Akụrụngwa ndị i ji eme ntecha o nwereike ibutere gị nsogbu n'ahụ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Nazanin Motamedi
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Ịgwa gị eziokwu: Kedụ mgbe ikpeazụ i nyochara iji maara mgbe ihe ntecha gị ga-emebi? Ihe ntecha oge mmebi ya rurula gafee o nwereike ime ihu maọbụ ahụ gị, maọbụ tinye ahụike gị n'ọnọdụ ọjọọ?
Ugboro ole kwa mgbe ka ị na-asa brọshụ i ji eme ntecha? Ị natụrụla enyi gị ihe ntecha ya maọbụ tụlee nke a na-ere n'ahịa? Kedụ akụrụngwa ndị i ji eme ntecha kachasị nwee nje 'bacteria' n'ime ya - Maskara, tiro, sapo maọbụ brọshụ?
Ekwetere m, abụghị m ọkachamma n'idosa ihe ntecha m ọcha maọbụ n'ichọpụta ụbọchị ọ ga-emebi, ya mere m ji kpebie inyocha ha - n'igwe nnyocha 'microscope' dị na Mahadum Lọndọn, nke mba Briten.
Dkt. Maria Pilar Botey-Salo, onyenkuzi dị elu na ngalaba ọmụmụ ihe Sayensị banyere mmadụ nyere aka na nyocha ahụ. Ọ nọ n'isi nnyocha karịrị 70 e mere akụrụngwa ntecha gụnyere 'eyeliner', maskara, 'lip gloss', 'lipstick', paụda tinyere brọshụ (nke m so na ndị e nyochara).
E were uru akụrụngwa ntecha ndị a tinye ha n'efere nnyocha a kpọrọ 'agar plate'. A malitere inyocha ha n'igwe inkubatọ iji chọpụta ihe dị ha n'ime.

Kedụ ụdịrị nje dị n'ime ihe ntecha?
Ọtụtụ nje 'bacteria' dị n'ime efere nnyocha ahụ.
"Ihe a na-akpa n'anya bụ mkpịsị anya kachasị nwee nje, o nwere nnukwu nje 'bacteria' karịa ihe ntecha ndị ọzọ,," ka Dkt. Botey-Salo kwuru. O kwuru na o nwereike ọ bụrụ mkpisi anya nwetere nje 'bacteria' ahụ site n'anụahụ, nke gụnyere staphylococcus, dịka o meturu na nku anya.
Ekwetere m na m na-edosa akpa ihe ntecha m n'ụlọ ebe a na-asa ahụ, ma hapụ ihe mkpa n'anya m ọtụtụ oge tupu m tee ya n'anya.
"Ya mere, o nwereike ị bụ ya butere ya, ka Dkt Botey-Salo kwuru. "Ọ bụrụ na ijiri mmiri dị n'ime ụlọ ịsa ahụ metụ ya, ọ ga-eme ka nje banye na ya. Anyị hụkwara nje Staphylococcus n'akụrụngwa ndị ọzọ gụnyere brọshụ, sapo na maskara."
Staphylococcus nwereike ibute ọrịa dị iche iche - site n'obere ọkọ ruo na nje ndị dị ukwuu dịka 'conjunctivitis', 'erysipelas' na 'impetigo'.
Gịnị mere e nwebeghi nje ndị a na-agbanyeghi na mkpana n'anya na a hụrụ nje na mkpana anya m?
Dkt Botey-Salo kọwaara: "Ọ bụrụ na o nweghi ihe mere ahụ gị, ị maara na o siri ike, nke gosiri na o nwere ike na o nweghi ga-eme. Mana ọ bụrụ na i merụrụ ahụ maọbụ ọnya n'ahụ gị, ebe ahụ ka nje 'bacteria' nwereike isi banye ma mebie ihe. Ọ bụrụ akụrụngwa ahụ gị esighi ike, nke a nwekwara ike ịbụ nsogbu.

Ịsa aka mmiri dị oke mkpa
Ị na-asa aka gị tupu ibido ite ntecha? Aka nwereike ọtụtụ unyi, nke bụ na ma a sapụghị ya ọcha, e nwereike itinye nje n'ime akụrụngwa e ji eme ntecha. Nke a bụ ihe na-emekaarị ma e jiri aka na-ete mkpa n'anya, ude ọnụ ma paụda ihu.
Dkt Botey-Salo yochapụtara ihe ndị na-atụ n'anya. "Anyị hụrụ nje 'Enterobacter cloacae, ụdịrị 'bacteria' a na-ahụ n'ime eriri afọ mmadụ n'ime ọtụtụ akụrụngwa ndị e ji eme ntecha.
"Nke a gosiri na ọ bụ nje e butere site na nsị, site na-edosaghi ebe ọcha maọbụ ikuku mmiri si n'ụlọ mposi."
Nnyocha gosiri na ọ bụrụ a sachaa ọdọ mposi, na e nwere ikuku mmiri na-agbasa nke ogogo ya nwereike iru mita abụọ n'ime nkeji ole ma ole. Ikuku mmiri ndị a nwere nje a kpọrọ 'Enterbacter'. Ya mere ọ bụrụ na akụrụngwa ntecha gị nọ nso, nje 'bacteria' nwereike imetụ ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ nje 'enterobacter' nwereike ibute ọrịa, gụnyere ọrịa ịnyụ mamịrị, ọrịa iku ume, na ọrịa ndị a kpọrọ 'osteomyelitis' na 'endocarditis'.
Nnyocha ndị e mere na mbụ gosiri na nje 'E. coli' - na-esi na nsị - nwereike ịbụ ndụ n'ime akụrụngwa ndị e ji eme ntecha. Nke a bụ ihe ịtụegwu maka na e ji akụrụngwa ndị a ete n'ihu ma n'akụkụ anya.
Ndị nnyocha na Mahadum Metropolitan hụkwara nje 'fungus' a na-akpọ 'candida' n'ime akụrụngwa ndị e ji eme ntecha. Ọ bụrụ na nje 'fungus' baa n'ime ahụ nwaanyị, o nwereike ibute ọrịa a kpọrọ 'vaginal candidiasis maọbụ 'ọral candidiasis' e ji 'thrush' maara.
A gara n'ihu mee nnyocha ọzọ na Mahadum Aston dị na Birmingham mba Briten n'isi akụrụngwa ntecha ruru 500. Nnyocha a gosiri na pasentị 79% ruo 90% n'ime akụrụngwa ndị mmadụ ji eme ntecha nwere otu nje 'bacteria' maọbụ 'fungus'. Nke a gụnyere ndị obere ruo na ndị na-agba nnukwu ike dịke 'E.coli'.
Dkt Amreen Bashir, onyendu ndị nnyocha a kwuru: "Na-agbanyeghi na e nwere nje n'ime akụrụngwa ntecha ụfọdụ, ọ pụtaghi na ha niile nwereike ibute ọrịa. Nje ndị a na-achọ ntọala ha nwereike iji banye n'ahụ, dịka mmerụ ahụ, asụmmiri, imi maọbụ site n'itinye n'ọnụ. Idosa ebe ọcha gụnyere, ịsa ihe, maọbụ tufuo ndị nke meburu emebi nwereike ibelata nje ndị a ịbanye n'ahụ.
Mkpa ọ dị ịmata mgbe ihe kwesịrị imebi
Ụbọchị e nyere na ihe ga-emebi dị mkpa ma na ọ na-egosi oge akụrụngwa nchekwa e tinyere n'ime ha ga-eji akwụsị ịrụ ọrụ ọfụma. Akụrụngwa ndị nwere mmiri n'ime ha na-ebute nje ngwa ngwa ma ọ bụrụ e mepee ha, maka na ha na-ewete ọnọdụ dị mma na-enyere 'bacteria' na 'fungi' aka ito.
Ohere e nyere make akụrụngwa ndị a imebi bụ n'agbata n'ọnwa atọ ruo n'ọnwa iri na abụọ malite na mgbe e mepere ya.
"Ọ bụrụ na akụrụngwa ntecha enweghi mgbe a sị na ọ ga-emebi, ndụmọdụ bụ ka a tụfuo ya ma ọnwa atọ gachaa maọbụ ngwa ngwa a chọpụtara na nje nwereike ịbanye na ya, ịmaatụ, ma e dosa ya n'ala maọbụ onye ọzọ were ya mee ntecha, ka e belata nje," Dkt Bashir kwuru.
"Ọ bụrụ na o doghi onye ntecha anya ma ihe ntecha ya o mebiela, ọ ka mma ịhapụ ya zụọ ọzọ karịa ibute nje site na ya," ka ọ gbakwụnyere.

Akụrụngwa kachasị ebute nje na ụzọ mgbe ha
Nnyocha e mere na Mahadum Metropolitan dị na Lọndọn kwuru na akụrụngwa kachasị nwee ọtụtụ nje dị iche iche bụ maskara na paụda mmiri (liquid foundation) ebe ndị kachasị ibufe nje a bụ brọshụ, sapo a na-eji ete ntecha n'ihu.
"Akụrụngwa ndị nwere mmiri n'ime ha karịsịa gụnyere sapo na brọshụ nwereike ichekwa nje n'ime ha," ka Dkt Botey-Salo kwuru. "Nnyocha anyị gbagidere ụkwụ naanị na akụrụngwa ntecha ndị mebiri emebi nakwa ihe ndị e ji tee ha n'ihu."
Dkt Botey-Salo nyere ntuziaka ndị a iji gbochie ibute nje:
- Saa aka gị ọfụma tupu ị malite ime ntecha.
- A gakwala ebe a na-atụle ihe ntecha ga mee ntecha. Ị maghị ma ndị ji akụrụngwa mee ntecha ọ sara aka ha tupu ha e jiri ya.
- Hichaa akụrụngwa ndị dịka brọshụ, sapo kwa mgbe ọbụla n'ime mmiri ọkụ na ncha ma mee ka mmiri kọọ ha ọfụma. Mee ka ikuku mịkpọọ ha tupu itinye ha n'akpa dị iche ka nje ghara ịbanye n'ime ha site n'ikuku ọjọọ.
- Ebe kachasị njọ ichekwa akụrụngwa e ji eme ntecha bụ n'ime ebe a na-asa ahụ maọbụ n'ụlọ mposi maka na ọ gbara ọchịchịrị ma nwee ikuku mmiri.
- Paụda mmiri (Liquid foundations), maskara na mkpa n'anya kwesịrị ka e kwuchie ha ma dosa. Nke a bụ ka nje ndị nọ n'ikuku na uzuzu ghara ịba n'ime ha.
- Ṅṅa mara mgbe akụrụngwa ndị a ga-emebi. Dee ya n'akụkụ ahụ ha ebe ị ga-ahụ ya anya ọfụma iji chetara gị mgbe i kwesịrị itufu ha.
- Gị na mmadụ ekekwala akụrụngwa ndị i ji eme ntecha.
Ọ bụrụ na ị nọ n'ihe izendụ, ịji maa atụ, ihe na-ebuso nje agha n'ime ahụ gị esighi ike, ọ dị mma ka ị gbachara anya ọfụma, ka Dkt Botey-Salo kwuru.









