Ọria yelo fiva na Naijiria: Ihe ị kwesiri ị ma maka ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, AFP
Taa bụ nkwọ, ụbọchị ịrị abụọ na ise na onwa Jenụwarị, Gọọmentị Naijiria bido inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ọrịa yelo fiva.
Otu na-ahụ maka ahụike na uwa niile gba gburugburu bụ World Health Organistion na bekee ga-eso kwa na nyemaka mmega ahụ nke a.
Mana cheta na oge gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ bị n'ugwu Naijiria na-atụ egwu ịgba ọgwụ mgbochi maka akụkọ asịrị na-ekwu na ọ na-ebuta amụtaghị nwa.
Na Februwari na afọ 2013, agbagburu ndị ọrụ ahụike na-enyeọgwụ mgbochi ọrịa polio itoolu na Kano Steeti.
Gịnị bụ ihe pụrịche na mgbasa okwu a?
Ugbua, ọ dịzịka echiche ahụ na-echeharị.
Otu dọkịta bụ Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ọtụtụ mmadụ na-apụta mgbe niile a na-agba ọgwụ mgbochi.

Ebe foto si, Getty Images
Mgbolu kwuru na "kemgbe meningitis na lasa fiva pụtagharịrị, ọtụtụ ndị mmadụ na-apụta ịgba ọgwụ mgbochi".
"Ugbua ndị na-achị obodo na ndị otu di ichiche na-enye aka igbasa ozi a," Mgbolu kwuru.
Onye n'onye ka a ga-agba ọgwụ mgbochi?
Gọọmentị Naijiria ekwuola na ọbụ mmadụ nde abụọ na ise ka ha ga-enye ọgwụ mgbochi nke a.

Ebe foto si, AFP
Ihe a ga eme ka ọgwụ mgbochi a bụrụ nke kachasi gọọmentị mee gbasara ọrịa yelo fiva.
Ọgwụ mgbochi a bụ maka ikpochapụ oria yelo fiva na afọ 2026.
Ịgba Ọgwụ mgbochi a ga ebido na steeti Kogi, Kwara na Zamfara.
Na Bornu Steeti, gọọmentị ga-enye ọgwụ mgbochi a n' ebe ndị na- agba ọsọ ndụ na-ebi (IDP camps).

Mgbasa ọria yelo fiva na Naijiria ugbua

- O bido na ọnwa Seputemba na afọ 2017 na Kwara Steeti
- Mmadụ narị atọ, ịrị ise na asatọ bụ ndi nwere oria nke a na steeti ịrị n'isi na onwa Januwarị na afọ 2018
- Steeti isi bụ Kano, Kebbi, Kogi, Kwara, Nasarawa na Zamfara nwere ọrịa nke a
- Ndị nwere ọrịa nke a bụ ndị na karịrị afọ ịrị abụọ bụrụ 65.9%.
Onye kwuru: WHO

Gịnị bụ yelo fiva?
Yelo fiva bụ ọrịa ahụụnta na-ebute.
Ugbua, otu WHO na-ekwu na ọrịa ahụ amalitela na obodo Ifelodun na Kwara Steeti.
Ha kwukwara na ihe dịka mmadụ nari atọ, ịrị ise na asatọ nwere ike ị nwe ọrịa yelo fiva na steeti ịrị na isi na ala Naijiria.
Nke a emeela ka mmadụ ịrị na isi nwụọ.
Gini ka akwusi oria yelo fiva?
Ọ bụlụ na ịgba bere ọgwụ mgbochi, ihe ị kwesịrị ịme bụ ị kwụsị ọtịta ahụhụ n'ebuta iba.

Ebe foto si, AFP
"Anyị niile kwesịrị ị nwe ụlọ mgbochi ahụụnta. Naani ya ga kwụsị oria yelo fiva," Dọkịta Mgbolu kwuru.









