Ihe mere ịmụta nwa ji agbada n'ike na mbaụwa ugbua dịka United Nations si kwuo

Foto na-egosi obere nwata a fụchiri akwa ka ọ na-achị ọchị.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnyocha e mere mmadụ 14,000 gosiri na otu n'ime mmadụ ise zara ajụjụ kwuru na ụmụ ole ha mụtara abụghị ọnụọgụgụ ha bu n'obi ịmụta.
    • Onye dere ya, Stephanie Hegarty
    • Ndị mere akụkọ a, Population correspondent
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Namrata Nangia na dị ya na-enwe na-atụgharị uche ịmu nwa ọzọ kamgbe ha mụchara nwa ha nwaanyị dị afọ ise.

Mana ajụjụ ha bụ: 'Anyị o nwereike imenwu ihe dị na ya?'

Namrata na dịya bi na Mumbai na-agbalị ike ha niile ịzụ otu nwa ha mụrụ mana izulite ụmụaka abughị ihe dị mfe. Ikwu ụgwọ ụlọakwụkwọ na ụgbọala na-ebu nwa ha aga akwụkwọ na ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị cheere ha aka mgba. Namrata na-aru ọrụ ebe a na-ere ọgwụ ma di ya na-aru ebe a na-ere taya ụgbọala.

Ihe agbanweela, mgbe Namrata na-etolite, ihe ọ maara bụ naanị ịga n'ụlọakwụkwọ mụọ ihe na-enweghi ihe mgbakwụnye ndị ọzọ. "Anyi na-aga ụlọakwụkwọ mana enweghị ihe ọzọ na-eso ya mana ugbua ọ bughị sọsọ ịziga nwa gị ụlọakwụkwọ, ị ga akwụrụ ya ụgwọ ịgwu mmiri, ugwọ imu ka e si ese ihe na ihe ndị ọzọ.

Dịka akwụkwọ ngalaba ụlọọru United Nations na-ahụ maka ikike ịmụ nwa bụ United Nations Population Fund (UNFPA) mere, ọnọdụ Namrata na-aghọ nsogbu zuru ụwa ọnụ.

Ha dọrọ ndị mmadụ aka na-nti ma kwuo na ọtụtụ nde mmadụ enweghị ike imu ọtụtụ ụmụaka ka ha si chọọ ma kwuo na ihe kpatara a bụ ọke ọnụahịa ọ dị ịbụ nne na nna nakwa enweghi onye mmekọ kwesịrị ekwesị.

Otu UNFPA mere nyocha a site n'ịgba ọtụtụ mmadụ ruru 14,000 n'ime mba 14 ajụjụọnụ ịmata ụmụ ole ha ga-achọ imu. Otu n'ime mmadụ ise a jụrụ ajụjụ sị na ha enweghị ụmụ ole ha bu n'obi imu.

Mba ndị e nyochara gunyere Saụt Korea, Thailand, Italy, Hungary, Germany, Sweden, Brazil, Mexico, Amerịka, India, Indonesia, Morocco, Saụt Afrịka, na Naịjiria nke ọnụọgụgụ ha bụ otu ụzọ n'ụzọ atọ nke ọnụọgụgụ mmadụ zuru ụwa ọnụ.

Ndi a gụkọtara ndị si mba dị ala, nke etiti na mba ndị nwere nnukwu ego ya na ndị nwere obere na nnukwu ọmụmụ. UNFPA nyochara ndị na-eto eto na ndị gaferela afọ ịmu nwa.

Dkt. Natalia Kanem onyeisi ọrụ UNFPA si na "ikikere imu nwa na mbaụwa na-agbatu n'ike n'ike"

"Ọtụtụ ndị e nyochara chọrọ ụmụaka abụọ maọbụ karia. Ikike ịmụ nwa na-ada n'ebe ọ dị ukwuu maka na ndị mmadụ enweghi ike ịmepụta ezinaụlọ ha chọrọ. Nke ahụ bụ ebe nnukwu nsogbu," ka o kwuru.

Onye nọọsụ kuu nwata a mụrụ ọhụrụ na-ebe akwa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dkt. Natalia Kanem onyeisi ọrụ na ngalaba UNFPA si na "ikikere imu nwa na mbaụwa na-agbatu n'ike n'ike."
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye na-edepụta akwụkwọ gbasara mmadụ Anna Rotkirch na-ekwu, onye nyochara ebumnuche ọmụmụ na Yuropr wee dụọ gọọmentị Finland ndụmọdụ gbasara ọnụọgụgụ ndị mmadụ sị na nsogbu gbasara ịmu ọtụtụ ụmụaka bụ "ezigbo nsogbu n'ezie"

Ọ sị na o nyochaala ihe gbasara ọmụmụ na Yurope ma chọpụta na "e nwere mwepu n'okpuru ala karịa imebiga ihe oke nke echiche ọmụmụ."

Ọ tụrụ ya n'anya ka ọtụtụ ndị zara ajụjụ gafere 50 (31%) kwuru na ha nwere ụmụaka ole na ole ka ha chọrọ.

Nnyocha ahụ, nke bụ nke obere a ga-eme na mba 50 n'ime afọ a, nwere obere nsogbu dị ya n'ime dịka a bịa n'ọgbọ dị iche iche n'ime obodo, nleba nha dị ntakịrị iji mee nkwubi okwu mana enwere ụfọdụ nchoputa doro anya:

Na mba niile, 39% ndị mmadụ kwuru na ụkọ ego gbochiri ha ịmụ nwa dịka nzaghachi kachasị elu bụ nke emere na Korea (58%), nke kachasị di ala bụ na Sweden (19%).

Na mkpokọta, sọsọ mmadụ 12% kwuru na ha nwere nsogbu atughị atu ma amughị amu nke kpatara ha enweghị nwa mana ọnụ ọgụgụ a karịrị na mba Thailand (19%), Amerịka (16%), Saụt Afrịka (15%), Naịjiria (14%) na India (13%).

Ọkammụta Stuart Gietel-Basten, onye na-eme nchọpụta na Mahadum Sayensị na Tekịnụzụ n'isiobodo Hong Kong kwuru na "Ihe a bụ mbụ UN na-apụta n'ike ikwu okwu banyere nsogbu obere ọmụmụ.

Na mbụ ihe ha na-eme bụ ihe gbasara ụmụ nwaanyị nwere ọtụtụ ụmụaka karịa ka ha chọrọ ya na "ezuteghị mkpa" maka igbochi afọ ime.

Na-agbanyeghị nke a, UNFPA na-adọ aka na ntị maka ịkpachara anya na nzaghachi maka ọmụmụ dị ala.

Ka ọ dị ugbua, dọkinta Kanem si "ihe anyị na-ahụ bụ ọtụtụ ọdachi banyere n'ọnụọgụgụ mmadụ maọbụ na-ebelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ, nke na-eduga n'ụdị nzaghachi ikwubiga okwu ókè, na mgbe ụfọdụ nzaghachi aghụghọ,"

Na ihe gbasara ime ka ọtụtu ndị nwannyị ị nwe oke ụmụ maọbụ nbelata ụmụ, dọkinta Kanem si na Afọ 40 gara aga, Chaina, Korea, Japan, Thailand na Turkey nwere nchegbu na ọnụọgụgụ ha karịrị akarị mana na afọ 2015 ha chọrọ ịkwalite ọmụmụ.

UNFPA chọpụtara ihe mgbochi ka ukwuu nye ọmụmụ ụmụaka karịa ego, ha si na ọbụ enweghị oge. Maka Namrata na Mumbai nke ahụ bụ eziokwu.

Namrata si ọ na-eji opekata mpe awa atọ kwa ụbọchị na-aga n'ụlọọrụ ya ma laghachi. Mgbe ọ lọta n'ụlọ, ike na-agwu ya mana ọ na amasi ya ka ya na nwa ya nwanyị nọrọ oge. Ezinụlọ ya anaghị ehi ụra nke ukwuu.

"Mgbe ụbọchị ọrụ gasịrị, o doro anya na ị nwere ikpe ọmụma ahụ, ịbụ nne, na ị naghị etinye oge zuru ezu na nwa gị," "Ya mere, anyị ga-elekwasị anya na otu."