụ ịkpachapụ anya ma zeere ihe nwere ike ịkpata ọrịa yellow fever."

"Ọ bụ anwụnta (mosquito) na-ekesa ọrịa yellow fever, ọkachasị ndị na-ata n'ehihie."

"Ọ dị mkpa ka ndị na-aga ọrụ ugbo, ndị na-achụ nta, na mmadụ niile na-ekpuchi ahụ ha nke ọma ka anwụnta ghara ịta ha."

"Onye ọbụla sụchakwaa ahịhịa dị n'okirikiri ya ma debe ebe niile ọcha ka anwụnta ghara ịhụ ebe ọ ga-ebi."

Ikechukwu Emmanuel Obi

Ebe foto si, Ik Obi

Nkọwa foto, Kọmishọna ahụike nke Enugwu Steeti, Ikechukwu Emmanuel Obi

Obi kọwara na ọ bụ malite n'abali iri ruo abali iri atọ ka ọgwụ mgbochi 'yellow fever' ga-amalite ịrụ ọrụ n'ahụ mmadụ.

Dịka Obi si kọwaa, onye ọbụla nwere ahụọkụ nke anya ya na-acha edo edo (yellow), kwesịrị ịga ụlọọgwụ ngwangwa.

"E nwere ụlọọgwụ ọha (General Hospital) dị n'Enugwu-Ezike nke gọọmentị kwadoro maka ịnabata ndị niile nwere ọrịa yitere 'yellow fever'," Obi kwuru.

Ọrịa amabeghị aha ya ataala isi ihe karịrị mmadụ 20 n'Enugwu

Dọkịta onye isi ojii na-eme nnyocha

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Gọọmenti Enugwu ekwuola na ha na ụlọọrụ NCDC na WHO jikọrọ aka na-enyocha ọrịa gbakapụtara n'n'okpuru ọchịchị Enugu Ezike.

Cheta na Kọmishiọna na-ahụ maka ahuike n'Enugwu Steeti bụ Dọkịta Ikechukwu Obi ekwuola na gọọmenti Enugwu na-agba mbọ ịchọpụta aha ọrịa a mabeghị ihe ọ bụ nke gbuorola ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ ugbua.

Ya bụ ọrịa butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ na Ette Uno na Umuokpu n'okpuru ọchịchị Enugu Ezike dị na Enugwu steeti etinyela ndị obodo na ndị agbataobi ha na gbagharịa.

Aha onyonyo, Etu e si eme 'hand sanitizer'

Kọmishịona Ike Obi kwuru na kepukepu ahụ na-efegharị na soshal midia na mmadụ 57 anwụọla abụghị eziokwu n'ihi na ha ka na-agba mbọ ịmata mmadụ ole o metụtara.

Obi kwuru na tupu tata abịa na njedebe na ụlọọrụ ya ga-ama ihe nchọpụta ahụ e mere kwuru maka aha ya bụ ọrịa.

O nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ dowe nri ha na gburugburu ha ọcha, ma dowe iwu niile e kwuru maka mmadụ ichekwa onwe ya ganye na-amaara aha ya bụ ọrịa ognu n'Oha.