Ọ bụghị eziokwu na Dọkịta ji onyonyoo YouTube waa nwaanyị dị ime ahụ - NMA

Ọ bụghị eziokwu na Dọkịta ji onyonyoo YouTube waa nwaanyị dị ime ahụ - NMA

Ebe foto si, @nationalnma/X, BBC

Nkọwa foto, Njirimara ndị otu Nigerian Medical Association na njirimara Labech Hospital
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu jikọtara ndị ọrụ ahụike bụ Nigerian Medical Association (NMA) ekwuola na ọ bụghị eziokwu na dọkịta ji onyonyoo YouTube waa nwaanyị dị ime ma gbuo ya n'Imo steeti.

Osote onyeisioche NMA n'Imo steeti bụ Dkt John Ohiri kwuputara nke a n'ụbọchị Tọzde 13 Febụwarị 2025 oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ya ajụjụ n'ekwentị.

Dkt Ohiri kọwara na ọ bụ dọkịta nwaanyị nwe ya bụ ụlọọgwụ ihe ọdachi ahụ mere.

Ọ sịrị na ọbara malitere ịgba nwaanyị ahụ dị ime ka oge ọmụmụ nwa ya ruru. Ọnọdụ ahụ mere di ya ji kpọgharịwa ya n'ụlọọgwụ dị iche iche maka enyemaka.

"Ha gara ụlọọgwụ ruru anọ mana enweghị ndị kwere anabata ha tupu ha agaa n'ụlọogwụ Labech Hospital," ka Dkt Ohiri kwuru.

Ọ kọwara na mgbe a nabatara ha n'ụlọọgwụ Labech, dọkịta nwe ya bụ ụlọọgwụ kpọrọ dọkịta ọkachamara ọkwa ya dị elu ka ọ bịa nyere ya aka n'ihi ọnọdụ nwaanyị ahụ dị ime nọ na ya.

"Ha gbalịrị waa nwaanyị ahụ afọ ma kuputa nwa ya nwụrụ anwụ ma ka ihe dịka elekere atọ gara, nwaanyị ahụ anwụọ n'ihi nnukwu ọbara na-agba ya n'ahụ".

"Di ya malitere ibo ebubo edoghị ya anya n'ihi na ọ hụrụ ka ụfọdụ ndị nọọsụ ji ekwentị ha na-ekiri onyonyoo oge ọ gara n'ụlọọgwụ ahụ," ka o kwuru.

Dkt Ohiri gara n'ihu kọwaa na ụlọogwụ Labech Hospital bụ nke nwere nkwado mịnịstrị ahụike Imo steeti ebe ndị Dọkịta abụọ a na-ebo ebubo bụkwa ndị debanyere aha ha nke ọma dịka ndị Dọkịta.

YouTube vidio abụghị ihe dọkịta jiri waa nwaanyị dị ime ahụ - Kọmịshọna ahụike n'Imo steeti

A ka gbachiri ụlọọgwụ Labech Hospital and Maternity dị n'Ụrata n'Owere, isi obodo Imo steeti.
Nkọwa foto, Foto na-egosi ụlọọgwụ Labech Hospital and Maternity dị n'Ụrata n'Owere, isi obodo Imo steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Imo steeti bụ Dkt Success Prosper-Ohayagha akọwaala na ọ bụghị ihe onyonyoo YouTube ka Dọkịta jiri waa nwaanyị nwụrụ oge ọ na-amụ nwa ahụ.

Ohayagha kwuru nke a oge BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ n'ekwentị iji chọpụta nke bụ eziokwu gbasara nwaanyị dị ime a sị nwuru oge Dọkịta na-ekiri onyonyoo Youtube iji hụ ka ọ ga-esi waa ya ahụ.

Cheta na ndị na-efesa akụkọ na blọg n'ụbọchị 5 Febụwarị 2025 depụtara gbasara otu dọkịnta ndị uweojii nwuchiri maka ịwa ahụ nwaanyị dị ime site n'ile usoro ya n'onyoonyo Youtube.

Dịka kọmịshọna ahụ siri kwuo, ụlọogwụ ahụ bụ Labech Hospital bụ nke nwere nkwado mịnịstrị ahụike Imo steeti.

O kwukwara na ndị Dọkịta abụọ a na-ebo ebubo ahụ bụ ndị debanyere aha ha nke ọma dịka ndị Dọkịta.

Ọ gara n'ihu kwuo na "nnyocha ndị e merela eme gosiri na enweghị oge ọbụla ha bụ Dọkịta ji onyonyoo YouTube waa nwaanyị ahụ nwụrụ oge ọ na-amụ nwa ahụ dịka ụfọdụ mmadụ si ebugharị ya n'ọbaozi dị iche iche".

Dr Success Prosper-Ohayagha kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 12 Febụwarị 2025 ka e mere ozu nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ nnyocha iji chọpụta ihe butere ọnwụ ya.

"Anyị na-eme nnyocha gbasara okwu ahụ. Okwu ahụ dị n'aka ndị uweojii ugbua dịka anyị onwe anyị sokwa n'ime ya," ka kọmịshọna ahụ kwuru.

Ọ sịkwara na a kpọchiela ụlọọgwụ ahụ ka ọ dị ugbua iji hụ na e mere ezigbo nnyocha.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ya bụ ihe mberede.

Ka o sinadị, oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye n'ekwentị, ọ gwara anyị sị "ọ bụ eziokwu, anyị amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe mere."

Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị dị ime a sị nwụrụ oge Dọkịta ji onyonyoo Youtube awa ya ahụ n'Imo steeti

Ihe anyị ma maka nwaanyị dị ime a sị nwụrụ oge Dọkịta ji onyonyoo Youtube na-awa ya ahụ n’Imo steeti
Nkọwa foto, Ụzọ mbata ụlọogwụ Labech Hospital akpọchiri akpọchi
  • Ihe ọdachi mere n'Imo steeti na nso nso a dịka a sị na nwaanyị dị ime nwụrụ oge Dọkịta na-awa ya ahụ.
  • Akụkọ izizi pụtara kwuru na Dọkịta na-ekiri onyonyoo Youtube iji hụ ka ọ ga-esi waa ya ahụ. Mana kọmịshọna ahụike ekwuola na akụkọ a bụ akụkọ ụgha ndị na-ede akụkọ blọg tinyere ka akụkọ a fesaa.
  • Ozi anyị nwetara kwuru na ọ bụ n'ụlọogwụ Labech Hospital and Maternity dị na Nomsy Avenue, Old Local Government Estate Umuorii Uratta dị n'Okpuru ọchịchị Owerri North n'Imo steeti ka mkpamkpa ahụ kpara.
  • Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii Imo steeti anwụchiela ụfọdụ ndị nọọsụ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ dịka Dọkịta aka ya dị n'ọnwụ ya bụ nwaanyị dị ime riri mbọmbọ.

Gịnị ka ndị ụlọọrụ Labech kwuru

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru na mpaghara ahụ, ọ chọpụtara na a kpọchiela ya bụ ụlọọgwụ.

Ụfọdụ ndị ọ gbara ajụjụ ekweghị ekwu okwu mana otu n'ime ha sịrị na ha maara ebe ahụ dịka ụlọogwụ dịkwa ka ndị mmadụ na-abịa ebe ahụ maka ịnara ọgwụgwọ.

Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agba mbọ inweta di nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ nakwa otu jikọtara ndị ọrụ ahụike bụ Nigeria Medical Association (NMA) n'Imo steeti.