Ọnwụ otu onye kwa nkeji asaa: Mba kachasị njọ ịnọrọ mụọ nwa n'ụwa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa health correspondent, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Oge ọ dị afọ 24, Nafisu Salahu nọ n'ize ndụ isonye n'ọnụọgụ ụmụnwaanyị na-anwụ kwa nkeji asaa oge ha na-amụ nwa na Naịjirịa.
Ime ime nwaanyị oge ndị dọkịta na-agba abụbụọrụ pụtara na, e wezuga na ị nọ n'ụlọọgwụ, agaghị enwe enyemaka onye ọkachamara, ọ bụrụ ma nsogbu dapụta.
Isi nwa ya tọrọ atọ, dịka a gwara ya nọrọ jụụ ebe ọ tọgbọrọ n'ihe mgbu ọmụmụ nwa, bụ nke were ụbọchị atọ.
E mechara nye ntụziaka ka a waa ya afọ ma chọta kwa dọkịta dị njikere ime ya.
"Ekelere m Chineke maka na anwụchaala m. O nweghị ume fọrọ m n'ahụ, e nweghị ihe ọbụla fọdụụrụ m," ka Salahu si Kano steeti gwara BBC.
Isi ya pụtara mana nwa ya nwụrụ. Ka afọ iri na otu gara, ọ gaghachiri ụlọọgwụ ịmụ nwa ọtụtụ oge mana omume ya gbanwere. "Amaara m na [oge ọbụla] anọ m n'etiti ọnwụ na ndụ mana ụjọ adịghịzi m," ka o kwuru.
Ihe Salahu gabigara abụghị ụdị ihe ahụtụbeghị mbụ. Naịjirịa bụ mba kachasị njọ n'ụwa ịnọrọ mụọ nwa.
Ihe ndekọ otu mbaụwa (UN) wepụtara na nso nso a maka Naịjirịa, bụ nke a pịakọtara site n'afọ 2023, otu n'ime ụmụnwaanyị 100 na-anwụ n'oge ọmụmụ nwa maọbụ n'ime ụbọchị ndị na-esote.
N'afọ 2023, Naịjirịa tụnyere 29% nke ụmụnwaanyị niile nwụrụ oge ha na-amụ nwa n'ụwa.
Nke ahụ bụ ọnụọgụ ụmụnwaanyị ruru 75,000 ndị na-anwụ n'oge ọmụmụ nwa kwa afọ ọbụla, nke pụtara ọnwụ otu nwaanyị kwa nkeji asaa.
Ịdọ aka na ntị: Akụkọ a nwere foto na-egosipụta nwa a mụrụ ọhụrụ.

Ebe foto si, Henry Edeh
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ihe na-agwụ ọtụtụ mmadụ ike bụ na ọtụtụ n'ime ọnwụ ndị a, site n'ihe dịka ọbara ịgbagbu nwaanyị bụ nke a pụrụ igbochinwu.
Chinenye Nweze dị afọ 36 oge ọbara gbagburu ya n'otu ụlọọgwụ dị n'Ọnịcha, afọ ise gara aga.
"Ndị dọkịta chọrọ ọbara," ka nwanne ya nwoke bụ Henry chetara. "Ọbara nke ha nwere ezughị oke dịka ha na-agbakeri ala. Ọnwụ nwanne m nwaanyị na enyi m abụghị ihe m ga-achọ ka ọ dakwasị onye iro m. Ihe mgbu ya bụ nke ọnụ apụghị ịkọ."
Ihe ndị ọzọ na-ebute ọnwụ n'oge ọmụmụ nwa bụ ọbara mgbali elu na itepụ ime n'ụzọ ezighị ezi.
Dịka Martin Dohlsten nke ụlọọrụ Unicef na Naịjirịa siri kwuo, ọtụtụ ihe na-ebute ogogo dị elu nke ọnwụ n'oge ọmụmụ nwa na Naịjirịa.
Dịka o siri kwuo, ihe ndị a gụnyere ụkọ akụrụngwa e ji elekọta ahụike, enweghị ndị ọrụ ahụike zuru oke, nnukwu ego e ji agwọ ọrịa, nkwenye ọdịnaala ndị pụrụ ibute enweghị ntụkwasịobi n'akaọrụ ndị ọkachamara na-elekọta ahụike nakwa ọnọdụ enweghị nchekwa.
"No woman deserves to die while birthing a child," says Mabel Onwuemena, national co-ordinator of the Women of Purpose Development Foundation.
"Ọ nweghị nwaanyị kwesịrị ịnwụ oge ọ na-amụ nwa," ka Mirable Onwuemena, onye nchịkọta otu Women's of Purpose Development Foundation kwuru.
Ọ kọwara na ọtụtụ ụmụnwaanyị, ọkachasị n'ime ime obodo kwenyere na "ịga ụlọọgwụ bụ igbu oge" dịka ha họọrọ "usoro ọdịnaala karịa ịchọ enyemaka n'ụlọọgwụ, bụ nke nwereike ịdọghachi nlekọta nke na-azọ ndụ".
Maka ndị ọzọ, ịga ụlọọgwụ bụ nke ekweghị omume n'ihi enweghị usoro ime njem mana Onwuemena kwenyere na ọ bụrụ na e lebara ihe ndị a anya, nsogbu ha niile ga-akwụsị.
"Ọtụtụ akụrụngwa e ji elekọta ahụike enweghị ngwaọrụ na ndị ọrụ zuru oke, bụ nke mere o jiri raa ahụ ịrọpụta ezi nlekọta."
Ka ọ dị ugbua, Gọọmentị Naịjirịa na-emefu naanị 5% nke bọjeti ha maka ahụike, bụ nke na-erughị 15% mba ahụ kwere na nkwa na nkwekọrịta otu African Union nwere n'afọ 2001.
N'afọ 2021, e nwere ndị ọghọọ nwa 121,000 maka ọnụọgụ mmadụ dị nde 218 nke onye ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma na-elekọta ihe erughị ọkara ọmụmụ nwa niile. E kwuru na mba ahụ chọrọ ndị nọọsụ na ndị ọghọọ nwa ruru 700,000 iji ruo ogogo ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO wepụtara.
E nwere ezigbo ụkọ ndị dọkịta. Ụkọ ndị ọrụ na ngwa ahụike mere ka ụfọdụ ghara ịchọ enyemaka ndị ọkachamara.
"N'eziokwu, e nweghị m ezi ntụkwasị obi n'ụlọọgwụ, anụla m ọtụtụ akụkọ ndị e leghaara anya, ọkachasị n'ụlọọgwụ ọhanaeze dị iche iche," ka Jamila Ishaq kwuru.
"Ịmaatụ, oge m na-amụ nwa m nke anọ, ezutere m nsogbu n'oge ọmụmụ nwa. Onye na-aghọ nwa gwara anyị gaa ụlọọgwụ, mana oge anyị ruru, o nweghị onye nlekọta ahụike nọ nso i nyere m aka. Nke ahụ mere ka m laghachi n'ụlọ, ọ bụzi ebe ahụ ka m mechara mụọ nwa," ka ọ kọwara.
Nwaafọ Kano ahụ dị afọ 28 na-ele anya nwa ya nke ise.
Ọ gbakwunyere na ya ga-atụle ịga n'ụlọọgwụ ndị nkịtị nwe mana ego ha dị nnukwu.
Chinwendu Obiejesi na-atụ anya nwa ya nke atọ pụrụ ịkwụ ụgwọ maka nlekọta n'ụlọọgwụ ndị nkịtị dịkwa ka "ọ gaghị eche echiche ịmụ nwa ya ebe ọzọ".
Ọ sịrị na ọnwụ n'oge ọmụmụ nwa adịghịzi n'ezinaụlọ ya nakwa n'etiti ndị enyi ya dịka ọ dịbu na mbụ.
O bi na mpaghara nke ndị akajiakụ n'Abuja, ebe ụlọọgwụ dị mfe inweta, okporoụzọ ya dị mma dịkwa ka ndị ọrụ gbatagbata na-arụ ọrụ.
"Ana m aga nlekọta nke ụmụnwaanyị dị ime oge niile... Ọ na-enyere m aka mụ na ndị dọkịta inwe mkparịtaụka kwa mgbe kwa mgbe, mee nnyocha ahụ ndị dị mkpa ma matakwa ọnọdụ ahụike nke mụ na nwa m bu n'afọ," ka Obiejesi gwara BBC.
"Ịmaatụ, oge m dị ime nwa m nke abụọ, ha tụrụ anya na ọbara ga-agba m nke ukwuu, nke ahụ mere ha ji kwado ọbara. Ekele dịrị Chukwu na ihe niile gara nke ọma, achọghịkwa m ya."
Ka o sina dị, otu enyi ezinaụlọ ya enwechaghị ihu ọma.
Oge ọ na-amụ nwa nke abụọ ya, "ọghọọ nwa apụghị ikupụta nwa ya, nke a mere o ji gbaa mbọ ime ya n'ike. Nwa ahụ nwụrụ. Mgbe e bugara ya ụlọọgwụ, ọ bụrụ na oge agaala. A wara ya ahụ iji kupụta ozu nwa. Ọ bụ ihe na-agbawa obi."

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụlọọrụ National Primary Health Care Development Agency (NPHCDA), bụ Dọkịta Nana Sandah-Abubakar, kwetara na ọnọdụ a bụ ihe juru anya mana ha amalitela atụmatụ iji gbochie ya.
N'ọnwa Nọvemba gara aga, gọọmenti Naịjirịa malitere atụmatụ mbọ nke Maternal Reduction Innovation Initiative (Mamii). Ha kwuru na ebumnobi ha bụ na atụmatụ ga-eru okpuru ọchịchị 172 dị na steeti 33.
N'okwu ya "Anyị na-achọpụta ụmụnwaanyị dị ime, ebe ha bi ma nye ha nkwado ruo oge ha ga-amụ nwa".
Ka ọ dị ugbua, anyị achọpụtala ụmụnwaanyị dị ime ruru 400,000 na steeti isii site na nnyocha anyị mere nke gwara anyị ka ha na-eweta nleta ante-natal.
Ebumnobi anyị bụ ime ka ha malite inweta nkwado na nleta zuru oke nke ha kwesịrị inweta n'oge a.
Mamii na ụlọọrụ njem okpuru ọchịchị ga-ejikọ aka hụ na e bugara ọtụtụ ụmụwaanyị ụlọogwụ ma mee ka ụmụnwaanyị dị ime debanye aha n'atụmatụ nchekwa ahụike bekee kpọrọ Health Insurance.
Anyị enweghị ike ikwu ugbua ka mboa anyị amịtala mkpụrụ mana ndị ọchịchị obodo kwuru na ha nwere olileanya na ndị mba ahụ ga-anabata atụmatụ a nke mba ụwa niile nabatara.
N'ụwa niile, pasentị 40% ọnwụ ụmụnwaanyị dị ime ebelatala kemgbe afọ 2000, nke a bụ maka mbọ ndị ọrụ ahụike.
Ọnụọgụ ahụ agbagọọkwala na Naịjirịa n'otu oge ahụ kama ọ bụ naanị 13%.
N'agbanyeghị Mamii na ihe omume ndị ọzọ a nabatara, ụfọdụ ndị ọkachamara kwenyere na a ka nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ime, nke gụnyere itinye ego.
"Ọganihu ha dabeere na nkwado ego, itinye atụmatụ n'ọrụ na ịga n'ihu na-elebara ya anya iji hụ na e nwetazuru ebumnobi ndị a chọrọ," ka Dohlsten kwuru.
Ka ọ dị, ọnwụ ndị nne na Naịjirịa, nke bụ mmadụ 200 kwa ụbọchị ga-aga n'ihu na-abụ ihe mwute nyere ezinaụlọ ndị o metụtara.
N'ebe Maazị Edeh nọ, iru uju ọnwụ nwanne ya nwaanyị ka bụ ihe ọhụrụ.
"O bilitere bụrụ ebe ndabere anyị maka na nne na nna anyị nwụrụ oge anyị ka na-etolite etolite," ka o kwuru.
"M cheta ya oge ọbụla naanị m nọ, ana m ebe ezigbo akwa."










