"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa"

Obere nwa River, ka nne ya bụ Tawana kuu ya n'aka.

Ebe foto si, Tawana Musvaburi

Nkọwa foto, Tawana amaghị na ọ dị ime nwa ya Rivers bụ onye dị otu afọ ugbua

Ịmụ nwa mgbe ọ gbara afọ 21 abụghị ebumnobi nwada Tawana>

O kwuru n'okwu ya "anọ m na-ebi ndụ aghara", na-agba oringo na-ekpori ndụ ya na ndị enyi ya.

Ruo mgbe ọ hụtara onwe ya n'ụlọọgwụ dịka ọ dachara n'ala na-amaghị onwe ya.

Ọ maghị ihe mere. Mana a gwara ya na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ na-abịa abịa.

"Egwu malitere ịtụ m," ka Tawana gwara ngalaba 'BBC Reliable Sauce podcast'.

Akụkọ ahụ mere ka ọ ghara ịma ihe na-eme.

"Maka na mmadụ na-agwa gị, na i nwere izuụka anọ ịkpakọta ndụ gị ọnụ."

Ndị dọkịta gwara Tawana ka o mee nyocha ịdị ime tupu o mee nyocha ime ahụ a kpọọ 'MRI scan' oge a nabatara ya n'ụlọọgwụ.

O kweghi anabata ozi na ọ dị ime ma kpọọ ya ihe egwuregwu - O tinyere ọgwụ na-egbochi ịtụrụ ime n'aka ya ma o nweghi ihe akaebe na-egosi na ọ dị ime.

Mgbe nyocha ahụ pụtara ihe ma na-egosi na o dịghị ime, o mere ka o doo Tawana anya na nkwenye ya bụ eziokwu.

Mana otu onye nọọsụ gwara dọkịta ka o kwee ka Tawana mee nyocha a kpọrọ 'ultrasound', na o kwenyesiri ike na o nwereike ịdị ime.

Nna nwa Rivers bụ Emmanuel kwuru na o kweteghi na ọ bụ eziokwu mgbe Tawana gwara na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ.

"O doghi anya n'ụzọ ọbụla," ka o kwuru. "Ọ dị ka ọ bụ ihe ịrịbaama."

Tawana and Emmanuel, with their baby, River after speaking to the BBC's Reliable Sauce podcast
Nkọwa foto, Tawana and Emmanuel, with their baby, River after speaking to the BBC's Reliable Sauce podcast
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ịdị ime na-enweghi ihe ngosi dịka ịgbọ agbọ maọbụ afọ itopụta ka a na-akpọ 'cryptic pregnancy'.

Ọ na-aghị adịcha ire, mana Tawana sị na dọkịta gwara na "ọ na-emekaarị n'etiti ndị isi ojii"

"[Agwara m] na ọ bụ site n'etu ọkpụkpụ ukwu anyị siri dị, nwa ahụ anaghị etopụta n'afọ, ọ na-etoba n'ime afọ, nke na-emekaarị ka ike nwata ahụ nọrọ n'aka afọ nwaanyị anyị," ka o kwuru.

"Mgbe o ruru oge m ga-eji amụ nwa, ihe kachasị enye m echiche bụ ma nwa ahụ ọ ga-atụgharị isi."

Dịka ozi banyere 'cryptic pregnancy' adịchabeghi, Alison Leary bụ ọkammụta ahụike na mahadum South Bank nke Lọndọn kwuru na ozi dị banyere ụdịrị ime a na-ekwu na e nwere ndịiche dị n'ụmụnwaanyị site n'agbụrụ onye ahụ si.

"Enweela ihe ọmụmụ ndị gosiri na ụmụnwaanyị ọkachasị ndị isi ojii na-ahụtakaarị nsogbu ndị dị aṅal n'okwu ịdị ime nakwa ịmụ nwa," ka ọ gwara BBC Newsbeat.

Ọ na-eche na e kwesịrị imekwu nyocha banyere ime a na-ezo ezo kpọrọ 'cryptic pregnancy'.

"Ọ bụ ya mere o jiri dị mkpa na-agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta dị obere maka na ọ bụrụ na ịgaghị n'ezi ụlọọgwụ maọbụ nata ezi ọgwụgwọ, i nwere ike izute ihe ọjọọ."

Dịka izuụka anọ na ụbọchị anọ a gwachara Tawana na ọ ga-amụ nwa, ọ mụrụ nwa ya bụ River ka o mechara emume 'baby shower'.

O kwuru na o nwere obi ịda mba ka ọ mụchara nwa ahụ, ma gaa n'ọba ozi soshal midia TikTok inwe ndụmọdụ etu e si abụ nne nwa n'otu ntabi anya.

Mana o kwuru na ọ hụghị onye ọbụla, e wepụ otu nwaanyị na mba Amerịka gabigara ụdịrị ihe a.

"Agabigara m ọnọdụ ịda mba maka na ọ dị ka o nweghi onye na-enye m ndụmọdụ.

"O nweghi onye na-ekwu okwu maka nke a. Ihe ọ bụ nakwa etu o si adị? Ahụrụ m otu ihe onyonyo ebe otu nwaanyị si mba Amerịka na-ekwu maka ya.

"Naanị ya bụ otu onye nyere m ndụmọdụ."

Tawana kpebiri ịkọ ya na soshal midia, n'ihe onyonyo o kesara nke a hụrụla n'anya ihe ruru ugboro 400,000.

Ọ malitela ịgbasa ozi na podcast, ebe ọ na-agwa ndị nne ọzọ okwu.

Tawana kwuru na ọ na-akọ akụkọ n'olileanya na ọ ga-enyere ndị nne ọhụrụ ndị hụtara onwe ya n'ọnọdụ a aka.

O kwuru na o nwere ihụ ọma site n'inwete enyemaka ego site n'aka nne ya, mana ọ maara na ndị ọzo nwere ike ha agaghị enweta ụdịrị ohere a.

N'uche ya, ọ chọrọ ka e hiwe ngalaba ebe a na-enwere ndị mmadụ aka.

"Enyemaka adịghị, ya mere ọ bụrụ gị ka o mere, kedụ ka ihe ị ga-eme?"

Gịnị bụ ime nzuzo a a kpọrọ 'cryptic pregnancy'?

  • Okwu a na-ekwu mgbe nwaanyị na-amaghị na ọ dị ime - ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ha amaghị ruo mgbe ime ọmụmụ mewere ha.
  • Otu n'ime ụmụ 2,5000 a mụrụ na-abụ site n'ime nzuzo a bụ "cryptic birth"
  • Nke a bụ ụmụaka 3000 a mụrụ na mba Briten n'otu afọ
  • Ọtụtụ ha na-abụkaarị n'oge ndọgasị ahụ mgbe nwaanyị na-anaghị ahụta ihe njirimara na-egosi na ọ dị ime.
  • Ụmụnwaanyị ndị nsọ ha na-anaghị agba mgbe o kwesịrị maọbụ na-anaghị agba chaachaa na-ahụ njirimara ndị ọzọ na-egosi ịdị ime.

Ebe o si: Helen Cheyne, ọkammụta na ngalaba ndị na-amụ nwa (midwifery) na mahadum Stirling