Somto Uwani: Etu m si bụrụ nwata a ma ama

- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Somto Uwani nke ezigbo aha ya bụ Somtochukwu Samuel bụ obere nwata a ma ama na-eme ihe nkiri.
Ọ gwara BBC Igbo okwu, wee kọwa etu o siri malite njem ya dịka onye na-eme ihe ọchị.
Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, nwata ahụ a na-etu Somtoo Uwani 001 kwuru na ya malitere ime ihe nkiri oge ọ nọ n'obodo ya bụ Ụwanị.
Dịka nwata ahụ a na-etukwa The Contagious Boy siri kwuo, ọ bụ ya na nwanne ya nwoke buru ụzọ mee ihe nkiri tupu a kpọgaa ya Ọnịcha dị n'Anambra Steeti.
Somtochukwu kwuru na ya mekwara ihe nkiri oge ọ nọ n'Ọnịcha tupu ọ laghachi Enugwu, ma gakwaa n'ihu na-eme ihe nkiri ebe ahụ.

Ebe foto si, Somtouwani/Instagram
Onye nlekọta Somtochukwu bụ Chigbo Abuchi kwuru na ya na-agbalị ike ya niile iji hụ na o nyere nwata ahụ ọnọdụ kachasị mma.
Abuchi kwuru na ha amalitebeghị inweta nnukwu ego site n'ihe nkiri, kama ya na-etinye ego niile ha na-enweta ugbua n'agụmaakwụkwọ Somtochukwu iji hụ na o mepere anya nke ọma.

Ebe foto si, SomtoUwani/Instagram



