E nwetela ọgwụ ọgwụgwọ ọria ịba mbụ nke ụmụaka a mụrụ ọhụrụ

Nwata nwoke na-ele anya n'aka dịka a chọrọ ịgba ya ọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E nwere ọgwụ maka ọgwụgwọ ọrịa ịba nke ụmụaka mana ọ dịghị mma maka ụmụ ọhụrụ
    • Onye dere ya, Dominic Hughes
    • Ndị mere akụkọ a, Global Health Correspondent
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

A kwadola ọgwụ mbụ dị mma e ji agwọ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na obere ụmụaka ọrịa ịba.

A na-atụ anya na a ga-ebubata ọgwọ ahụ na mba dị na mpaghara Afrịka n'ime izu a.

Ruo ugbua, e nwebeghị ọgwụ ndị ọrụ ahụike kwadoro maka ịgwọ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ọrịa ịba kama, a na-eji ọgwụ nke bụ maka ụmụaka ndị toro eto obere were agwọ ụmụaka ọhụrụ nke nwereike i butere ha ihe ize ndụ sitere na ịṅụbiga ọgwụ oke.

Ọkara nde ụmụaka nwụrụ n'afọ 2023 site n'ọrịa ịba

N'afọ 2023, ihe ruru ọnwụ mmadụ narị puku ise na iri itoolu na asaa (597,000) ka e kwuru na ọ bụ ọrịa ịba kpatara ya.

Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọnwụ niile si n'Afrịka, dịka ụzọ atọ n'ime ha bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

E nwere ọgwụ ọrịa ịba nke ụmụaka mana e nwebeghị nke ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na obere ụmụaka ndị arụ ha na-erubeghị 4.5kg.

Nke a mere e ji were ọgwụ nke ụmụaka ndị toro eto agwọ ha ọrịa ịba.

Ndị ọkachamara kwuru na nke a nwereike ịkpata ihe ize ndụ n'ụmụaka bụ ndị imeju ha ka na-eto eto ma ahụ ha na-ahazi ọgwụ n'ụzọ dị iche.

Ugbua, ndị ọchịchị Swiss akwadola ọgwụ ọhụrụ nke ụlọọrụ Novartis mepụtara nke e nwereike ibubata n'ime izu a na mpaghara dị icheiche, ọkachasị mba ndị ọrịa ịba na-eme karịa .

Ụlọọrụ Novartis na-ejikere iwepụta ọgwụ ahụ n'ebe ọ dị ukwuu nke na-abụghị maka ihe nrite.

Nke kacha nta na nke kachasị adịghị ike

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Vas Narasimhan kwuru na nke a bụ oge dị mkpa.

"Ihe karịrị afọ iri atọ ka anyị nọ na-aga n'ihu n'ọgụ a na-alụso ọrịa ịba, na-arụsi ọrụ ike iji nwee ọganihu sayensị n'ebe kachasị mkpa.

"Anyị na ndị anyị na ha na-emekọrịta ihe na-enwe obiụtọ na anyị gara n'ihu iwepụta ọgwụgwọ ọrịa ịba nke mbụ maka ụmụ a mụrụ ọhụrụ na ụmụ ọhụrụ, na-ahụ na ọbụna ndị kasị nta na ndị na-adịghị ike nwere ike nweta nlekọta kwesịrị ekwesị."

Ọgwụ a, nke a maara dịka Coartem Baby maọbụ Riamet Baby na mba ụfọdụ, bụ Novartis na ndị otu ha gụnyere Medicines for Malaria Venture (MMV), bụ ụlọọrụ na-anaghị akwụ ụgwọ na Switzerland nke gọọmentị Briten, Switzerland na Dutch kwadoro na mbụ, ya na World Bank na Rockefeller Foundation, mepụtara ya.

Mba asatọ dị n'Afrịka sonyere na nnoycha ọgwụ ahụ, ha bụkwa ndị a na-atụ anya na ha ga-esonye na ndị mbụ ga-enwete ya.

Onyeisi ụlọọrụ MMV bụ Martin Fitchet kwuru na nke a bụ ụzọ dị mkpa maka imeri ọrịa ịba.

"Ọrịa ịba bụ otu n'ime ọrịa na-egbu egbu n'ụwa, ọkachasị n'etiti ụmụaka. Ma na-ijide ezigbo ego na itinye uche, nwereike iwepụ ya.

"Nkwado nke Coartem Baby wetere ọgwụ dị mkpa n'usoro kachasị mma iji gwọọ otu ndị ọrịa a na-eleghara anya ma wete enyemaka bara uru n'ọrụ mgbochi ịba."

Dr Marvelle Brown, osote ọkammụta na Mahadum Hertfordshire's School of Health, Medicine and Life Sciences, kwuru na e kwesịrị ịhụ nke a dịka nnukwu ọganihu n'ichekwa ndụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na ụmụaka.

"Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ site n'ọrịa ịba, karịsịa na ndịda ịkpa Afrịka dị oke elu - ihe karịrị pasenti 76 nke ọnwụ na-eme na ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

"Mmụba ọnwụ n'ihi ịba na-abawanye n'ụmụ a mụrụ ọhụrụ ndị nwere ọrịa sickle cell, nke bụ maka adịghị ike nke usoro ahụ eji alụso ọrịa ọgụ.

"N'ihi ahụike ọhanaeze, ụlọọrụ Novartis mere nke a dịka ọrụ abụghị maka uru, kama nke nwereike inye aka n'ibelata adịghị nhatanha n'inweta nlekọta ahụike."