"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa"

Ebe foto si, Tawana Musvaburi
Ịmụ nwa mgbe ọ gbara afọ 21 abụghị ebumnobi nwada Tawana>
O kwuru n'okwu ya "anọ m na-ebi ndụ aghara", na-agba oringo na-ekpori ndụ ya na ndị enyi ya.
Ruo mgbe ọ hụtara onwe ya n'ụlọọgwụ dịka ọ dachara n'ala na-amaghị onwe ya.
Ọ maghị ihe mere. Mana a gwara ya na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ na-abịa abịa.
"Egwu malitere ịtụ m," ka Tawana gwara ngalaba 'BBC Reliable Sauce podcast'.
Akụkọ ahụ mere ka ọ ghara ịma ihe na-eme.
"Maka na mmadụ na-agwa gị, na i nwere izuụka anọ ịkpakọta ndụ gị ọnụ."
Ndị dọkịta gwara Tawana ka o mee nyocha ịdị ime tupu o mee nyocha ime ahụ a kpọọ 'MRI scan' oge a nabatara ya n'ụlọọgwụ.
O kweghi anabata ozi na ọ dị ime ma kpọọ ya ihe egwuregwu - O tinyere ọgwụ na-egbochi ịtụrụ ime n'aka ya ma o nweghi ihe akaebe na-egosi na ọ dị ime.
Mgbe nyocha ahụ pụtara ihe ma na-egosi na o dịghị ime, o mere ka o doo Tawana anya na nkwenye ya bụ eziokwu.
Mana otu onye nọọsụ gwara dọkịta ka o kwee ka Tawana mee nyocha a kpọrọ 'ultrasound', na o kwenyesiri ike na o nwereike ịdị ime.
Nna nwa Rivers bụ Emmanuel kwuru na o kweteghi na ọ bụ eziokwu mgbe Tawana gwara na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ.
"O doghi anya n'ụzọ ọbụla," ka o kwuru. "Ọ dị ka ọ bụ ihe ịrịbaama."

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ịdị ime na-enweghi ihe ngosi dịka ịgbọ agbọ maọbụ afọ itopụta ka a na-akpọ 'cryptic pregnancy'.
Ọ na-aghị adịcha ire, mana Tawana sị na dọkịta gwara na "ọ na-emekaarị n'etiti ndị isi ojii"
"[Agwara m] na ọ bụ site n'etu ọkpụkpụ ukwu anyị siri dị, nwa ahụ anaghị etopụta n'afọ, ọ na-etoba n'ime afọ, nke na-emekaarị ka ike nwata ahụ nọrọ n'aka afọ nwaanyị anyị," ka o kwuru.
"Mgbe o ruru oge m ga-eji amụ nwa, ihe kachasị enye m echiche bụ ma nwa ahụ ọ ga-atụgharị isi."
Dịka ozi banyere 'cryptic pregnancy' adịchabeghi, Alison Leary bụ ọkammụta ahụike na mahadum South Bank nke Lọndọn kwuru na ozi dị banyere ụdịrị ime a na-ekwu na e nwere ndịiche dị n'ụmụnwaanyị site n'agbụrụ onye ahụ si.
"Enweela ihe ọmụmụ ndị gosiri na ụmụnwaanyị ọkachasị ndị isi ojii na-ahụtakaarị nsogbu ndị dị aṅal n'okwu ịdị ime nakwa ịmụ nwa," ka ọ gwara BBC Newsbeat.
Ọ na-eche na e kwesịrị imekwu nyocha banyere ime a na-ezo ezo kpọrọ 'cryptic pregnancy'.
"Ọ bụ ya mere o jiri dị mkpa na-agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta dị obere maka na ọ bụrụ na ịgaghị n'ezi ụlọọgwụ maọbụ nata ezi ọgwụgwọ, i nwere ike izute ihe ọjọọ."
Dịka izuụka anọ na ụbọchị anọ a gwachara Tawana na ọ ga-amụ nwa, ọ mụrụ nwa ya bụ River ka o mechara emume 'baby shower'.
O kwuru na o nwere obi ịda mba ka ọ mụchara nwa ahụ, ma gaa n'ọba ozi soshal midia TikTok inwe ndụmọdụ etu e si abụ nne nwa n'otu ntabi anya.
Mana o kwuru na ọ hụghị onye ọbụla, e wepụ otu nwaanyị na mba Amerịka gabigara ụdịrị ihe a.
"Agabigara m ọnọdụ ịda mba maka na ọ dị ka o nweghi onye na-enye m ndụmọdụ.
"O nweghi onye na-ekwu okwu maka nke a. Ihe ọ bụ nakwa etu o si adị? Ahụrụ m otu ihe onyonyo ebe otu nwaanyị si mba Amerịka na-ekwu maka ya.
"Naanị ya bụ otu onye nyere m ndụmọdụ."
Tawana kpebiri ịkọ ya na soshal midia, n'ihe onyonyo o kesara nke a hụrụla n'anya ihe ruru ugboro 400,000.
Ọ malitela ịgbasa ozi na podcast, ebe ọ na-agwa ndị nne ọzọ okwu.
Tawana kwuru na ọ na-akọ akụkọ n'olileanya na ọ ga-enyere ndị nne ọhụrụ ndị hụtara onwe ya n'ọnọdụ a aka.
O kwuru na o nwere ihụ ọma site n'inwete enyemaka ego site n'aka nne ya, mana ọ maara na ndị ọzo nwere ike ha agaghị enweta ụdịrị ohere a.
N'uche ya, ọ chọrọ ka e hiwe ngalaba ebe a na-enwere ndị mmadụ aka.
"Enyemaka adịghị, ya mere ọ bụrụ gị ka o mere, kedụ ka ihe ị ga-eme?"
Gịnị bụ ime nzuzo a a kpọrọ 'cryptic pregnancy'?
- Okwu a na-ekwu mgbe nwaanyị na-amaghị na ọ dị ime - ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ha amaghị ruo mgbe ime ọmụmụ mewere ha.
- Otu n'ime ụmụ 2,5000 a mụrụ na-abụ site n'ime nzuzo a bụ "cryptic birth"
- Nke a bụ ụmụaka 3000 a mụrụ na mba Briten n'otu afọ
- Ọtụtụ ha na-abụkaarị n'oge ndọgasị ahụ mgbe nwaanyị na-anaghị ahụta ihe njirimara na-egosi na ọ dị ime.
- Ụmụnwaanyị ndị nsọ ha na-anaghị agba mgbe o kwesịrị maọbụ na-anaghị agba chaachaa na-ahụ njirimara ndị ọzọ na-egosi ịdị ime.
Ebe o si: Helen Cheyne, ọkammụta na ngalaba ndị na-amụ nwa (midwifery) na mahadum Stirling








