Ọ bụ ụlọ m rụrụ ọhụrụ ka ogbunigwe a gbariri - Onye nwe ụlọ ogbunigwe gbariri n'Imo Steeti
Ndị nwe ụlọ ahụ lara n'iyi oge ogbunigwe dara n'Imo steeti bụ Maazị Ike Austine na nwunye ya bụ Amarachi Ike ekwuola ezi mwute ha n'ajọ ọdachi ahụ dakwasịrị ha.
Ike na nwunye bụ ndị Ibiasoegbe dị n'Okpuru ọchịchị Oru West n'Imo steeti, kwuru na ha zụrụ ala ahụ ha rụrụ ya bụ ụlọ azụ.
Ọ kọwara BBC Igbo etu ha si weta ozi banyere ogbunigwe ahụ lara ụlọ ọhụrụ n'iyi.
Anyị amalitela ime nnyocha maka ihe gbara n'Umuneke Mbieri - Ndị uweojii Imo steeti

Ebe foto si, Imo State Police Command, BBC
Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha amalitela ime nntocha iji chọpụta ihe gbara n'Umuneke Ihitte Mbieri n'ụbọchị Sọnde 12 Jenụwarị 2025.
Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuputara nke a oge ya na onye ntaakụkọ BBC News Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị.
Okoye kwuru na ndị uweojii enwetala mkpesa banyere ihe ahụ gbara n'ụbọchị Sọnde ma garuokwa n'obodo ahụ.
Ọ sịrị na ndị uweojii amachiela mpaghara ahụ ya bụ ihe gbara dịka ha malitere ime nnyocha miri emi iji chọpụta ihe kpatara ya.
Ọ gara n'ihu gwa ndị bi n'obodo ahụ ka ha ghara ịtụ egwu n'ihi na ndị uweojii na-agbasi mbọ ike inye ha ezi nchekwa.
Cheta na ụfọdụ mmadụ akọwaala etu ha siri hụta ihe e chere bụ ogbunigwe a tụrụ n'obodo Umuneke Ihitte Mbieri dị n'Okpuru ọchịchị Mbaitoli n'Imo steeti, bụ nke kwaturu ma bibie ụlọ fọdụrụ obere ihe ka a rụchapụ ya.
Ebe niile mara jijiji oge ihe ahụ gbara - Ndị Umuneke Mbieri dị n'Imo steeti

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ mmadụ ekwuola etu ha siri hụta ihe e chere bụ ogbunigwe a tụrụ n'obodo Umuneke Ihitte Mbieri dị n'Okpuru ọchịchị Mbaitoli n'Imo steeti, bụ nke kwaturu ma bibie ụlọ fọdụrụ obere ihe ka a rụchapụ ya.
Ha mere ka anyị mata nke a oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo garuru n'obodo ahụ iji chọpụta ka mmiri si banye n'opi ụgbọghọrọ.
Ndị nwe ụlọ ahụ lara n'iyi bụ Maazị Ike Austine na nwunye ya bụ Amarachi Ike kwuru na ha bụ ndị Ibiasoegbe dị n'Okpuru ọchịchị Oru West n'Imo steeti mana ha zụrụ ala ahụ ha rụrụ ya bụ ụlọ azụ.
Ike kwuru na mmadụ abụọ kpọrọ ya n'ekwentị mgbe o jiiri ihe dịka nkeji iri na ise gaa elekere asaa nke ụtụtụ n'ụbọchị Sọnde 12 Jenụwarị 2025 gwa ya na a tụrụ ogbunigwe n'ụlọ ọhụrụ ya mana o kwetaghị n'ihi na o chere na ọ bụ egwu ka ha na-egwu.
"A gwara m nwunye m soro m ka anyị gaa mara ma ihe a gwara m n'ekwentị ọ bụ eziokwu maka na a gara m ebe ahụ n'ụbọchị Satọde gaa hụ ndị na-arụrụ m ọrụ".
"E rutere m ebe a chọpụta na ọ bụ eziokwu. Amaghị m ebe m ga-ebido maọbụ ihe m ga-eme. Ahụhụ niile m tara na ndụ bụ ihe a lara n'iyi," ka Maazị Ike kwara arịrị.

Eze na-achị Ihitte Mbieri bụ Eze Vitalis Ubasineke Achilike kwuru na ndị obodo nụrụ ihe gbara mgbe ọ kụrụ elekere mbụ nke ụtụtụ n'ụbọchị Sọnde.
Ọ sịrị na ya bụ ihe butere alaọmajijiji ma metụtakwa mpaghara obodo dị iche iche.
Eze Achilike sịrị na "ọ gbagwojuru anyị anya n'ihi na anyị ahụtụbeghị ụdị ihe a. Igwe redịọ ndị nche bidoro ikwu okwu malite n'oge ahụ ya bụ ihe mere ruo n'ụtụtụ. Ụmụafọ anyị ndị nọ mba dị iche iche kpọrọ na-ajụ gbasara ihe merenụ".
"Mụ na ndị oso Eze achị wuchiri ebe ahụ ụlọ dara n'ụtụtụ iji were anya anyị hụrụ ihe merenụ," ka Eze Achilike kwuru.

N'okwu nke ya, Egejuru Austine Tochukwu bụ President General ndị Ihitte Mbieri kwuru na ndị obodo ahụ hụrụ ihe na-efegharị n'elu mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji iri na anọ ka ọ kụọ elekere mbụ nke ụtụtụ n'ụbọchị Sọnde mana e nweghị onye maara ihe ọ bụ.
"Ụfọdụ mmadụ sị na ọ bụ ụgbọelu ndịagha ebe ndị ọzọ chere na ọ bụ droonu mana oge adịghị anya, anyị nụrụ oke mkpọtụ nke metụtara ụlọ n'obodo dị iche iche dịka Amaulu, Umunjam, Eziome, Umuneke na Obazu," ka Maazị Egejuru kwuru.
Ọ sịrị na e mere ka ndị uweojii mata gbasara ya ebe onyeisi ndị uweojii na Mbieri bụ Wet Ben na Onyeisioche Okpuru ọchịchị Mbaitoli bụ Ifunanya Nwanegwo gara ebe ahụ ụlọ dara iji were anya ha hụ ihe merenụ.
Onyendu ụmụnwaanyị Umualumaku Umuneke dị n'Ihitte Mbieri bụ Juliana Oparaeke kwuru na ihe ahụ gbara metụtara ụlọ ya nakwa ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ.
"Ihe ahụ dịka ogbunigwe maka na ọ bụghị gaasị," ka o kwuru.
Ụfọdụ ndị obodo kwukwara okwu gbasara ọnọdụ ahụ ma rịọ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa ka ha lebara okwu ahụ anya.
Ka o sinadị, BBC ka na-agba mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye iji mara ihe ha na-eme gbasara ọnọdụ ahụ ka ọ dị ugbua.
Ihe dịka ogbunigwe a na-enyo enyo na e ji droonu tụọ emebiela ihe n'Imo steeti

N'isi ụtụtụ ụbọchị Sonde 12 Jenụwarị 2025 ka ndị obodo Umuneke Ihitte Mbieri dị n'Okpuru ọchichi Mbaitoli n'Imo steeti nụrụ ihe dara ụda dịka ogbunigwe, bụ nke bibiri ụlọ a rụrụ ọhụrụ n'obodo ahụ.
Ndị obodo ahụ na-ekwu na mkpamkpa ahụ kpara n'ihe dịka elekere mbụ nke isi ụtụtụ oge ha hụchara ihe na-efegharị n'elu dịka droonu.
Ha kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe ahụ n'ihe dịka nkeji iri ka ha nụchara mkpọtụ droonu na-efegharị n'elu n'obodo ha.

Ebe foto si, Davidson Nwosu
Ndị obodo ahụ sịrị na ha na-enyo enyo na ọ bụ droonu ahụ ka e ji tụọ ogbunigwe n'ụlọ ahụ ma bibie ya.
Dịka ha siri kwuo, onyeisioche Gọọmenti Okpuruọchịchị Mbaitoli bụ Ifunanya Nwanegwo nakwa onyeisi ndị uweojii na Mbieri bụ Wet Ben abịala hụta ebe mkpamkpa ahụ kpara.
Mana etu ọnọdụ si dị ugbua, BBC Igbo ka na-achọ ozi si n'ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti banyere ihe a mere.

Ebe foto si, Davidson Nwosu










