Lasa fiva: Ọnwụ mmadụ atọ na nkwadọ steeti dị ịcheịeche

Ebe foto si, AFP
Ọtụtụ steeti ekwụpụtala ịhe dị ịcheịche ha na-eme ikwado maka ị buso ọrịa Lasa fiva agha.
Komishọna na-ahụ maka ahụike na Abia steeti ekwuru na ọ bụ eziokwu na enwebeghị ọrịa ahụ na steeti ha mana ha dị njikere.
Ọ gwara BBC n'elụ ekwentị na ha na-agba mbọ na-akụziri ndị mmadụ maka ọrịa ahụ na atụmatụ ha ga-eji gbochie ya.
Komishona ibe ya n'Imo steeti bụ Angela Uwakwem kwuru na ha na-agba mbọ ịgbuchasị oke na-ebugharị ọrịa nke a.
Ha kwukwara na ha enyela ndị dọkịta akwa mgbochi iji gwọ ndị nwere ọrịa ka ha ghara ibute ya.
Akụkọ na-ekwu na mmadụ atọ nwere Lasa fiva anwụọla na Delta steetị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọrịa ahụ kemgbe o bidoro n'ọnwa gara aga na steeti ahụ rue asaa.
Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa ahụisike nke bụ Dkta Mordi Ononye kwuru na-ebidola nyocha mmadụ iri abụọ na-anọ echere nwere ọrịa a.
Ọ sị na mmadụ abụọ na ndị nwụrụ sị Anambra steeti ma nke ọzọ bụrụ onye Delta.










